Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 12-16
  • Ịzụ Ụmụ N’africa N’oge Ihe Isi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịzụ Ụmụ N’africa N’oge Ihe Isi Ike
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịga Africa, na Ịlụ Di
  • Nkwaga Anyị Kwagara Southern Rhodesia
  • A Tụọ Ma Mụ Ma Bertie Mkpọrọ
  • Ozi Anyị Mgbe Agha Biri
  • Ọrụ Nkwusa Ọhụrụ
  • Nlaghachi Dị Ize Ndụ
  • E Jiri Ezinụlọ Na-ahụ n’Anya Gọzie M
  • Ahuwo M Ka Ọ Na-eto n’Ebe Ndịda Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Òtù Ụmụnna Anyị Zuru Ụwa Ọnụ Wusikwuru M Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ndụ Dị Ugbu A”—Ịnụ Ụtọ Ya Ruo n’Isi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 11/8 p. 12-16

Ịzụ Ụmụ N’africa N’oge Ihe Isi Ike

DỊ KA CARMEN MCLUCKIE SI KỌỌ

Afọ ahụ bụ 1941. Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akpọtụ. Abụ m nne dị afọ 23 si Australia, ma mụ na nwa ọhụrụ m dị ọnwa ise nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe a na Gwelo, Southern Rhodesia (bụ́ Gweru, Zimbabwe ugbu a). Di m nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Salisbury (bụ́ Harare ugbu a). Ụmụ di m abụọ nọ n’afọ iri na ụma na-elekọta ụmụ anyị ndị ọzọ—ndị dị afọ abụọ na atọ. Ka m kọwaa otú m si banye n’ọnọdụ a.

MỤ NA mama m na papa m bi na Port Kembla, nke dị ihe dị ka kilomita 50 n’ịgawa ebe ndịda Sydney, Australia. Na 1924, Clare Honisett kpọtụụrụ mama m ma kpalie mmasị ya n’ebe ozizi Bible dị site n’ịjụ ya ma ọ̀ ghọtara ihe Ekpere Onyenwe Anyị pụtara. Clare kọwara ihe ido aha Chineke nsọ pụtara, ọ kọwazikwara otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo uche Chineke n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) O juru mama m anya. N’agbanyeghị mmegide papa m, mama m malitere ilebakwu anya n’eziokwu Bible ndị dị otú ahụ.

N’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị, anyị kwagara n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Sydney. Site n’ebe ahụ mụ na mama m na-eje ije ihe dị ka kilomita atọ iji rute n’ebe a na-enwe nzukọ nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe nna m mesịrị ghọọ Onyeàmà, o kwere ka a na-anọ n’ebe obibi anyị enwe ọmụmụ Bible. Ụmụnne ya ndị nwoke abụọ—Max na Oscar Seidel—ghọrọ Ndịàmà, otú ahụ ka ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ Max ghọkwara, gụnyere nwanne m nwoke nke m tọrọ, bụ́ Terry, na nwanne m nwanyị nke m tọrọ bụ́ Mylda.

Na 1930, Watch Tower Society zụrụ otu ụgbọ mmiri dị mita 16, nke e mesịrị gụgharịa Lightbearer. Ruo afọ abụọ a kwụsịrị ụgbọ mmiri a n’akụkụ ụlọ anyị n’Osimiri Georges. N’ebe ahụ ka a nọ rụzie ya ka Ndịàmà Jehova nwee ike iji ya na-arụ ọrụ ime nkwusa n’àgwàetiti ndị dị n’Indonesia. Mgbe ụfọdụ mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Coral na-azachasị ime ụgbọ mmiri ahụ, anyị na-agbazirikwa oriọna na-adị na ya iji jee gbute oporo.

Ịga Africa, na Ịlụ Di

Australia nwere ndakpọ akụ̀ na ụba n’etiti afọ ndị 1930, mụ na mama m gawakwara South Africa iji mara ma ọ ga-adị ezinụlọ anyị mma n’ahụ ibi n’ebe ahụ. Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Australia nyere anyị akwụkwọ nkọwa inye George Phillips, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa n’ebe ndịda Africa mgbe ahụ. George nọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị na Cape Town izute ụgbọ mmiri anyị. Ọ kpafanyere akwụkwọ Watch Tower Society bụ́ Riches na mkpaabụ ya ka anyị wee nwee ike ịmata ya. N’otu ụbọchị ahụ, na June 6, 1936, ọ kọwaara mmadụ ise so n’òtù ndị ọrụ nke alaka ahụ, gụnyere otu onye aha ya bụ́ Robert A. McLuckie, ndị anyị bụ.a N’ime afọ ahụ, Mụ na Bertie—dị ka anyị nile na-akpọ ya—lụrụ.

