Rut
3 Naomi, nne di ya, wee sị ya: “Nwa m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịchọtara gị di,* ka obi ruo gị ala,+ ka ihe gaziekwara gị? 2 Ọ̀ bụ na Boaz abụghị onye ikwu anyị?+ Ọ bụ ya ka gị na ụmụ agbọghọ ya rụkọrọ ọrụ. N’abalị taa, ọ ga-afụcha ọka bali n’ebe a na-azọcha ọka. 3 Gaa saa ahụ́, teekwa mmanụ ma yiri uwe gị* gbadaa n’ebe a na-azọcha ọka. Emela ka nwoke ahụ mata na ị nọ ebe ahụ ruo mgbe o richara nri, ṅụchaakwa mmanya. 4 Mgbe o dinaara ala, hụwa ebe o dina ama. Gaa kpughee ákwà o ji kpuchie ụkwụ ya, dinarakwa ala. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5 O wee sị ya: “M ga-eme ihe niile ị gwara m.” 6 O wee gaa n’ebe a na-azọcha ọka, meekwa ihe niile nne di ya gwara ya mee. 7 Boaz riri ihe, ṅụọkwa mmanya, obi adị ya ụtọ. Ya agaa dinara ala na nsọtụ ebe e kpokọtara ọka. Rut ejiri nwayọọ bịa kpughee ákwà o ji kpuchie ụkwụ ma dinara ala. 8 N’etiti abalị, nwoke ahụ malitere ịma jijiji, bilitetụ ma hụ otu nwaanyị dina n’akụkụ ụkwụ ya. 9 O wee sị: “Ònye ka ị bụ?” Ya asị: “Abụ m Rut ohu gị nwaanyị. Jiri uwe mwụda gị kpuchie ohu gị nwaanyị,* n’ihi na ọ bụ gị ga-agbara m.”+ 10 O wee sị: “Ka Jehova gọzie gị, nwa m. Ihe mbụ i mere+ gosiri na i nwere ịhụnanya,* ma nke a i mere ugbu a gosiri ya karịa n’ihi na ị chụrụghị ụmụ okorobịa gawa, ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya. 11 Nwa m, atụla egwu. M ga-emere gị ihe niile i kwuru,+ n’ihi na mmadụ niile nọ n’obodo a* ma na ị bụ ezigbo nwaanyị. 12 Ọ bụ eziokwu na m nwere ike ịgbara gị,+ ma e nwere onye ga-agbara gị bụ́ onye ikwu gị karịa m.+ 13 Nọrọ ebe a n’abalị a. Ọ bụrụ na ọ gbara gị n’ụtụtụ, ọ dị mma. Ya gbara gị.+ Ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịgbara gị, eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na m ga-agbara gị. Dinara ebe a ruo ụtụtụ.”
14 O wee dinara n’akụkụ ụkwụ ya ruo ụtụtụ ma bilie mgbe chi na-abọchabeghị otú mmadụ ga-enwe ike ịmata ibe ya. Boaz wee sị ya: “Emekwala ka a mara na nwaanyị bịara n’ebe a na-azọcha ọka.” 15 Ọ sịkwara ya: “Chịta ákwà mgbokwasị ahụ i gbokwasịrị, gbasaa ya.” Rut agbasaa ya, ya amanye ya ọka bali nke dị sia isii* ma bo ya. Boaz wee banye n’obodo.
16 Rut wee lakwuru nne di ya. Nne di ya asị ya: “Nwa m, olee otú ihe si gaa?”* O wee gwa ya ihe niile nwoke ahụ meere ya. 17 Ọ gwakwara ya, sị: “O bunyere m ọka bali a dị sia isii, sịkwa m, ‘Agbala aka lakwuru nne di gị.’” 18 Naomi wee sị: “Chere, nwa m, ruo mgbe ị matara otú okwu a ga-esi gaa, n’ihi na nwoke ahụ agaghị ezu ike ruo mgbe o mere ka okwu a bie taa.”