Echiche nke Bible
È Kwesịrị Ịsọpụrụ Ndị Nwụrụ Anwụ?
“ECHICHE GBANYESIRI MKPỌRỌGWỤ IKE NA-AKPALI IHE KA ỌTỤTỤ NÁ NDỊ MMADỤ ỊKWANYERE OZU MMADỤ ÙGWÙ A NA-ADỊGHỊ AKWANYERE OZU ANỤMANỤ.”—ENCYCLOPÆDIA BRITANNICA.
IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-asọpụrụ ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. A na-asọpụrụ ndị nwụrụ anwụ site n’ịma ọkwa ọnwụ ha n’akwụkwọ akụkọ, a na-etokwa ha oké otuto. N’ala ụfọdụ a na-emekarị oké ememe olili ozu okpukpe ma ọ bụ nke ọdịnala. A pụrụ imere ndị nwụrụ anwụ ememe ruo ọtụtụ ụbọchị, izu, ma ọ bụ ọnwa. A na-aba ụlọ akwụkwọ, ọdụ ụgbọelu, okporo ámá, na obodo aha ndị a ma ama nwụworo anwụ. A na-arụ ihe ncheta ma guzobe ụbọchị ezumike iji cheta ndị a ma ama.
Otú ọ dị, dị ka Okwu Chineke si kwuo, ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ma ọlị banyere nsọpụrụ ọ bụla a na-enye ha. (Job 14:10, 21; Abụ Ọma 49:17) Ndị nwụrụ anwụ dị ndụ nanị n’uche nke ndị na-echeta ha. Bible na-ekwu, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Akwụkwọ Nsọ na-enye olileanya nke mbilite n’ọnwụ ga-ewere ọnọdụ n’ọdịnihu. (Jọn 5:28, 29; 11:25) Ka ọ dịgodị ugbu a, ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ. Ha na-aghọ ájá nkịtị.—Jenesis 3:19; Job 34:15.
N’ihi ihe doro anya nke Bible kwuru banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ọ̀ bara uru ịsọpụrụ ha? Ò kwesịrị ka ndị Kraịst gbasoo ememe ọdịnala ndị metụtara olili ozu nke ndị ha hụrụ n’anya?
Ememe Ndị Dabeere n’Echiche Ụgha
Ọtụtụ, ma eleghị anya ihe ka ọtụtụ n’ime ememe ọdịnala a na-emere ndị nwụrụ anwụ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ozizi okpukpe ndị na-esiteghị na Bible. A na-eme ememe ụfọdụ n’ebumnobi nke “ichebe ndị nwụrụ anwụ pụọ ná mwakpo nke ndị mmụọ ọjọọ; mgbe ụfọdụ nzube e ji eme ememe ndị ahụ abụrụwo ichebe ndị dị ndụ pụọ n’ịnwụ n’otu ụzọ ahụ ma ọ bụ pụọ n’obi ọjọọ nke ndị nwụrụ anwụ,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu. Omenala ọ bụla dị otú ahụ nke dabeere n’echiche ụgha bụ́ na ndị nwụrụ anwụ na-adị ndụ n’ógbè a na-adịghị ahụ anya na-emegide eziokwu Bible.—Eklisiastis 9:10.
Ọtụtụ ndị na-efe ndị nke ha nwụrụ anwụ ofufe. Ụdị Ofufe a na-agụnye ịchụ àjà nye ndị nna nna nwụrụ anwụ na ikpegara ha ekpere. Ndị ụfọdụ na-eme ememe ndị dị otú ahụ adịghị ele omume ha anya dị ka ofufe, kama nke ahụ, dị ka ngosipụta nke nsọpụrụ ma ọ bụ nkwanye ùgwù dị omimi maka ndị nwụrụ anwụ. Ka o sina dị, ụdị nsọpụrụ a a na-enye ndị nna nna nwụrụ anwụ gbakwasịrị ụkwụ n’okpukpe ma na-emegide ozizi Bible. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.”—Luk 4:8.
Echiche Ziri Ezi
Ọ bụghị mgbe nile ka ịsọpụrụ ndị nwụrụ anwụ na ịkwanyere ha ùgwù na-enwe ihe jikọrọ ha na ozizi okpukpe ụgha. Dị ka ihe atụ, otu ihe ndekọ Bible na-akọ otú e si sọpụrụ Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọ nwụsịrị. Ndị Chineke wee “lie ya n’ebe nrịgo nke ili ụmụ Devid. Juda nile na ndị bi na Jerusalem wee meere ya ihe nsọpụrụ n’ọnwụ ya.” (2 Ihe E Mere 32:33) Ihe atụ ọzọ bụ nke Jisọs. Bible na-ekwu na ndị na-eso ụzọ ya “weere ahụ Jisọs, kee ya n’ezi ákwà ozu, ya na ụda ụtọ ndị a, dị ka ndị Juu na-eme n’ili ozu.”—Jọn 19:40.
