Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 11/8 p. 8-9
  • Otu Okpukpe Ga-afọdụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Okpukpe Ga-afọdụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Iyi nke Obi Ike Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 11/8 p. 8-9

Otu Okpukpe Ga-afọdụ

CHEEDỊ echiche ihe ọ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na ndị nile nọ n’elu ụwa dị n’otu n’otu okpukpe, n’otu ofufe dị ọcha nke nanị ezi Chineke ahụ. Lee isi iyi ịdị n’otu nke ahụ ga-abụ! A gaghị enwekwa ọgụ okpukpe, esemokwu, ma ọ bụ agha. Nke a ọ̀ bụ nanị nrọ? Ee e. Ọhụụ Jọn onyeozi banyere mbibi nke nwanyị ahụ na-akwa iko, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, na-egosi na otu ụdị okpukpe ga-afọdụ mgbe e bibisịrị nwanyị ahụ. Olee nke?

Olu Jọn nụrụ site n’eluigwe na-enye anyị otu ihe inyeaka: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” (Mkpughe 18:4) Ọ pụtara ìhè na Chineke onwe ya na-agwa ndị ya okwu n’ebe a. Rịba ama na ọ dịghị enye ndị ya iwu ịgwakọta onwe ha n’ebe nwanyị ahụ na-akwa iko nọ ná mgbalị njikọ okpukpe iji zọpụta ya site n’inyere ya aka ịgbanwe gaa ná ndụ dị mma. Ee e, e nweghị ọgwụgwọ dịịrị ya. N’ihi ya, ọ na-enye ha iwu isi n’ime ya pụta ma nọpụ iche n’ebe ọ nọ iji zere ịbụ ndị e ji mmehie ya jọgburu onwe ya metọọ, na iji zere ịbụ ndị a ga-emesị kpekọọ ha na ya ikpe ma bibikọọ ha.

Iwu ahụ sitere n’eluigwe ‘isi n’ime ya pụta’ na-enyekwara ndị ji obi eziokwu na-achọ eziokwu aka ịmata ndị Chineke. Ha pụrụ ịjụ onwe ha, sị, ‘Olee ndị taa n’elu ụwa ṅaworo ntị n’iwu a site n’ikewapụ onwe ha site n’okpukpe, òtù, ma ọ bụ ìgwè ọ bụla nke ndị na-efe ofufe nwere njikọ na “Babilọn Ukwu ahụ”? (Mkpughe 18:2) Olee ndị n’elu ụwa taa siworo otú a nwere onwe ha pụọ na nkwenkwe, ụkpụrụ okwukwe, ihe omume, na ọdịnala nile nke Babilọn?’ Olee ndị ọzọ ọ pụrụ ịbụ ma e wezụga Ndịàmà Jehova? N’ime ihe karịrị 5.2 nde Ndịàmà n’ime ihe karịrị ala 230, bụ́ ndị nile sonyewooro okpukpe ụfọdụ nke Babilọn na mbụ, site n’ọmụmụ ma ọ bụ ntọghata, ekwupụtawo na ha agbahapụwo ya—mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị nkwugide na mmegide site n’aka ndị ikwu, ndị enyi, na ndị ndú okpukpe.

Otu ihe atụ bụ Henry, nwoke South Africa, bụ́ onye odebe ego chọọchị ya, nke o ji kpọrọ oké ihe. Ma ọ nọ na-achọ eziokwu, otu ụbọchị kwa ọ nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu n’aka Ndịàmà Jehova. Ka oge na-aga, mgbe o kpebiri ịghọ Onyeàmà, ọ gwara pastọ ya, bụkwa onye agbata obi dị ya nso, na ya chọrọ iwepụ aha ya na chọọchị.

O juru pastọ ahụ anya, o mesịakwa kpọrọ onye isi oche na ndị òtù ọzọ nke chọọchị ahụ gaa ileta Henry. Ha jụrụ ya ihe mere o ji hapụ chọọchị ha iji ghọọ onye òtù okpukpe, dị ka ha si kwuo, nke na-enweghị mmụọ nsọ Chineke. “Na mbụ, atụrụ m egwu ịzaghachi ha,” ka Henry kwuru, “n’ihi na ha enwewo mmetụta dị ukwuu n’ahụ m mgbe nile. Ma ekpegaara m Jehova ekpere maka enyemaka, o nyekwaara m aka ime ngọpụ a: ‘N’ime okpukpe dum zuru ụwa ọnụ, olee nke na-eji aha Chineke, bụ́ Jehova, eme ihe mgbe nile? Ọ́ bụghị Ndịàmà Jehova? Ùnu chere na Chineke ga-ekwe ka ha kpọkwasị onwe ha aha ya ma gharakwa inye ha mmụọ nsọ ya n’otu aka ahụ?’” Ndị isi chọọchị ahụ enweghị ike ịgbagha arụmụka nke a, Henry bụkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ugbu a.

Ya mere mgbe olu ahụ sitere n’eluigwe na-enye iwu, sị: “Sinụ n’ime ya pụta,” e nwere ebe a ga-eje. (Mkpughe 18:4) E nwere ndị mmadụ, ndị na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ndị ị pụrụ ịgbakwuru. Ọtụtụ nde agbapụwo. N’ịbụ ndị a matara dị ka Ndịàmà Jehova, ha mejupụtara òtù ụmụnna ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ, a haziri n’ime ihe karịrị ọgbakọ 78,600, ndị na-enwekwa uto kasị ukwuu ugbu a n’akụkọ ihe mere eme ha. Ha emewo ihe karịrị mmadụ 1,200,000 baptism n’ime afọ anọ gara aga! Tupu baptism, ndị a nile enwezuwo usoro ọmụmụ Bible na-akpali akpali n’ụzọ ime mmụọ, na-eme ka ha nwee ike ime mkpebi onwe onye nwere ezi ndabere ịgbahapụ njikọ nile ha na okpukpe ọ bụla ọzọ nweburu.—Zefanaịa 2:2, 3.

Ọ bụrụ na i jebeghị nzukọ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova n’otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, gịnị ma i mee otú ahụ n’izu a? Ihe ị ga-ahụ ma nụ pụrụ imetụ gị n’ahụ n’ụzọ dị mma. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịghọta Bible, gịnị ma ị gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka ọ mụọrọ gị ya, dị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ meworo? Ọ bụrụ na ekpere gị bụ maka ezi nghọta nke Okwu Chineke tinyere ụzọ ndụ nke kwekọrọ n’Okwu ahụ, ị ga-achọta azịza nye ekpere gị.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ọtụtụ nde na-echigharịkwuru ofufe nke Jehova Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya