Job
38 Jehova wee si n’oké ifufe gwa Job,+ sị:
2 “Ònye bụ onye a nke na-agba otú m si eme ihe ụkwụ
Ma na-ekwu okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma?+
3 Biko, jikere ka dimkpa.
M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.
4 Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?+
Gwa m, ma ọ bụrụ na i chere na ị na-aghọta ihe.
5 Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị ma?
Ma ọ bụ, ònye ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ya?
6 Na gịnị ka e gwunyere ntọala ya,
Ma ọ bụ, ònye dọnyere nkume ji ya,+
8 Ònye mechibidoro oké osimiri ụzọ+
Mgbe o si n’ebe o si asọpụta* sọpụtasiwe ike,
9 Mgbe m yiwere ya ígwé ojii ka uwe,
Jirikwa oké ọchịchịrị kee ya ka ákwà,
10 Mgbe m kpaara ya ókè,
Tinyekwa ihe e ji atụchi ya nakwa ibo ụzọ ya,+
11 M wee sị, ‘Ebe a ka ị ga-erute. Ị gaghị agafe ya.
Ebe a ka ebili mmiri gị nke na-amali elu ga-ejedebe’?+
12 È nweela mgbe i nyere anyanwụ ụtụtụ iwu ka ọ waa
Ma ọ bụ mee ka chi mara ebe ọ ga-abọ,+
13 Ka ọ bọọ n’ebe niile ụwa sọtụrụ
Nakwa ka ọ yọgharịa ụwa, yọpụ ndị ajọ omume?+
14 Ọ na-agbanwe otú ụwa dị otú ahụ ihu ụrọ si agbanwe ma e bie ihe e ji aka ihe akara na ya,
Ihe ndị dị n’ụwa apụtazie ìhè otú ihe e sere n’ákwà si apụta ìhè.
16 Ị̀ gatụla n’ebe oké osimiri si asọpụta
Ma ọ bụ gagharịa n’ime mmiri miri emi ka ị chọpụta ihe ndị dị na ya?+
Ka ị̀ hụtụla ọnụ ụzọ oké ọchịchịrị?+
18 Ị̀ ghọtala otú ụwa si buo ibu?+
Gwa m, ma ọ bụrụ na ị ma ihe a niile.
21 Ị̀ ma ihe a maka na a mụọla gị mgbe ahụ
Nakwa maka na ị dịteela ndụ aka?
22 Ị̀ banyetụla n’ebe snoo si apụta?+
Ka ị̀ hụtụla ebe akụ́ mmiri ígwé si apụta,+
23 Bụ́ ihe ndị m dowere maka oge ahụhụ,
Maka ụbọchị ọgụ na agha?+
Oleekwa ebe ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si eku n’ụwa?+
25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,
Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+
26 Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,
N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+
27 Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,
Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+
29 Ònye na-eme ka mmiri kpụkọọ akpụkọọ?
Ònyekwa na-amụpụta mkpụrụ mmiri ígwé?+
35 Ì nwere ike ime ka àmụ̀mà gbuo?
Hà ga-abịa sị gị, ‘Lee anyị’?
37 Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ?
Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+
38 Ònye na-eme ka uzuzu kpụkọọ ọnụ,
Ájá ụrọ anyakọtakwa ọnụ?
39 Ì nwere ike igbutere ọdụm anụ ọ ga-eri
Ma ọ bụ nyejuo ụmụ ọdụm agụụ ji afọ+
40 Mgbe ha makpu n’ebe ha na-ezo
Ma ọ bụ mgbe ha makpu n’ebe ha bi na-eche anụ?