Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 17-19
  • Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Ime Ihere
  • Ihere—Nsogbu A Na-enwekarị
  • Ajọ Ihe Na-akpata Ọzọ
  • Ihe Ndị Ọzọ Na-akpata Ya
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Omume Enyi Karị?
    Teta!—1999
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịna-eme Ihere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ị̀ Bụ Onye Ihere?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 11/8 p. 17-19

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?

“Ihere na-anapụ mmadụ ike. Ọ bụ oké egwu nke ị na-aghaghị ịlụso ọgụ. Ọ na-eme nnọọ eme.”—Richard.a

“Enwere m ezigbo nsogbu nke ime ihere mgbe m ka na-etolite etolite. Ọ dị nnọọ ka m nọọrọ nke m iche.”—Elizabeth dị afọ 18.

‘Ọ̀ DỊ ihe na-eme m? Gịnị mere apụghị m inwe omume enyi karị?’ Ị̀ na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị a mgbe ụfọdụ? Dị ka Richard, bụ́ onye e hotara okwu ya n’elu, ị pụrụ ịdị na-enwe ahụ erughị ala ma ọ bụ na-atụ egwu mgbe i zutere onye ị na-amabughị. Egwu pụrụ ịdị na-atụ gị ma gị na ndị isi nọrọ. Ma ọ bụ ikekwe ị na-echegbu onwe gị nke ukwuu banyere ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị nke na mgbe e nyere gị ohere ikwupụta mmetụta ma ọ bụ echiche gị, ị gbachie nkịtị. “N’ezie, ọ na-esiri m ike ịga gwa ndị m na-amachaghị okwu,” ka Tracey na-eto eto na-ekweta.

Gịnị na-akpata nnọọ mmetụta ndị dị otú ahụ? Ịghọta nsogbu ahụ pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ n’imeri ya. (Ilu 1:5) Otu nwanyị kwuru, sị: “Amatụghị m ihe mere na ahụ adịghị eru m ala ma mụ na ndị mmadụ nọrọ. Ma ugbu a m chọpụtarala ihe bụ nsogbu m, m pụrụ ime ihe banyere ya.” Ya mere ka anyị tụlee ihe ole na ole mere ọ pụrụ iji na-esiri ndị ntorobịa ụfọdụ ike inwe omume enyi.

Nsogbu Ime Ihere

Ikekwe ọ bụ ihere kasị akpata ya. Ọ bụ ezie na onye ntorobịa nwere omume enyi na-enwekarị ụdị enyi dị iche iche, onye ntorobịa na-eme ihere, nke na-adịghị eru mmadụ nso pụrụ inwe owu ọmụma ma nwee mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ iche. “Enwere m ezigbo nsogbu nke ime ihere mgbe m na-etolite etolite,” ka Elizabeth dị afọ 18 na-ekwu. “Ọ dị nnọọ ka m nọọrọ nke m iche.” Diane na-echeta nchekasị o nwere n’afọ mbụ ya na kọleji. “Ọ dịghị amasị m mmadụ ịhụchata m. Otu onye nkụzi m sịrị ka anyị kwuo otú anyị chere na ịbụ onye a ma ama dịruru ná mkpa. N’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke malitere na 0 ruo 5, 0 pụtara na ọ dịghị mkpa ma ọlị, 5 pụtakwara na ọ dị mkpa. Ụmụ agbọghọ nile a ma ama n’ụlọ akwụkwọ ahụ dere 5. Edere m 0. Nye m, ihere fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ịtụ ịbụ onye a ma ama egwu. Ị dịghị achọ ka a hụchata gị ma ọ bụ bụrụ onye mmadụ nile na-ele anya n’ihi na ị na-atụ egwu na ndị ọzọ nwere ike ha agaghị enwe amasị n’ebe ị nọ.”

