Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 2-5
  • Ihe Otiti nke Enweghị Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Otiti nke Enweghị Ọrụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọganihu Na-adịghị Agbanwe Agbanwe
  • Ọnụ Ahịa Dị Elu nke Enweghị Ọrụ
  • ‘Ndị Mkpọrọ nke Usoro Rụrụ Arụ’
  • Ibu Amụma na Ndakpọ Olileanya
  • Enweghị Ọrụ—n’Ihi Gịnị?
    Teta!—1996
  • Nnwere Onwe Pụọ n’Enweghị Ọrụ—n’Ụzọ Dị Aṅaa, Olee Mgbekwa?
    Teta!—1996
  • Gịnị Mere “Ọrụ A Ga-arụ Ruo Ogologo Ndụ Nile”?
    Teta!—2000
  • Jehova Agaghị Ahapụ Gị Ma Ọlị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 3/8 p. 2-5

Ihe Otiti nke Enweghị Ọrụ

Site N’aka Onye Nta Akụkọ Teta! N’itali

Ọ bụ ọnọdụ mberede n’ọtụtụ mba ndị mepere emepe—ma ọ na-enyekwa mba ndị ka na-emepe emepe nsogbu. Ọ dakwasịwo ebe o yiri ka ọ dịghị n’oge gara aga. Ọ na-emetụta ọtụtụ narị nde ndị mmadụ—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nne na nna. Nye ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị Itali, ọ bụ “ihe kasị na-eyi egwu.” Ọ na-akpata nsogbu ndị ọhụrụ nke ọha mmadụ. Ruo n’ókè ụfọdụ, ọ bụ ya na-akpata nsogbu nke ọtụtụ ndị na-eto eto na-etinye aka n’ọgwụ ọjọọ. Ọ na-echu ọtụtụ nde mmadụ ụra, nyekwa ọtụtụ nde ndị ọzọ, ọ pụrụ imetụta ha n’isi nso . . .

“ENWEGHỊ ọrụ bụ ma eleghị anya ihe ijuanya a kasị atụ egwu nke oge anyị,” ka Òtù Na-ahụ Maka Njikọ Aka nke Akụ̀ na Ụba na Mmepe (OECD), na-ekwenye. “A matara ọ̀tụ̀tụ̀ na ihe ndị na-esi n’ihe ijuanya a pụta,” ka Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Europe na-ede, ma “ime ihe banyere ya siri oké ike.” Ọ bụ “mmụọ,” ka otu ọkachamara na-ekwu, nke “na-alọghachi iji nọgide n’okporo ámá nke Kọntinent Ochie ahụ.” N’Òtù Ndị Europe (EU) ahụ, ndị na-enweghị ọrụ ugbu a dị ihe dị ka 20 nde n’ọnụ ọgụgụ, n’October 1994 kwa, n’Itali nanị, òtù ahụ kwupụtara na ha dị 2,726,000. Nye kọmishọna Òtù Ndị Europe bụ Padraig Flynn, “ịgwọta nsogbu enweghị ọrụ bụ ihe ịma aka ọha mmadụ na nke akụ̀ na ụba nke anyị na-eche ihu.” Ọ bụrụ na i nweghị ọrụ ma ọ bụ na ị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a kwụsịrị ọrụ, ị maara egwu ọ na-akpata.

Ma enweghị ọrụ abụghị nsogbu nanị ndị Europe. Ọ na-eti mba America nile ihe otiti. Ọ dịghị emere Africa, Esia, ma ọ bụ Oceania ebere. Mba ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe anọwo na-eche nsogbu ahụ ihu n’afọ ndị na-adịbeghị anya. N’ezie, ọ dịghị emetụta ebe nile n’otu ụzọ ahụ. Ma dị ka ụfọdụ ndị ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba si ekwu, ọ̀tụ̀tụ̀ enweghị ọrụ na Europe n’Ebe Ugwu America ka ga-adị elu ruo ogologo oge karịa ka ọ dị n’iri afọ ndị gara aga.a Ọnọdụ ahụ “na-akawanyekwa njọ n’ihi mmụba nke enweghị ike inweta ego ga-ezuru mmadụ na mbibi metụtara ihe nile n’ọdịdị ọrụ ndị e nwere,” ka ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ Renato Brunetta na-arụtụ aka.

