Abụ Ọma
33 Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+
Ọ dị mma ka ndị ezi omume na-eto ya.
2 Jirinụ ụbọ akwara na-ekele Jehova.
Jirinụ ụbọ nwere akwara iri bụkuo ya abụ otuto.
Kpọọnụ ụbọ akwara ka ndị bụ́ aka ochie, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
5 Ezi omume na ikpe ziri ezi na-amasị ya.+
Ịhụnanya* Jehova juru ebe niile n’ụwa.+
7 Ọ na-eme ka mmiri ndị dị n’oké osimiri kwụrụ otu ebe ka mgbidi.+
Ọ na-eme ka mmiri na-ekwo ekwo kworo gaa n’ebe ha na-asọkọta.
8 Ka ndị niile bi n’ụwa tụọ egwu Jehova.+
Ka ndị niile bi n’ụwa sọpụrụ ya.
9 N’ihi na o kwuru ka ihe dị, ihe adị.+
O nyere iwu ka ihe mee, ihe o nyere n’iwu emee.+
10 Jehova aghasaala atụmatụ* mba dị iche iche.+
Ọ kụghasịala ihe ndị si n’ebe dị iche iche bu n’obi ime.+
11 Ma ihe niile Jehova kpebiri ime* agaghị agbanwe ruo mgbe ebighị ebi.+
Ihe ndị o bu n’obi ime na-adịgide malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.
13 Jehova na-esi n’eluigwe eledata anya.
Ọ na-ahụ mmadụ niile.+
14 Ọ na-esi n’ebe o bi
Ele ndị bi n’ụwa anya.
15 Ọ bụ ya na-akpụ obi mmadụ niile.
Ọ na-enyocha ihe niile ha na-eme.+
16 E nweghị eze a ga-azọpụta maka na o nwere ọtụtụ ndị agha.+
Nnukwu ike dike nwere agaghị azọpụta ya.+
17 Ịtụkwasị obi n’ịnyịnya agaghị eme ka a zọpụta mmadụ.*+
Ọ bụghị nnukwu ike ya ga-eme ka mmadụ gbalaga.
18 Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+
Bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya,*
19 Ka o wee napụta ha* n’aka ọnwụ
Ma dowe ha ndụ mgbe ụnwụ dara.+
20 Anyị* na-atụ anya ka Jehova nyere anyị aka.
Ọ bụ ọta anyị na onye na-enyere anyị aka.+