Ekliziastis
4 Mụ onwe m tụgharịrị uche ọzọ wee hụ mmegbu+ niile a na-emegbu mmadụ n’okpuru anyanwụ, ma, lee! anya mmiri nke ndị a na-emegbu emegbu,+ ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere;+ ọ bụkwa ndị na-emegbu ha ka ike dị n’aka, nke mere na ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere. 2 M wee kwuo na ọ dịịrị ndị nwụrụ anwụ mma, bụ́ ndị nwụrụla anwụ, karịa ndị nọ ndụ, bụ́ ndị ka dị ndụ.+ 3 Onye ka ha abụọ mma bụ onye a na-amụbeghị amụ,+ onye na-ahụghị ọrụ ahụhụ a na-arụ n’okpuru anyanwụ.+
4 Mụ onwe m ahụwokwa ọrụ niile ndị mmadụ na-arụsi ike, na nkà niile ha ji arụ ọrụ,+ na ọ bụ ịmarịta aka;+ nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.
5 Onye nzuzu na-akụkụkọta aka ya,+ na-erikwa anụ onwe ya.+
6 Obere ezumike* dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike* gabiga ókè na ịchụso ifufe.+
7 Mụ onwe m tụgharịrị uche ọzọ wee hụ ihe efu dị n’okpuru anyanwụ: 8 Ọ dị otu onye naanị ya nọ, nke na-enweghị onye ibe;+ o nweghịkwa nwa ma ọ bụ nwanne,+ ma ọrụ niile ọ na-arụsi ike enweghị njedebe. Akụ̀ adịghịkwa eju anya ya afọ,+ ọ na-ajụ, sị: “Ọ̀ bụ n’ihi onye ka m na-arụsi ọrụ ike wee na-anapụ mkpụrụ obi m ihe ọma?”+ Nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ọrụ ahụhụ.+
9 Abụọ dị mma karịa otu,+ n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha.+ 10 N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.+ Ma olee otú ọ ga-adịrị otu onye nke ọ bụ naanị ya, bụ́ onye dara mgbe a na-enweghị onye ọzọ ga-ekulite ya?+
11 Ọ bụrụkwa na mmadụ abụọ edinakọọ, ahụ́ ga-ekporo ha ọkụ; ma olee otú ahụ́ ga-esi kporo naanị otu onye ọkụ?+ 12 Ọ bụrụkwa na mmadụ pụrụ imeri onye ọ bụ naanị ya, mmadụ abụọ gbakọrọ aka pụrụ iguzogide ya.+ Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.
13 Nwata nke maara ihe ma bụrụ ogbenye+ dị mma karịa eze meworo agadi nke dị iberiibe,+ bụ́ onye na-amaghị na ịdọ aka ná ntị ka dị ya mkpa.+ 14 N’ihi na ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ ka o si pụta wee ghọọ eze,+ ọ bụ ezie na a mụrụ ya n’alaeze ahụ dị ka onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+ 15 Ahụwo m ndị niile dị ndụ, bụ́ ndị na-ejegharị n’okpuru anyanwụ, otú ihe si adịrị nwata ahụ, bụ́ onye ga-anọchi onye nke ọzọ.+ 16 A pụghị ịgụta ndị ya niile ọnụ, bụ́ ndị niile ọ na-achị;+ mgbe e mesịrị, ndị mmadụ agaghị aṅụrị ọṅụ n’ihi ya,+ n’ihi na nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+