19 Gwa ya, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ì gbuwo ọchụ,+ wegharakwa?”’+ Gwakwa ya, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “N’ebe ahụ+ nkịta rachara ọbara Nebọt ka nkịta ga-aracha ọbara gị, ọbụna nke gị.”’”+
15 Onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ajọ omume bụ onye ezi omume+ nakwa onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ezi omume bụ onye ajọ omume+—ọbụna ha abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.+