24 N’ihi na ihe niile dị n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis+ dị n’okpuru ya, malite na Tifsa ruo Geza,+ ọbụna ndị eze niile nọ n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis;+ o nwekwara udo+ n’ógbè ya niile, gbaa gburugburu.
4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+