Nna nna ochie Bertie bụ́ William McLuckie si Paisley, Scotland bịa Africa na 1817. Na njem ndị mbụ o mere, William bịara mata Robert Moffat, bụ́ nwoke wepụtara ụzọ e si ede asụsụ Tswana ma sụgharịa Bible gaa n’asụsụ ahụ.b N’oge gboo ahụ, William na onye òtù ya bụ́ Robert Schoon bụ nanị ndị ọcha Mzilikazi, bụ́ dike a ma ama so n’usuu ndị agha nke onyeisi Zulu a ma ama bụ́ Shaka, tụkwasịrị obi. N’ihi ya, ọ bụ nanị William na Robert bụ ndị ọcha e kwere ka ha banye n’ime obodo nta Mzilikazi, bụ́ ebe obodo Pretoria, South Africa, dị ugbu a. Mzilikazi mesịrị ghọọ onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị, jikọtakwa ọtụtụ ebo ịghọ alaeze etiti nke ndị Africa n’etiti narị afọ nke 19.

Mgbe m zutere Bertie ọ bụ onye nwunye ya nwụrụ, nke nwere otu nwa nwanyị dị afọ 12, bụ́ Lyall, na otu nwa nwoke dị afọ 11, bụ́ Donovan. Bertie nụrụ eziokwu Bible nke mbụ ya na 1927, ọnwa ole na ole mgbe nwunye ya bụ́ Edna nwụsịrị. N’ime afọ itoolu ndị sochirinụ, o kwusara ozi ọma nke Alaeze Chineke n’àgwàetiti Mauritius na Madagascar gụnyekwara gburugburu Nyasaland (bụ́ Malawi ugbu a), Portuguese East Africa (bụ́ Mozambique ugbu a), nakwa na South Africa.

Ọnwa ole na ole mgbe mụ na Bertie lụsịrị, anyị kpọọrọ Lyall na Donovan kwaga Johannesburg, bụ́ ebe ọ dịịrị Bertie mfe ịchọta ọrụ. Ruo nwa oge ejere m ozi dị ka ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Atụkwaara m ime Peter.

Nkwaga Anyị Kwagara Southern Rhodesia

Nwanne Bertie nke nwoke bụ́ Jack mesịrị kpọọ anyị òkù isonyere ya n’atụmatụ ọrụ igwupụta ọlaedo na nso Filabusi, na Southern Rhodesia. Mụ na Bertie kpọọrọ Peter, onye dị otu afọ mgbe ahụ, jee ebe ahụ, ebe mama m lekọtara Lyall na Donovan ruo nwa oge. Mgbe anyị rutere Osimiri Mzingwani, o tojuru etoju, iji gafere anyị aghaghịkwa ịbanye n’ime igbe e ji waya dọfee bụ́ nke e setịrị ogologo site n’otu ikpere mmiri nke osimiri ahụ gaa n’ọzọ. Adị m ime ọnwa isii Pauline, aghaghịkwa m ikukwasị Peter n’obi m ma jidesie ya ike! Ọ tụrụ m egwu, karịsịa mgbe ọ fọrọ nke nta ka waya ahụ metụ na mmiri n’etiti osimiri ahụ. E wezuga nke ahụ, ọ bụ etiti abalị, mmiri na-ezokwa! Mgbe anyị gafesịrị osimiri ahụ, anyị aghaghị ije ije ihe dị ka kilomita abụọ iji ruo n’ụlọ onye ikwu anyị.

Anyị mesịrị nweta ụlọ ochie àkị́kà bibisịrị anyị na-akwụ ụgwọ ya nke dị n’ugbo a na-azụ anụ ụlọ. Arịa ụlọ anyị dị ole na ole—anyị jiri osisi igbe e ji tinye ogbunìgwè na fuse rụọ ụfọdụ n’ime ha. Ọtụtụ mgbe Pauline rịara ọrịa ụkwara ume ọkụ, anyị azụtalighịkwa ọgwụ. O wutebigakwara m ókè, ma obi dị anyị ụtọ na n’oge nke ọ bụla Pauline na-emesị gbakee.

A Tụọ Ma Mụ Ma Bertie Mkpọrọ

Otu ugboro n’ọnwa, anyị mere njem gaa n’obodo Bulawayo, nke dị ihe dị ka kilomita 80 site n’ebe ahụ, ije ree ọlaedo anyị n’ikperé mmiri ya. Anyị gakwara Gwanda, otu obodo nta dị Filabusi nso, inweta ihe oriri na ikere òkè n’ozi. Na 1940, bụ́ afọ sochiri nke ahụ a malitere Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu na Southern Rhodesia.

N’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị, a nwụchiri m mgbe m nọ na-eme nkwusa na Gwanda. Mgbe ahụ adị m ime nwa m nke atọ, bụ́ Estrella. Mgbe a ka na-atụle arịrịọ mkpegharị ikpe m, a nwụchiri Bertie n’ihi ime nkwusa ma tụọ ya mkpọrọ na Salisbury, nke dị ihe karịrị kilomita 300 site n’ebe anyị bi.

Nke a bụ ọnọdụ anyị mgbe ahụ: Peter nọ n’ụlọ ọgwụ dị na Bulawayo na-arịa ọrịa mgbapịa nkọlọ, e jighịkwa n’aka na ọ ga-adị ndụ. M ka mụsịrị Estrella, otu enyi m akpọrọkwa m site n’ụlọ ọgwụ jee n’ụlọ mkpọrọ ije gosi Bertie nwa nwanyị ọhụrụ ya. Mgbe e mesịrị, mgbe a jụrụ arịrịọ mkpegharị ikpe m, otu onye India bara ọgaranya nke nwere ụlọ ahịa jiri obi ọma gbapụta m na mkpọrọ. Ka oge na-aga, ndị uwe ojii atọ bịara ịdọkpụrụ m n’ebe ahụ a na-egwupụta ọlaedo ije tụọ m mkpọrọ. Ha nyere m ụzọ ihe abụọ ka m họrọ otu. Apụrụ m ịkpọrọ nwa ọhụrụ m dị ọnwa ise gaa n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ hapụrụ ya ụmụ anyị nọ n’afọ iri na ụma, bụ́ Lyall na Donovan ilekọta. Ekpebiri m ịkpọrọ ya.

E kenyere m ọrụ ịdụzi uwe dọwara adọwa na idebe ebe ahụ ọcha. A kpọtakwara onye na-elekọta nwa iji nye aka lekọta Estrella. Ọ bụ nwa agbọghọ nọ n’ụlọ mkpọrọ nke aha ya bụ Matossi, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ mkpụrụ ọka n’ihi igbu di ya. Matossi kwara ákwá mgbe a tọhapụrụ m, n’ihi na ọ pụghịzi ilekọta Estrella. Nwanyị na-elekọta ndị mkpọrọ kpọọrọ m laa n’ụlọ ya inye m nri ehihie, tinyekwa m n’ụgbọ okporo ígwè ije leta Bertie n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Salisbury.

Mgbe mụ na Bertie nọ n’ụlọ mkpọrọ, Lyall na Donovan lekọtara obere Peter na Pauline. Ọ bụ ezie na Donovan dị nanị afọ 16, ọ gara n’ihu ilekọta ọrụ anyị nke igwupụta ọlaedo. Mgbe a tọhapụrụ Bertie n’ụlọ mkpọrọ, anyị kpebiri ịkwaga Bulawayo, ebe ọ bụ na ọrụ igwupụta ọlaedo ahụ adịghịzi aga nke ọma. Bertie nwetara ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè, ana m akpatakwukwa ego site n’itinye nkà ọhụrụ m mụtara dị ka onye na-akwa ákwà, n’ọrụ.

E weere ọrụ Bertie dị ka onye na-elekọta ụzọ okporo ígwè n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ dị ka nke dị mkpa, n’ihi ya a gụpụrụ ya n’ije ozi agha. N’afọ ndị ahụ a lụrụ agha, ndị ọcha iri na abụọ ma ọ bụ karịa bụ́ Ndịàmà nọ na Bulawayo na-ezukọ n’obere ụlọ anyị nke nwere otu ọnụ ụlọ ihi ụra maka nzukọ, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ole na ole bụ́ ndị isi ojii na-ezukọ n’ebe ọzọ n’obodo ahụ. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị ọgbakọ 46 nke Ndịàmà Jehova na Bulawayo, nke ndị ojii na ndị ọcha mejupụtara!

