Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 6/8 p. 32
  • Ọtụtụ Nde Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọtụtụ Nde Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Teta!—2000
  • A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke”!
    Teta!—2001
  • Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998-1999 Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 6/8 p. 32

Ọtụtụ Nde Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?

GBURUGBURU ụwa, kwa afọ, ihe karịrị nnọọ nde mmadụ asatọ na-aga mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Malite n’October 1999 ruo January 2000, a ga-enwe Mgbakọ Distrikti ụbọchị atọ nke “Okwu Amụma nke Chineke” dị 109 na Nigeria. Ma eleghị anya a ga-enwe otu n’ebe dịdebere ebe i bi. Anyị na-agba gị ume ịnọ ya mgbe ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite n’elekere 9:20 n’ụtụtụ Friday.

Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-agụnye okwu mmeghe nakwa okwu bụ́ isi bụ́ “Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke.” N’ehihie, usoro isiokwu bụ́ “Ka Ịgụ Okwu Chineke Na-atọ Gị Ụtọ” ga-atụ aro ndị bara uru banyere ụzọ isi mee ka ọgụgụ Bible baa uru ma bụrụ nke na-atọ ụtọ. Okwu mmechi nke ụbọchị ahụ, bụ́ “Ndị Na-alụso Chineke Ọgụ Agaghị Enwe Ihe Ịga nke Ọma,” ga-atụleghachi ọgụ a lụsoro ndị nkwusa Alaeze Chineke n’oge a.

Ihe omume nke ụtụtụ Saturday nwere okwu baptism, a ga-enwekwa ohere maka ime ndị ruru eru baptism. N’ehihie a ga-akọ akụkọ ndị na-agba ume banyere nnabata magburu onwe ya nke ndị mmadụ na-anabata eziokwu Bible n’ụfọdụ mba ndị dị na Latin America, Africa, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, nakwa ná mba Esia buru ibu bụ́ Kazakhstan. Isiokwu nke ihe omume a bụ “‘Ihe A Na-achọsi Ike’ Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova.” Usoro ihe omume nke Saturday ga-eji okwu abụọ mechie, “Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Bụ́ Amụma Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Ịnọ na Nche” na “Okwu Amụma ahụ ná Mgbe Ọgwụgwụ.” Nke ikpeazụ ga-elekwasị anya n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel ma kọwaa ọtụtụ ihe mere a ga-eji ṅaa ntị n’amụma ya.

N’ụtụtụ Sunday, usoro isiokwu mmadụ atọ ga-ekwu, nke ga-ewe otu awa, nke isiokwu ya bụ “Okwu Amụma Maka Oge A Kara Aka” ga-atụle amụma Habakuk. Ị ga-ahụ ihe agbamume obere akwụkwọ Bible a pụrụ ịbụrụ ndị Kraịst taa. Mgbe nke ahụ gasịrị ihe nkiri a ga-eji ejiji zuru ezu mee, nke na-egosi akụkọ Bible banyere Jekọb na Isọ, ga-akọwa isiokwu bụ́ “Inwe Ekele Maka Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị.” Okwu na-akpali akpali bụ́ “Gịnị Ka Ihe Nketa Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Pụtara Nye Gị?” ga-eweta ihe omume nke ụtụtụ Sunday ná mmechi. N’ehihie, ị ga-egezi ntị n’okwu ihu ọha bụ́ “Ime Ka Ihe Nile Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma.”

Mee ndokwa ugbu a ịga. Iji chọta ebe ga-akasị nso n’ebe obibi gị, kpọtụrụ ndị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ degara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ. Magazin anyị a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche, nwere ndepụta nke ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria ná mbipụta ya nke May 1, 1999.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya