10 Meekwanụ ka ndị ikom abụọ+ ndị na-abaghị n’ihe+ nọdụ n’ihu ya, ka ha gbagidekwa ya akaebe,+ sị: ‘Ị bụrụ Chineke na eze ọnụ!’+ Kpọpụtanụ ya, jiri nkume tụgbuo ya.”+
3 Aka ha dị n’ihe ọjọọ, imeta ya nke ọma;+ onyeisi na-ekwu ka e nye ya ihe, onye na-ekpe ikpe na-ekpekwa ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,+ onye ukwu na-ekwukwa ihe si ya n’obi, uche nke aka ya;+ ha na-agbakọ aka eme ya.