N’ezie, àgwà imetụ ihere adịchaghị njọ. Ihe ya na ime ihere nwere njikọ chiri anya bụ obi umeala—ịma ebe ike anyị ruru. N’ezie e nyere anyị iwu na Bible ka anyị ‘jiri obi umeala soro Chineke anyị na-eje ije.’ (Maịka 6:8) Ọ pụrụ ịdị mfe karị ịnọ n’ebe onye dị obi umeala ma ọ bụ onye na-emetụ ihere nọ karịa n’ebe onye na-atụ ụka, na-achọ okwu, ma ọ bụ onye na-achọkarị ihe n’aka mmadụ nọ. Ọ bụkwa ezie na e nwere “mgbe ikwu okwu,” e nwekwara “mgbe ịgba nkịtị.” (Eklisiastis 3:7) O nwere ike ọ gaghị esiri ndị na-eme ihere ike ịgba nkịtị. Ebe ha na-abụkarị ndị “na-anụ ihe ọsọ ọsọ [ma bụrụ ndị] na-adịghị ngwa ikwu okwu,” ndị ọzọ na-enwekarị mmasị n’ebe ha nọ n’ihi ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma.—Jemes 1:19.

Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe onye ntorobia na-adị nnọọ nwayọọ, na-eme nnọọ ihere, ma ọ bụ nwee nnọọ ahụ erughị ala nke na ọ na-esiri ya ike imeta enyi. N’ọnọdụ ụfọdụ dị oké njọ, ime ihere pụrụ ịkpata ihe otu onye edemede kpọrọ “otu ụdị nsogbu uche nke ịtụ onwe onye mkpọrọ”—ikewapụ onwe onye n’ebe ọha na eze nọ.—Ilu 18:1.

Ihere—Nsogbu A Na-enwekarị

Ọ bụrụ na ị na-eme ihere, mata na ọ bụ nnọọ nsogbu a na-enwekarị. N’otu nnyocha e mere ụmụ akwụkwọ kọleji na nke mahadum, “pasent 82 nke ụmụ akwụkwọ ahụ weere onwe ha dị ka ndị ihere n’otu oge ná ndụ ha.” (Adolescence, nke Eastwood Atwater dere) Ihere bụ nsogbu ụfọdụ ndị nwere ọbụna n’oge Bible. Ndị ikom a ma ama, dị ka Mosis na Timoti, pụrụ ịbụworị na ha lụsoro ya ọgụ.—Ọpụpụ 3:11, 13; 4:1, 10, 13; 1 Timoti 4:12; 2 Timoti 1:6-8.

Tụlee Sọl, bụ́ eze mbụ nke mba oge ochie bụ́ Israel. Sọl bụ nwoke nwere obi ike. Mgbe ìgwè anụ nna ya furu, Sọl jiri obi ike gawa ịnapụta ha. (1 Samuel 9:3, 4) Ma mgbe a họpụtara ya ịbụ eze mba ahụ, ihere jidere ya na mberede. Kama iche ìgwè mmadụ ahụ na-etiri ya mkpu nkwado ihu, Sọl zoro n’ime ibu!—1 Samuel 10:20-24.

Enweghị obi ike pụtara ìhè nke Sọl pụrụ iyi ihe dị mgbagwoju anya. E kwuwerị, Bible kọwara ya dị ka nwa okorobịa mara mma. Leenụ, “site n’ubu ya wee ruo elu isi ya ka ọ dị ogologo karịa onye ọ bụla n’ime ndị Israel”! (1 Samuel 9:2) Ọzọkwa, onye amụma Chineke emesiwo Sọl obi ike na Jehova ga-agọzi ọchịchị ya dị ka eze. (1 Samuel 9:17, 20) N’agbanyeghị nke ahụ, Sọl ejighị onwe ya n’aka. Mgbe a gwara ya na ọ ga-abụ eze, o jiri obi umeala zaghachi, sị: “Ọ́ bụghị onye Benjamin ka m bụ, sitere n’ebo Israel nke dịkarịsịrị nta? Agbụrụ m, ó pekarịsịghị mpe n’etiti agbụrụ nile nke ebo Benjamin? N’ihi gịnịkwa ka ị gwaworo m okwu dị ka okwu a si dị?”—1 Samuel 9:21.