Akwụkwọ Nsọ nwere akụkọ banyere ọtụtụ oge ndị ọzọ mgbe a gbasoro usoro ndị pụrụ iche kwesịrị ekwesị maka ozu na olili nke ndị nwụrụ anwụ. Ihe ndị a e mere abụghị ofufe ndị nna nna, ha adabereghịkwa na nkwenkwe hiere ụzọ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ na-anọgide na-emetụta ihe ndị dị ndụ na-eme. Kama nke ahụ, ndị ahụ na-eru újú gosipụtara nkwanye ùgwù miri emi maka ndị ha hụrụ n’anya. Bible adịghị akatọ nkwanye ùgwù dị otú ahụ, ebe ọ dabeere ná mmetụta uche ebumpụta nke mmadụ, otú ọ dị, Bible adịghị akwado oké ngosipụta ma ọ bụ ịkwabiga ákwá ókè n’ememe olili ozu. N’aka nke ọzọ, ọ dịghị agba ndị Kraịst ume ịbụ ndị na-enweghị mmetụta na ndị obi kpọrọ nkụ mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụrụ.
N’ihi ya, mgbe ha gara olili ozu nke ndị ha hụrụ n’anya, Ndịàmà Jehova na-akwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù, na-enyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ekwesị. (Eklisiastis 7:2) Mgbe a bịara n’okwu banyere okooko osisi, ememe olili ozu, na omenala ndị ọzọ nke obodo, ndị Kraịst na-eji nlezianya eme nhọrọ onwe onye iji zere omume ndị megidere ozizi Bible. Na nke a, ọ dị mkpa inwe ezi echiche na imeru ihe n’ókè. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia of Religion and Ethics na-akọwa na “ihe ememe pụtara na abamuru ya na-agbanwe site n’oge ruo n’oge, nke na ihe ọ pụtara ka oge na-aga pụrụ ịdị nnọọ iche n’ihe ọ pụtara na mbụ, nkọwa a na-enyekarị banyere ya nwere ike ọ gaghị eme ka a mata otú o si malite.”a
Ọ̀ Dị Njọ Ito Oké Otuto?
Ụkpụrụ nke imeru ihe n’ókè na-emetụtakwa okwu banyere ito onye nwụrụ anwụ oké otuto. N’ememe olili ozu, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịkasi ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. (2 Ndị Kọrint 1:3-5) Usoro ihe omume a na-eji eme ya pụrụ ịgụnye otu ọkà okwu ma ọ bụ karịa. Ma ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ime ka ememe ahụ ghọọ nke ndị mmadụ ga-akwụ n’ahịrị na-eto onye ahụ nwụrụ anwụ oké otuto. Kama nke ahụ, olili ozu bụ ohere iji too àgwà ndị dị ebube nke Chineke, gụnyere obiọma ya n’inye anyị olileanya nke mbilite n’ọnwụ.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọ ga-adị njọ icheta àgwà ọma nke onye ahụ nwụrụ anwụ mgbe a na-ekwu okwu olili ozu. (Tụlee 2 Samuel 1:17-27.) Mgbe onye ahụ nwụrụ anwụ kwesịworo ntụkwasị obi nye Chineke ruo n’ọnwụ ya, ọ na-aghọ ihe nlereanya magburu onwe ya a ga-eṅomi. (Ndị Hibru 6:12) Ọ dị mma ịtụgharị uche n’ụzọ iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke. Iso ndị ọzọ kerịta echiche ndị a ziri ezi mgbe a na-eme ememe olili ozu na-akasi ndị dị ndụ obi ma na-eme ka a kwanyere onye ahụ nwụrụ anwụ ùgwù mgbe e chetara ya.
Ezi ndị Kraịst adịghị efe ndị nwụrụ anwụ ofufe. Ha adịghị eme ememe ndị a na-emekarị bụ́ ndị megidere eziokwu Bible. N’aka nke ọzọ, ndị ohu Chineke na-ajụ echiche ahụ gabigara ókè bụ́ na omenala olili ozu nile enweghị nzube, na ha adịghịkwa mkpa n’ihi na ndị nwụrụ anwụ bụ nanị ájá. Ha na-eru újú n’ihi ndị ha nwụrụ anwụ ma na-echeta ha. Ma eziokwu Bible nke bụ́ na ndị nwụrụ anwụ adịghị ata ahụhụ nakwa na e nwere olileanya nke mbilite n’ọnwụ na-ebelata ihe mgbu na iru újú ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mbipụta Ụlọ Nche nke October 15, 1991, peji nke 31, na-enye ntụziaka na-esonụ: “Ezi onye Kraịst kwesịrị ịtụle: Ịgbaso otu omenala ọ̀ ga-egosi ndị ọzọ na anabatawo m nkwenkwe ma ọ bụ omenala ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị? Oge na ebe a nọ eme ihe ahụ pụrụ imetụta azịza ya. Ọ pụrụ ịbụ na otu omenala (ma ọ bụ ihe ịchọ mma) nwere ihe ọ pụtara nke metụtara okpukpe ụgha n’ọtụtụ puku afọ gara aga ma ọ bụ ọ pụrụ inwe ihe dị otú ahụ ọ pụtara n’oge a n’ala dị anya. Ma, n’ejeghị malite ime nchọpụta nke na-ewe oge, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú a na-esikarị ele ya anya n’ebe m bi?’—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:25-29.”
[Foto dị na peeji nke 10]
Ememe olili ozu Gustav nke Abụọ, bụ́ eze ndị Sweden, mgbe ọ nwụsịrị na 1632
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Bildersaal deutscher Geschichte