Maịka
Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma ihe ziri ezi?
2 Ma, unu kpọrọ ihe ọma asị,+ hụ ihe ọjọọ n’anya.+
Unu na-agba ndị m akpụkpọ, na-adọpụsịkwa anụ dị n’ọkpụkpụ ha.+
Na-agbakwa ha akpụkpọ,
Kụrie ọkpụkpụ ha, gwerisiekwa ha+
Dị ka ihe e ji ite* sie, dịkwa ka anụ dị n’ime ite e ji esi nri.
4 N’oge ahụ, ha ga-akpọku Jehova ka o nyere ha aka,
Ma ọ gaghị aza ha.
Ọ ga-agbakụta ha azụ n’oge ahụ+
N’ihi ihe ọjọọ ndị ha na-eme.+
5 Ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo.+ Ọ na-abụ ha nwee ihe ezé ha ga-ata,+ ha asị, ‘Udo dịrị unu.’+
Ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ihe n’ọnụ ha, ha alụso onye ahụ ọgụ.
N’ihi ya, Jehova gwara ndị amụma ahụ, sị:
6 ‘Chi ga-ejinahụ unu.+ Unu agaghị ahụ ọhụụ.+
Naanị ọchịchịrị ka unu ga-ahụ. Unu agaghịzi agba afa.
Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma,
Chi ga-ejibidokwa ha.+
Ha niile ga-ekpuchi ọnụ ha,*
N’ihi na Chineke azaghị ha ihe ọ bụla.’”
8 Ma mmụọ Jehova emeela ka ezigbo ike dịrị n’ime m.
Ọ na-enyekwara m aka ka m na-ekpe ikpe ziri ezi, na-akatakwa obi,
Iji gwa Jekọb isi o nupụrụ, gwakwa Izrel mmehie ya.
9 Biko nụrụnụ ihe a, ndị isi n’ezinụlọ Jekọb,
Na ndị na-achị ndị Izrel,+
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ndị na-agbagọkwa ihe ọ bụla kwụ ọtọ,+
10 Ndị na-eji igbu mmadụ* arụ Zayọn, na-ejikwa ajọ omume arụ+ Jeruselem.
11 Ndị ndú* ya anaghị ekpe ikpe n’anaraghị aka azụ.*+
Ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.+
Ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego.*+
Ma ha tụkwasịrị Jehova obi,* na-asị:
“Ọ̀ bụ na Jehova anọnyereghị anyị?+
Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+
12 N’ihi ya, a ga-eji maka unu
Kọọ Zayọn ka ubi.
Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+
Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.+