Ọganihu Na-adịghị Agbanwe Agbanwe

Enweghị ọrụ emetụtawo akụkụ nile nke ọnọdụ akụ̀ na ụba n’otu n’otu: nke mbụ bụ ọrụ ubi, ya na ụzọ ọgbara ọhụrụ ya na-arị elu, bụ nke na-achụpụsị ndị mmadụ n’ọrụ; ọzọ bụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, nke ọgba aghara ihe na-enye ike metụtaworo malite n’afọ ndị 1970 gaa n’ihu; ugbu a kwa, ngalaba ọrụ ije ozi—azụmahịa, mmụta—ngalaba e cheburu na ọ dịghị ihe pụrụ ime ya. Ọ̀tụ̀tụ̀ enweghị ọrụ ji pasent 2 ma ọ bụ 3 gafee ihe a chọrọ n’ime 20 afọ gara aga ga-akpataworị oké ụjọ. Taa mba mepere emepe na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na enweghị ọrụ erughị pasent 5 ma ọ bụ 6, ọtụtụ mba ndị mepere emepe nwekwara ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ka nnọọ elu.

Dị ka Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ (ILO) si kwuo, onye a na-eweghị n’ọrụ bụ onye na-enweghị ọrụ, dị njikere ịrụ ọrụ, na-achọsikwa ọrụ ike. Ma gịnị banyere onye na-enweghị ọrụ na-adịgide adịgide a na-arụ mgbe nile ma ọ bụ onye na-ejisi ike ịrụ ọrụ nanị hour ole na ole n’izu? A na-ele ọrụ nwa oge anya n’ụzọ dịgasị iche site n’otu mba gaa n’ọzọ. Ná mba ụfọdụ, gọọmenti na-agụnye ụfọdụ ndị na-enweghị ọrụ n’ezie ná ndị e were n’ọrụ. Ọnọdụ ndị na-edochaghị anya dị n’agbata inwe ọrụ na enweghị ọrụ na-eme ka o sie ike ịmata onye na-enweghị ọrụ n’ezie, n’ihi nke a kwa ndekọ ọnụ ọgụgụ na-akọwa nanị akụkụ nke ọnọdụ dịnụ. “Ọbụna ọnụ ọgụgụ gọọmenti wepụtara bụ́ 35 nde na-enweghị ọrụ [ná mba ndị so n’òtù OECD] adịghị egosi ókè zuru ezu nke enweghị ọrụ,” ka otu ihe ọmụmụ e bipụtara na Europe na-ekwu.

Ọnụ Ahịa Dị Elu nke Enweghị Ọrụ

Ma ọnụ ọgụgụ ndị ahụ adịghị akọwa ọnọdụ ahụ dum. “Ọnụ ahịa nke enweghị ọrụ n’ụzọ akụ̀ na ụba na ọha mmadụ buru oké ibu,” ka Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Europe na-ekwu, ha na-esitekwa “ọ bụghị nanị site n’ego enyemaka a na-enye ndị na-enweghị ọrụ kamakwa site ná mfu nke ego ndị ahụ na-enweghị ọrụ gaara akwụ ma a sị na ha nwere ọrụ.” Ego enyemaka a na-enye ndị na-enweghị ọrụ na-abụwanyekwa ibu arọ, ọ bụghị nanị nye gọọmenti kamakwa nye ndị nwere ọrụ, bụ́ ndị a na-eme ka ha na-akwụ ụtụ isi dị elu.

Enweghị ọrụ abụghị nanị okwu banyere ihe ọmụma na ọnụ ọgụgụ. Ha na-arụpụta ọnọdụ ndị e nwere n’otu n’otu, n’ihi na ihe otiti a na-emetụta ndị mmadụ—ndị ikom, ndị inyom, na ndị ntorobịa nke ọkwá ọha mmadụ ọ bụla. Ịbụ nke e jikọtara ya na nsogbu nile ọzọ nke “mgbe ikpeazụ” ndị a, enweghị ọrụ pụrụ nnọọ ịbụ ibu dị oké arọ. (2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 6:5, 6) Karịsịa ọ bụrụ na “enweghị ọrụ ruo ogologo oge” dakwasịrị ya, ma ọ dịghị ihe ọzọ, onye na-enwekwaghị ọrụ ruo ogologo oge ga-enwe ihe isi ike ka ukwuu n’inweta ọrụ. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ nwere ike ha agaghị enweta ọrụ ọzọ.b

Ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na-achọpụta na n’etiti ndị na-enweghị ọrụ taa, nsogbu ụbụrụ na nke uche na-arị elu, tinyekwara nsogbu mmetụta uche, nkụda mmụọ, enweghị mmasị na-aga n’ihu, na enweghị ùgwù onwe onye. Mgbe onye nwere ụmụ ọ ga-elekọta na-enwekwaghị ọrụ, ọ bụ ọdachi onwe onye nke siri oké ike. Ha enweghị olileanya ma ọlị. Ịnọ ná ntụkwasị obi apụwo n’anya. Taa, n’eziokwu, ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu banyere mpụta nke “nchegbu a na-atụ anya ya” nke metụtara ikwe omume nke mmadụ ịbụ onye na-enwekwaghị ọrụ. Nchegbu nke a pụrụ imetụta mmekọrịta ezinụlọ n’ụzọ dị njọ, ọ pụkwara ọbụna inwe ihe ndị ka njọ ọ na-arụpụta, dị ka ogbugbu ndị na-enweghị ọrụ gburu onwe ha n’oge na-adịbeghị anya pụrụ igosi. Ọzọkwa, ihe isi ike nke inweta ọrụ mbụ so n’ime ihe ndị pụrụ ịdị na-akpata ime ihe ike na ndị na-eto eto ikewapụ onwe ha n’ebe ọha mmadụ nọ.

‘Ndị Mkpọrọ nke Usoro Rụrụ Arụ’

Teta! agbawo ọtụtụ ndị na-enwekwaghị ọrụ ajụjụ ọnụ. Armando dị 50 afọ sịrị na nye ya, ọ pụtara “ịhụ ka a lara mgbalị nile nke ọrụ e ji 30 afọ rụọ n’iyi, na ịmaliteghachi n’isi,” inwekwa mmetụta “dị ka onye mkpọrọ nke usoro rụrụ arụ.” Francesco ‘hụrụ ka olileanya ya nile kụrụ afọ n’ala.’ Stefano “nwere mmetụta dị ukwuu nke ndakpọ olileanya n’usoro ịdị ndụ e nwere ugbu a.”

N’aka nke ọzọ, Luciano, onye a chụrụ n’ọrụ mgbe ọ rụsịworo ọrụ ná ngalaba ọrụ aka nke otu ebe dị mkpa a na-emepụta ngwá ahịa n’Itali ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ, “were iwe ma nwee ndakpọ olileanya mgbe ọ hụrụ na e weere mgbalị, ezi àgwà, na ya ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi dị ka ihe n’abaghị uru.”

Ibu Amụma na Ndakpọ Olileanya

Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba atụwo anya ọnọdụ ndị dị nnọọ iche. Na 1930, ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ John Maynard Keynes ji nchekwube buo amụma “ọrụ maka ndị nile” n’ime 50 afọ na-abịanụ, ruokwa ọtụtụ iri afọ, e lewo ịrụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị anya dị ka ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru. Na 1945 Akwụkwọ Nkwekọrịta òtù Mba Ndị Dị n’Otu setịpụrụ iru n’ụzọ dị ngwa n’ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị. Ruo n’oge na-adịbeghị anya e chere na ọganihu ga-apụtara ndị nile inwe ọrụ na iji hour dị ala karị arụ ọrụ. Ma ihe emebeghị otú ahụ. Oge mbelata siri ike nke akụ̀ na ụba nke afọ iri gara aga akpatawo “ọgba aghara ọrụ kasị njọ nke zuru ụwa ọnụ kemgbe Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba nke afọ ndị 1930,” ka òtù ILO na-ekwu. Ọ dịkarịa ala 3.6 nde mmadụ enwekwaghị ọrụ na South Africa, tinyere ihe dị ka nde 3 ndị Africa na-eji oji. Ọbụna Japan—nke nwere ihe karịrị nde abụọ ndị na-enwekwaghị ọrụ n’afọ gara aga—nọ n’ime ọgba aghara.

N’ihi gịnị ka enweghị ọrụ ji bụrụ ihe otiti zuru ebe nile otú a? Ihe ngwọta ndị dị aṅaa ka a tụpụtaworo iji mee ihe banyere ya?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ̀tụ̀tụ̀ enweghị ọrụ bụ pasent nke ngụkọta ndị nwere ike ịrụ ọrụ na-enweghị ọrụ.

b “Ndị na-enweghị ọrụ ruo ogologo oge” bụ ndị na-enwekwaghị ọrụ ha na-arụ ruo ọnwa 12. N’òtù EU, ihe dị ka ọkara nke ndị na-enweghị ọrụ nọ n’ọkwá a.

[Map dị na peeji 2, 3]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Canada—9.6 pasent

U.S.A.—5.7 pasent

Colombia—9 pasent

Ireland—15.9 pasent

Spain—23.9 pasent

Finland—18.9 pasent

Albania—32.5 pasent

South Africa—43 pasent

Japan—3.2 pasent

Philippines—9.8 pasent

Australia—8.9 pasent

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps™ copyright © 1993 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya