Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka
3 N’ihi ya, mgbe anyị na-enweghịzi ike idi ya, anyị chere na ọ ka mma ka naanị anyị nọrọwa n’Atens.+ 2 Anyị ziteere unu Timoti,+ nwanna anyị na onye ozi Chineke* nke na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, ka o mee ka unu kwụsie ike* ma kasie unu obi ka okwukwe unu sie ike, 3 ka a ghara inwe onye mkpagbu ndị a ga-eme ka ọ maa jijiji. N’ihi na unu ma na anyị ga-atarịrị ụdị ahụhụ a.+ 4 N’ihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị na-adị agwa unu tupu ya ebido ime na a ga-akpagbu anyị. Unu makwa na ihe anyị kwuru emeela.+ 5 Ọ bụ ya mere na mgbe m na-enweghịzi ike idi ya, m zitere ya ka m wee mata ma ùnu ka tụkwasịkwara Chineke obi,+ a dịghị ama ama ya abụrụ na Onye Ọnwụnwa ahụ+ anwaala unu, mbọ niile anyị gbara abụrụzie n’efu.
6 Ma Timoti ka si n’ebe unu nọ bịakwute anyị+ ugbu a ma kọọrọ anyị akụkọ ọma banyere otú unu si tụkwasị Chineke obi na otú unu si hụ ndị ọzọ n’anya. O kwuru na unu na-echeta anyị mgbe niile nakwa na ọ na-agụsi unu agụụ ike ịhụ anyị otú ọ na-agụkwa anyị ịhụ unu. 7 Ụmụnna anyị, ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị nsogbu* niile na mkpagbu niile na-abịara anyị, obi eruola anyị ala maka na unu na-egosi na unu tụkwasịrị Chineke obi.+ 8 N’ihi na obi na-adị anyị ụtọ* ma ọ bụrụhaala na unu anọgidesie ike na-eme ka unu na Onyenwe anyị dị n’otu. 9 Oleedị otú anyị ga-esi kelee Chineke n’ihi ihe unu na-eme nakwa maka nnukwu ọṅụ anyị na-enwe n’ihu Chineke n’ihi unu? 10 Anyị ji obi anyị niile arịọsi arịrịọ ike ehihie na abalị ka anyị hụ unu ihu na ihu* nakwa ka anyị nyere unu aka mee ka okwukwe unu sikwuo ike.+
11 Ka Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, nakwa Onyenwe anyị Jizọs mee ka anyị hụ otú anyị ga-esi abịakwute unu. 12 Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya ma na-ahụkwu mmadụ niile n’anya,+ otú anyị na-ahụkwu unu n’anya, 13 ka o wee mee ka obi sie unu ike, meekwa ka unu bụrụ ndị a na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na ndị dị nsọ n’ihu Chineke anyị,+ bụ́ Nna anyị, n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs,+ ya na ndị nsọ ya niile.