Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/06 p. 8-9
  • Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Ahụ
  • Teta!—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya Dịịrị Ọbụna Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Ile Ndị Ọbịa Anya Nke Ọma Ewetara Malta Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe E Ji n’Aka Ga-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Lee! Ana M Eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2006
g 4/06 p. 8-9

Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Ahụ

ỌRỊA cancer na-achọ igbu Joe. Nwunye ya bụ́ Kirsten, na ụfọdụ ndị enyi ha nọ na-ekwurịta okwu n’akụkụ ebe Joe dina. Kirsten elee di ya anya ma hụ na anya mmiri na-agba ya. Ihe mbụ gbatara ya n’obi bụ na ahụ́ na-egbu Joe mgbu. Ikekwe, ahụ́ na-egbu ya mgbu, ma na nke ugbu a, o mere ka nwunye ya mara na ọ bụghị ahụ́ mgbu mere anya mmiri ji agba ya.

Kirsten kwuru, sị, “N’oge a ihe siiri Joe ike, ezi ndị enyi ya bịara gbaa ya gburugburu. Ọzọkwa, o nwere olileanya dị oké ọnụ ahịa nke obi siri ya ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ na ọ ga-eru ya aka, ọ makwaara na o nweghị onye pụrụ ịnapụ ya olileanya a. Ọ gwara m na, n’ezie, anya mmiri ya ahụ bụ nke ọṅụ. Joe mesịrị nwụọ n’abalị ahụ.”

Olee olileanya Joe nwere nke mere ka obi sie ya ike mgbe ahụ ọrịa ya kawanyere njọ? Ọ bụ olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ahụ́ zuru oké n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs, bụ́ nke Jehova Chineke kwere nkwa ya. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29) Mkpughe 21:3, 4 na-ekwu, sị: “Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ [nke gụnyere ọtụtụ nsogbu ndị anyị na-ahụ taa] agabigawo.”

Olileanya Dịịrị Ọbụna Ndị Nwụrụ Anwụ

Ka Joe wee nweta ihe ahụ ọ na-atụ anya ya, ọ ghaghị isi n’ọnwụ bilie. N’ezie, ihe kasiri ya obi bụ nkwa Jizọs ahụ bụ́ na “ndị nile nọ n’ili ncheta”—ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nke Chineke na-echeta—ga-esi n’ụra ọnwụ bilie. (Jọn 5:28, 29) Ị̀ na-enwe obi ilu n’ihi na onye òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị nwụnahụrụ gị? Ya bụrụ otú ahụ, olileanya nke mbilite n’ọnwụ pụkwara ịkasi gị obi. N’ezie, olileanya a adịghị eme ka ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya kwụsị iwute anyị. “Anya mmiri gbara” Jizọs n’onwe ya mgbe enyi ya Lazarọs nwụrụ. Ma olileanya anyị nwere na-eme ka újú anyị na-eru belata.—Jọn 11:14, 34, 35; 1 Ndị Tesalonaịka 4:13.

Kirsten kwuru, sị, “Mgbe ọrịa cancer ahụ gburu Joe, ọ bịara dị m ka agaghịzi m enwetali ezigbo obi ụtọ ná ndụ. Ọbụna ugbu a afọ ole na ole gafecharala, ana m achọpụta na ndụ m n’usoro ihe a agaghịzi adị otú ọ dị mgbe Joe nọ ndụ. Agaghị m echefu ọnwụ Joe echefu. N’agbanyeghị nke ahụ, apụrụ m ikwu n’ezie na enwetaghachila m ahụ́ iru ala na afọ ojuju.”

Ihe ahụ Kirsten kwuru na-echetara anyị na n’usoro ihe a, anyị apụghị ịtụ anya inwe ọṅụ mgbe nile ná ndụ. A na-enwe oge ọma na oge ọjọọ ná ndụ. E nwekwara oge anyị kwesịrị ịnọ ná mwute, mgbe anyị na-ekwesịtụghị inwe ọṅụ. (Eklisiastis 3:1, 4; 7:2-4) Ọzọkwa, ụfọdụ n’ime anyị pụrụ ịbụ ndị dara mbà n’obi, e nwekwara ọtụtụ ihe pụrụ ịkpata ya. Ma, nkwa Bible na-akasi anyị obi nke ukwuu, amamihe na-enweghị atụ anyị na-achọta na Bible pụkwara inyere anyị aka izere ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-eme ka mmadụ ghara inwe obi ụtọ. Chineke kwuru, sị: “Onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.”—Ilu 1:33.

N’ezie, Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị nnọọ mma. Ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ—ọ bụghị obi ụtọ elu ọnụ, kama nke ga-eru anyị n’ụmị, ọ bụghịkwa ruo afọ ole na ole, kama ruo mgbe ebighị ebi! N’ihi ya, Ọkpara ya kwuru okwu a bụ́ eziokwu mgbe nile, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Anyị ga-abụ ndị maara ihe ma anyị buru okwu ya a n’obi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ihe Itoolu Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ

1. Jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ná ndụ.—Matiu 5:3.

2. Nwee afọ ojuju, ma jụ “ịhụ ego n’anya.”—1 Timoti 6:6-10.

3. Debe ihe ụtọ n’ọnọdụ ha.—2 Timoti 3:1, 4.

4. Na-emesapụ aka, ma na-agba mbọ ime ka ndị ọzọ nwee obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.

5. Na-enwe ekele, ma na-agbakọ uru ndị ị na-erite ná ndụ.—Ndị Kọlọsi 3:15.

6. Nwee obi ịgbaghara mmadụ ihe.—Matiu 6:14.

7. Jiri amamihe họrọ ndị gị na ha ga na-akpakọrịta.—Ilu 13:20.

8. Na-elezi ahụ́ gị anya, ma zere itinye aka n’omume ọjọọ.—2 Ndị Kọrint 7:1.

9. ‘Na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ’ Bible mere ka i nwee.—Ndị Rom 12:12.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Olileanya ahụ dabeere na Bible nke bụ́ ibi ndụ n’ime ụwa ọhụrụ bụ nnọọ ihe nkasi obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya