4“Nụrụnụ okwu a, unu nne ehi Beshan,+ ndị nọ n’ugwu Sameria,+ ndị na-erigbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,+ ndị na-echi ndị ogbenye ọnụ n’ala, ndị na-asị ndị nna ha ukwu, ‘Wetanụ, ka anyị ṅụọ!’
2 Agụụ inweta ubi agụwo ha, ha anarawokwa ha n’ike;+ agụụ inweta ụlọ agụwo ha, ha ewegharawokwa ha; ha erigbuwo nwoke na ezinụlọ ya,+ rigbuo nwoke ma weghara ihe nketa ya.+