Ekliziastis
8 Ònye ka a ga-eji tụnyere onye ma ihe? Ònye ma otú e si edozi nsogbu? Amamihe na-eme ka mmadụ na-agbasapụ ihu, ọ na-emekwa ka onye ahụ ghara ịna-agbarụ ihu.
2 M sịrị: “Debe iwu eze+ n’ihi iyi ị ṅụrụ n’ihu Chineke.+ 3 Emela ọsọ ọsọ ka i si n’ihu ya pụọ.+ Etinyela aka n’ihe ọjọọ;+ n’ihi na o nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị ya, 4 maka na a naghị agbagha okwu eze agbagha.+ Ònye nwere ike ịsị ya: ‘Gịnị ka ị na-eme?’”
5 E nweghị ihe ọjọọ ga-eme onye na-edebe iwu.+ Onye ma ihe ga-amakwa oge ọ ga-eji eme ihe ọ bụla nakwa otú ọ ga-esi eme ya.+ 6 Ihe ọ bụla nwere oge nakwa otú e si eme ya,+ n’ihi na nsogbu ndị na-abịara ndị mmadụ karịrị akarị. 7 Ebe ọ bụ na e nweghị onye ma ihe ga-eme, ònye nwere ike ikwu otú ihe ga-esi eme?
8 Otú ahụ a na-enweghị mmadụ ume ndụ* dị n’aka, ka a na-enweghị mmadụ ụbọchị ọnwụ dị n’aka.+ Otú ahụ a na-enweghị onye agha a na-ekwe ka ọ laa n’oge agha, ka ajọ omume na-anaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ gbanahụ ihe ha metara.
9 M hụrụ ihe a niile, m wee jiri obi m niile chebara ọrụ niile a rụrụla n’ụwa* echiche, n’oge mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.+ 10 M wee hụ ka a na-eli ndị ajọ omume, ndị na-abanyebu n’ebe dị nsọ ma na-apụta. Ma, e chefuru ha ọsọ ọsọ n’obodo ebe ha nọ na-eme ajọ omume.+ Ihe a bụkwa ihe efu.
11 Obi na-esi ndị mmadụ ike ime ihe ọjọọ+ maka na a naghị eme ndị mere ihe ọjọọ ihe e kwesịrị ime ha ozugbo.+ 12 Ọ bụ eziokwu na onye mmehie nwere ike ime ihe ọjọọ otu narị ugboro, dịteekwa ndụ aka, ma ama m na ihe ga-agaziri ndị na-atụ egwu ezi Chineke maka na ha na-atụ egwu ya.+ 13 Ma ihe agaghị agaziri onye ajọ omume,+ ọ gaghịkwa emeli ka ụbọchị ndụ ya, nke na-agafe ngwa ngwa ka onyinyo, dị ogologo,+ maka na ọ naghị atụ egwu Chineke.
14 E nwere ihe efu* na-eme n’ụwa: E nwere ndị ezi omume a na-emeso ka à ga-asị na ha mere ihe ọjọọ,+ e nwekwara ndị ajọ omume a na-emeso ka à ga-asị na ha mere ihe dị mma.+ Ana m asị na ihe a bụkwa ihe efu.
15 N’ihi ya, ana m asị na inwe obi ụtọ dị mma,+ n’ihi na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme n’ụwa karịa iri ihe na ịṅụ mmanya na inwe obi ụtọ. O kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ mgbe ọ na-arụsi ọrụ ike n’oge niile+ ezi Chineke mere ka ọ dịrị ndụ n’ụwa.*
16 M gbalịrị ka m mara ihe nakwa ka m hụ ihe niile a na-eme* n’ụwa.+ Anaghịdị m ehi ụra* ma n’ehihie ma n’abalị. 17 M wee chebara ọrụ niile ezi Chineke na-arụ echiche ma chọpụta na ndị mmadụ enweghị ike ịghọta ihe na-eme n’ụwa.*+ Otú ọ sọkwara ha gbalịa, ha enweghị ike ịghọta ya. Ọ bụrụgodị na ha na-asị na ha ma ihe, ha enweghị ike ịghọta ya n’eziokwu.+