Ozi Anyị Mgbe Agha Biri

Ka a lụsịrị agha, Bertie gwara ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ ka a gbanweere ya ọrụ gaa n’Umtali (bụ́ Mutare ugbu a), obodo mara mma dị n’ókè Mozambique. Anyị chọrọ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, Umtali yikwara nnọọ ebe kwesịrị ekwesị, ebe ọ na-adịghị Onyeàmà nọ n’obodo ahụ. N’obere oge anyị ji nọọ n’ebe ahụ, ezinụlọ Holtshauzen, bụ́ nke gụnyere ụmụ ndị nwoke ise, ghọrọ Ndịàmà. Ugbu a e nwere ọgbakọ 13 n’obodo ahụ!

Na 1947 ezinụlọ anyị kparịtara otú ọ pụrụ isi kwe omume Bertie ịlaghachi n’ọrụ ịsụ ụzọ. Lyall, bụ́ onye siworo n’ịsụ ụzọ na South Africa lọghachi, kwadoro echiche a. N’oge ahụ, Donovan na-asụ ụzọ na South Africa. Mgbe alaka ụlọ ọrụ dị na Cape Town nụrụ banyere ọchịchọ Bertie ịmaliteghachi ịsụ ụzọ, ha gwara ya na kama nke ahụ ka o meghee ebe mbusa akwụkwọ na Bulawayo. Ya mere ọ gbara arụkwaghịm n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, anyị laghachikwara n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya nke a gasịrị, ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị mbụ bịara Southern Rhodesia bịarutere na Bulawayo, gụnyere Eric Cooke, George na Ruby Bradley, Phyllis Kite, na Myrtle Taylor.

Na 1948, Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke atọ nke Watch Tower Society, na odeakwụkwọ ya bụ́ Milton G. Henschel, bịara Bulawayo ma mee ndokwa ka ebe mbusa akwụkwọ ahụ ghọọ alaka ụlọ ọrụ, nke Nwanna Cooke ga-abụ onye nlekọta ya. N’afọ sochirinụ, a mụrụ m nwa anyị nwanyị bụ́ Lindsay. Mgbe ahụ, na 1950, e bufere alaka ahụ na Salisbury, bụ́ isi obodo Southern Rhodesia, anyị kwagakwara n’ebe ahụ. Anyị zụrụ otu nnukwu ụlọ bụ́ nke anyị biri na ya ruo ọtụtụ afọ. Ndị ọsụ ụzọ na ndị ọbịa na-anọ na nke anyị mgbe nile, n’ihi ya a bịara mara ebe obibi anyị dị ka ụlọ oriri McLuckie!

Na 1953, mụ na Bertie jere mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova n’Ámá Egwuregwu Yankee nke New York City. Lee ihe omume kwesịrị ncheta nke ahụ bụ! Mgbe afọ ise gasịrị, anyị na Lyall, Estrella, Lindsay, na Jeremy dị ọnwa 16 so jee mgbakọ mba nile nke 1958 ahụ buru oké ibu nke were ụbọchị asatọ n’Ámá Egwuregwu Yankee nakwa na Polo Grounds dị ya nso. Ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ịrịba ama nke ndị gere okwu ihu ọha n’ụbọchị nke ikpeazụ ya karịrị narị puku abụọ na iri ise!

Ọrụ Nkwusa Ọhụrụ

Bertie jere ozi ruo afọ 14 dị ka onye ọrụ na-esi n’ụlọ abịa nke alaka ụlọ ọrụ ahụ dị na Salisbury, ma anyị kpebiziri ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Seychelles. Anyị rere ụlọ na arịa ụlọ anyị, kwabajuo ihe onwunwe anyị ndị fọrọnụ n’ụgbọala Opel station wagon anyị. Anyị na Lindsay, dị afọ 12, na Jeremy, afọ 5, mere njem dị ihe dị ka kilomita 3,000 n’okporo ụzọ ndị jọrọ oké njọ gafere Northern Rhodesia (bụ́ Zambia ugbu a), Tanganyika (dị na Tanzania ugbu a), na Kenya, n’ikpeazụ bịaruo obodo Mombasa nke ọdụ ụgbọ mmiri dị na ya.