Ọ bụrụ na onye di ka Sọl pụrụ ịghara inwe obi ike onwe onye, ọ bụghị ihe ijuanya na o nwere ike ị gaghị enwe obi ike mgbe ụfọdụ. Dị ka onye na-eto eto, ị nọ n’oge ndụ mgbe ahụ gị na-agbanwe ngwa ngwa. Ị ka na-amalite ịmụta otú ị ga-esi na-eme ihe n’etiti ndị toworo eto. Mgbe ahụ, ọ bụ nanị ihe dị otú o kwesịrị gị inwetụ echiche nke ahụ erughị ala na nke enwereghị onwe gị mgbe ụfọdụ. Dr. David Elkind dere na magazin bụ́ Parents, sị: “Ná mmalite oge uto, ihe ka n’ọtụtụ ndị na-eto eto na-agabiga oge ime ihere, bụ́ mgbe ha na-eji uche ha ahụ ihe m ga-asị na ọ bụ ìgwè mmadụ na-adịghị adị—nkwenkwe nke bụ́ na ndị ọzọ na-ele ha anya, na-enwekwa nchegbu dị ukwuu banyere ọdịdị na omume ha.”

Ebe ndị na-eto eto bụ ndị ndị ọgbọ ha na-atụle ọdịdị ha, ọtụtụ na-ewe iwe n’ihi ọdịdị ha. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 10:7.) Otú ọ dị, mmadụ inwebiga nchegbu ókè banyere ọdịdị ya adịghị mma. Otu nwa agbọghọ na France aha ya bụ Lilia na-echeta ahụmahụ o nwere n’ihe banyere nke a: “Enwere m nsogbu ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe. Enwere m ọrịa akpụkpọ ahụ—pịmpụl! Ị gaghị anwa anwa ijekwuru ndị ọzọ n’ihi na ị na-echegbu onwe gị banyere otú ị dị n’ile anya.”

Ajọ Ihe Na-akpata Ọzọ

Ebe ọ bụ na a na-aghọtahiekarị ndị na-eme ihere, ọ pụrụ ịdị mfe ịmanye ha ịnọgide na-ekewapụ onwe ha iche. Akwụkwọ bụ́ Adolescence na-ekwu, sị: “Ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị ihere na-aka enwe nsogbu imeta ndị enyi n’ihi na ndị ọzọ na-aghọtahiekarị ha n’ụzọ na-adịghị mma. A na-elekarị ndị na-eme ihere anya dị ka ndị na-anọpụ iche, ndị ihe na-agwụ ike, ndị na-enweghị mmasị, ndị na-ewetu onwe ha ala, ndị na-enweghị omume enyi, na ndị obi ọjọọ. E mesoo ha ihe otú ahụ, ha pụrụ inwekwu mmetụta nke ịbụ ndị e kewapụrụ iche, nwee owu ọmụma, daakwa mbà n’obi.” N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, nke a na-eme ka ha na-eme ihere ọbụna karị, bụ́ nke na-emekwu n’ezie ka a na-aghọtahie ha dị ka ndị dị nganga ma ọ bụ ndị onwe ha juru afọ.

Otú ọ dị, ebe ọ bụ na dị ka onye Kraịst ị bụ “ihe nkiri nye ụwa,” i kwesịrị ichebara mmetụta ị na-eme ka ndị ọzọ nwee echiche. (1 Ndị Kọrint 4:9) Ị̀ na-ele anya ebe ọzọ mgbe ị na-agwa ndị ọzọ okwu? Àgwà gị na mmegharị ahụ gị ọ̀ na-egosi na ị chọrọ ka a ghara inye gị nsogbu? Mgbe ahụ, mata na ndị ọzọ pụrụ ịghọtahie gị ma na-achọ izere gị. Nke a pụrụ ime ọbụna ka o sikwuo ike imeta enyi.

Ihe Ndị Ọzọ Na-akpata Ya

Nsogbu ọzọ a na-enwekarị bụ ịtụ enweghị ihe ịga nke ọma egwu. N’eziokwu, ọ bụ kpọmkwem ihe dị otú o kwesịrị inwetụ mmetụta nke enwereghị onwe gị ma ọ bụ inwetụ obi abụọ mgbe ị na-eme ihe ọhụrụ, na-abụghị ihe ị na-emebu. Ma ụfọdụ ndị ntorobịa na-emebiga ihe ókè n’akụkụ a. Dị ka onye ntorobịa, Gail bụ ihe ọ kpọrọ onye na-atụ ọha na eze egwu. Ọ na-ekwu, sị: “Adịghị m ekwu okwu na klas. A na-agwakarịkwa nne na nna m ihe dị ka, ‘Ọ dịghị eweli aka. Ọ dịghị ekwu okwu.’ Nye m, ahụ adịghị eru m nnọọ ala ime ya, ọ na-akpatakwara m nchegbu. Ị̀ makwa na, ọbụna ruo ugbu a ọ ka na-esiri m ike.” Ịtụ enweghị ihe ịga nke ọma egwu pụrụ ịnapụ mmadụ ike. “Ana m echegbu onwe m banyere imehie ihe,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Peter na-ekwu. “N’eziokwu, ejighị m ihe m na-eme n’aka.” Akaje na nkatọ ọjọọ nke ndị ọgbọ pụrụ ime ka mmadụ tụọ egwu karị ma mebie obi ike onwe onye nke onye ntorobịa kpam kpam.

Enweghị nkà ndị e ji eme ihe n’etiti ọha na eze bụ nsogbu ọzọ a na-enwekarị. Ikekwe ị na-ala azụ ịkọwara onye ị na-amabughị onwe gị, nanị n’ihi na ị maghị ihe ị ga-ekwu. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmata na ọbụna ndị meworo okenye adịghị enwe ahụ iru ala mgbe ụfọdụ n’etiti ọha na eze. Otu ọchụ ntá ego aha ya bụ Fred na-ekwu, sị: “N’azụmahịa, amaara m otú m ga-esi mee ihe m na-eme ka ọ dị nnọọ mma. M na-ekwu nnọọ banyere azụmahịa, adịghị m enwe obi abụọ ma m ga-enwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị mmadụ. Ma mgbe mụ na otu ndị ahụ malitere mkparịta ụka nkịtị, ọ dịghị ekwecha m. A pụrụ iwere m dị ka onye na-agwụ ike ma ọ bụ onye oké akwụkwọ ma ọ bụ onye na-esi ike nghọta ma ọ bụ onye na-adịghị amasịkarị ndị ọzọ.”

Ma ị̀ na-eme ihere, ghara iji onwe gị n’aka, ma ọ bụ na-enwe nanị ahụ erughị ala n’etiti ọha na eze, ọ ga-abara gị uru ịmụta otú ị ga-esi nwee omume enyi karị. Bible na-agba ndị Kraịst ume ‘ịdị obodobo n’obi’ na ịmata ndị ọzọ! (2 Ndị Kọrint 6:13) Ma olee otú ị pụrụ isi mee ya? A ga-atụle nke a ná mbipụta na-abịa n’ihu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 18]

A na-echekarị na ndị na-eme ihere na-anọpụ iche

[Foto dị na peeji nke 18]

Ịtụ enweghị ihe ịga nke ọma egwu na-eme ka ụfọdụ ndị ntorobịa kewapụ onwe ha n’ebe ọha na eze nọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya