Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Ọma 64
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Ọma

      • Chineke ga-echebe ndị ya

        • ‘Chineke ga-agba ndị iro akụ́’ (7)

Abụ Ọma 64:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 55:1

Abụ Ọma 64:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 56:6; 109:2

Abụ Ọma 64:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Ha na-agba ibe ha ume ka ha mee ihe ọjọọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 10:4, 11; 59:7

Abụ Ọma 64:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 140:5

Abụ Ọma 64:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 7:11, 12

Abụ Ọma 64:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 12:13; 18:7

Abụ Ọma 64:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 107:40, 43

Abụ Ọma 64:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ga-anya isi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 58:10; 68:2, 3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    12/2018, p. 29-31

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọma 64:1Ọm 55:1
Ọma 64:2Ọm 56:6; 109:2
Ọma 64:5Ọm 10:4, 11; 59:7
Ọma 64:6Ọm 140:5
Ọma 64:7Ọm 7:11, 12
Ọma 64:8Ilu 12:13; 18:7
Ọma 64:9Ọm 107:40, 43
Ọma 64:10Ọm 58:10; 68:2, 3
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Abụ Ọma 64:1-10

Abụ Ọma

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.

64 Chineke, biko, nụrụ olu m mgbe m na-arịọ gị arịrịọ.+

Chebe ndụ m ka m ghara ịtụ onye iro ụjọ.

 2 Mee ka nkata ndị ọjọọ na-akpa na nzuzo ghara ikpudo m+

Nakwa ka ìgwè ndị ajọ omume ghara ịkpara m aka.

 3 Ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka mma agha.

Ha na-adị njikere ikwu okwu ọjọọ ka à ga-asị na ha chọrọ ịgbapụ akụ́,

 4 Ka ha nọrọ n’ebe ha zoro gbaa ya onye aka ya dị ọcha.

Ha na-agba ya onye ahụ na mberede n’atụghị egwu.

 5 Ha anaghị akwụsị iche echiche ọjọọ.*

Ha na-akpa otú ha ga-esi sie ọnyà.

Ha na-asị: “Ònyekwanụ ga-ahụ ọnyà ndị ahụ?”+

 6 Ha na-echepụta ụzọ ọhụrụ ndị ha ga-esi na-eme ihe ọjọọ.

Ha na-eji aghụghọ agba izu wee chepụta ihe ọjọọ ha ga-eme.+

Mmadụ enweghị ike ịghọta ihe onye nke ọ bụla na-eche n’obi ya.

7 Ma Chineke ga-agba ha akụ́.+

Akụ́ ga-emerụ ha ahụ́ na mberede.

 8 Ire ha ga-akpatara ha ọdachi.+

Ndị niile na-ele ha anya ga-efufe isi.

 9 Egwu ga-ejidezi mmadụ niile.

Ha ga-akọsa ihe Chineke mere,

Ha ga-aghọtakwa ọrụ dị iche iche ọ na-arụ.+

10 Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova, ọ ga-agbabakwa n’ime ya.+

Ndị niile obi ha dị ọcha ga-enwe obi ụtọ.*

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya