Ekliziastis
3 E nwere oge a kara aka+ maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge: 2 oge ịmụ nwa+ na oge ịnwụ anwụ;+ oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ;+ 3 oge igbu egbu+ na oge ịgwọ agwọ;+ oge ịkwatu akwatu na oge iwu ihe;+ 4 oge ịkwa ákwá+ na oge ịchị ọchị;+ oge ịkwa ákwá arịrị+ na oge ịwụli elu;+ 5 oge ịtụfu nkume+ na oge ịtụtụkọta nkume;+ oge ịmakụ mmadụ+ na oge a na-agaghị amakụ mmadụ;+ 6 oge ịchọ ihe+ na oge iwere na ihe efuola; oge idebe ihe na oge ịtụfu ihe;+ 7 oge ịdọwa ihe+ na oge ịdụkọta ihe;+ oge ịgbachi nkịtị+ na oge ikwu okwu;+ 8 oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị;+ oge agha+ na oge udo.+ 9 Olee uru onye na-arụ ọrụ na-erite n’ihe ọ na-adọgburu onwe ya n’ọrụ?+
10 Ahụwo m ọrụ Chineke nyeworo ụmụ mmadụ nke ha ga na-arụ.+ 11 O mewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya.+ O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha,+ ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.+ 12 Amatawo m na ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha;+ 13 nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile.+ Ọ bụ onyinye Chineke.+
14 Amatawo m na ihe ọ bụla ezi Chineke mere ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ọ dịghị ihe a ga-atụkwasị ya, ọ dịghịkwa ihe a ga-ewepụ ya;+ kama ezi Chineke emewo ya,+ ka ndị mmadụ wee tụọ egwu ya.+
15 Ihe dị ugbu a dịbu adị, ihe gaje ịdị adịworị adị;+ ezi Chineke+ na-achọkwa ihe ahụ a na-achụ ọsọ.+
16 Ahụwokwa m n’okpuru anyanwụ ka ajọ omume dị n’ebe ikpe ziri ezi kwesịrị ịdị, hụkwa ka ajọ omume dị n’ebe ezi omume kwesịrị ịdị.+ 17 Mụ onwe m ekwuwo n’obi m,+ sị: “Ezi Chineke ga-ekpe ma onye ezi omume ma onye ajọ omume ikpe,+ n’ihi na ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.”+
18 Mụ onwe m ekwuwo n’obi m banyere ụmụ mmadụ, na ezi Chineke gaje ịhọ ha ahọ, ka ha wee hụ na ha onwe ha bụ anụmanụ.+ 19 N’ihi na ihe ndabara na-adabara ụmụ mmadụ, ihe ndabara na-adabakwara anụmanụ, otu ihe ndabara ahụ na-adabara ha.+ Dị ka anụmanụ na-anwụ, otú ahụ ka mmadụ na-anwụ;+ ha niile nwekwara naanị otu mmụọ ahụ,+ nke mere na ọ dịghị ihe mmadụ ji kara anụmanụ, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-aga n’otu ebe.+ Ọ bụ n’ájá ka ha niile si,+ ọ bụkwa n’ájá ka ha niile na-alaghachi.+ 21 Ònye maara ma mmụọ ụmụ mmadụ ọ̀ na-agbago agbago; ònyekwa maara ma mmụọ anụmanụ ọ̀ na-agbada agbada?+ 22 Ahụwokwa m na ọ dịghị ihe dị mma karịa mmadụ inwe aṅụrị n’ọrụ ya,+ n’ihi na ọ bụ ya bụ ihe o ketara; n’ihi na ònye ga-akpọta ya ka ọ hụ ihe gaje ime mgbe ọ na-anọkwaghị?+