Mombasa na-ekpo ọkụ nke ukwuu, ma o nwere ụsọ mmiri ndị mara mma. Anyị hapụrụ ụgbọala anyị n’aka otu Onyeàmà bi n’ógbè ahụ ma malite njem ụgbọ mmiri were ụbọchị atọ iji jee Seychelles. Mgbe anyị rutere, Norman Gardner zutere anyị, bụ́ nwoke siteworo n’aka otu Onyeàmà nọ na Dar es Salaam, Tanganyika nweta ihe ọmụma bụ́ isi nke eziokwu Bible. O mere ndokwa ka anyị nweta ụlọ anyị ga na-akwụ ụgwọ ya n’Ụzọ Ngafere Sans Souci nke e wuru maka ndị uwe ojii chere Achịbishọp Ọtọdọks nke Gris bụ́ Makarios nche, bụ́ onye a chụpụworo na Saịprọs na 1956.

Ebe ọ bụ na ụlọ anyị dịpụrụ nnọọ adịpụ, mgbe otu ọnwa gasịrị anyị kwabara n’otu ụlọ dị n’ihu ụsọ osimiri dị na Beau Vallon. N’ebe ahụ ka anyị na-akpọkọta ndị mmadụ ịbịa gee okwu ndị Bertie na-anọ n’ihu ụlọ anyị ekwu. Anyị na ezinụlọ Bindschedler malitere inwe ọmụmụ Bible, mgbe ọnwa ole na ole gasịkwara, Bertie mere ha na nwa nkuchi ha nwanyị, gụnyekwara Norman Gardner na nwunye ya baptism. Anyị na Norman jikwa ụgbọ mmiri ya gaa Àgwàetiti Cerf, bụ́ ebe Bertie nọrọ n’ụlọ a na-adọba ụgbọ mmiri kwuo okwu ndị dabeere na Bible.

Mgbe anyị nọsịrị na Seychelles ihe dị ka ọnwa anọ, onyeisi ndị uwe ojii gwara anyị na anyị ga-akwụsịrịrị ime nkwusa ma ọ bụ a gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi. Ego anyị ebughị ibu, adịkwa m ime ọzọ. Anyị kpebiri ịnọgide na-eme nkwusa ihu ọha anyị. E kwuwerị, anyị maara na mee elu mee ala anyị ga-ala n’oge na-adịghị anya. Mgbe ụgbọ mmiri ọzọ si India bịarutere ka ihe dị ka ọnwa abụọ gasịrị, a gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi.

Nlaghachi Dị Ize Ndụ

Mgbe anyị rutere na Mombasa, anyị buuru ụgbọala anyị ma tinye isi n’ebe ndịda wee si n’ụzọ ájá ájá dị n’ụsọ oké osimiri na-aga. Mgbe anyị rutere Tanga, injin ụgbọala anyị ekweghịzi ịrụ ọrụ. Ọ fọrọ nke nta ka ego anyị gwụsịa, ma otu onye ikwu anyị na Onyeàmà ọzọ nyeere anyị aka. Mgbe anyị nọ na Mombasa, otu nwanna nwoke kwuru na ọ ga-akwado anyị n’ụzọ ego ma ọ bụrụ na anyị ga-eje n’ebe ugwu ruo Somalia ije mee nkwusa. Otú ọ dị, ejighị m ahụ, n’ihi ya anyị chọrọ nnọọ ịlaghachi n’ebe obibi anyị na Southern Rhodesia.

Anyị gbaara si Tanganyika banye Nyasaland ma mee njem garuo n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ Ọdọ Mmiri Nyasa, bụ́ nke a na-akpọ Ọdọ Mmiri Malawi ugbu a. Ọrịa jisiri m ike nke na m gwara Bertie ka ọ kwọtuo m n’akụkụ ụzọ ka m nọrọ ebe ahụ nwụọ! Anyị abịaruola obodo Lilongwe nso, ya mere ọ kpọjere m n’ụlọ ọgwụ dị n’ebe ahụ. Ọgwụ morphine ndị a gbara m mere ka m nwetatụ onwe m. Ebe ọ bụ na enweghị m ike iji ụgbọala mechapụ njem ahụ, Bertie na ụmụ anyị jiri ụgbọala gaa ihe dị ka kilomita 400 ruo Blantyre. Otu onye ikwu anyị mere ndokwa ka m jiri ụgbọelu gakwuru ha n’ebe ahụ mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị. Ejiri m ụgbọelu si Blantyre laghachi Salisbury, Bertie na ụmụ anyị jikwara ụgbọala mechapụ njem ahụ ruo n’ebe obibi anyị.

Lee ahụ iru ala anyị nile nwere irute Salisbury n’ụlọ nwa anyị nwanyị bụ́ Pauline na di ya! A mụrụ nwa anyị nke ikpeazụ bụ́ Andrew na 1963. Akpa ume ya adịghị arụ ọrụ nke ọma, a tụghịkwa anya na ọ ga-adị ndụ, ma dị ka ihe ndabara ọma, ọ nwụghị. N’ikpeazụ, anyị kwagara South Africa ma mesịa biri na Pietermaritzburg.

E Jiri Ezinụlọ Na-ahụ n’Anya Gọzie M

Bertie nwụrụ n’udo mgbe ọ dị afọ 94 na 1995, kemgbe ahụ kwa ebi m nanị m n’ụlọ anyị ebe a. Ma ọ dịtụghị otú m si nọrọ nanị m! Lyall na Pauline na ezinụlọ ha na-ejere Jehova ozi na South Africa ebe a, ụfọdụ n’ime ha bikwa kpọmkwem na Pietermaritzburg ebe a. Lindsay na ezinụlọ ya nọ na California, U.S.A., bụ́ ebe ha nile nọ dị ka Ndịàmà kwụsiri ike. Ụmụ anyị ndị ikpeazụ abụọ, bụ́ Jeremy na Andrew, kwagara Australia, bụ́ ebe ha abụọ nọ na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha ma na-eje ozi dị ka ndị okenye n’ọgbakọ ha dịgasị iche.

Ụmụ anyị asatọ nile ekerewo òkè n’otu oge n’ịsụ ụzọ, isii ejewokwa ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society. Donovan gụsịrị akwụkwọ na klas nke 16 n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na February 1951 ma jee ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na United States tupu ọ lọghachi ịrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na South Africa. Ugbu a ọ bụ onye Kraịst bụ́ okenye na Klerksdorp, ihe dị ka kilomita 700 site na Pietermaritzburg. Estrella na di ya bụ́ Jack Jones, bi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York.

Ọkpara m bụ́ Peter, tinyere afọ ụfọdụ n’ozi oge nile, ma n’ọrụ ịsụ ụzọ ma n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower dị na Rhodesia. Otú ọ dị, afọ ole na ole gara aga, o wutere m mgbe o kewapụrụ onwe ya n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị.

N’ileghachi anya azụ ná ndụ m, apụrụ m ikwu na enwere m obi ụtọ n’ezie na m sooro mama m jee Africa mgbe m bụ onye nọ n’afọ iri na ụma. N’ezie, ndụ adịbeghị mfe mgbe nile, ma ọ bụụrụ m ihe ùgwù ịkwado di m na ịzụlite ezinụlọ nke nyeworo aka n’ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe ndịda Africa.—Matiu 24:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akụkọ Robert McLuckie kọrọ banyere onwe ya dị n’Ụlọ Nche nke February 1, 1990, peji nke 26-31.

b Lee peji nke 11 nke broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.

[Map dị na peeji 14, 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SOUTH AFRICA

Cape Town

Pietermaritzburg

Klerksdorp

Johannesburg

Pretoria

ZIMBABWE

Gwanda

Bulawayo

Filabusi

Gweru

Mutare

Harare

ZAMBIA

MOZAMBIQUE

MALAWI

Blantyre

Lilongwe

TANZANIA

Dar es Salaam

Tanga

KENYA

Mombasa

SEYCHELLES

Àgwàetiti Cerf

SOMALIA

[Foto dị na peeji nke 12]

Mụ na Peter, Pauline, na Estrella, tupu m kpọrọ Estrella gaa mkpọrọ

[Foto dị na peeji nke 13]

Lyall na Donovan n’ihu ụlọ anyị dị n’ugbo a na-azụ anụ ụlọ nke dị nso na Filabusi

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na Bertie, Lyall, Pauline, Peter, na Donovan na 1940

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Carmen na ụmụ ya ise (site n’aka ekpe gaa n’aka nri): Donovan, mgbe ọ nọ na Gilead na 1951, na Jeremy, Lindsay, Estrella, na Andrew taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya