Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 2 p. 8-9
  • 2. Ọ̀ Bụ Anyị Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2. Ọ̀ Bụ Anyị Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
  • Ihe Ị Ga-echebara Echiche
  • Ihe Baịbụl Kwuru
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2020
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • 4. È Kere Anyị Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?
    Teta!—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 2 p. 8-9
Ebe otu nwoke nọ ọdụ n’ụlọ ya, jiri sịga n’otu aka, jirikwa mmanya n’aka nke ọzọ.

2. Ọ̀ Bụ Anyị Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si N’aka?

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya

Ọ bụrụ na azịza ajụjụ a bụ ee, ọ pụtara na anyị nwere ike ibelata ahụhụ anyị na-ata.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche

Olee otú ụmụ mmadụ si soro na-akpata ahụhụ?

  • Aka a kwụkwụwara akwụkwụwa, nke na-egosi iti mmadụ ihe.

    Imeso Mmadụ Ihe Ike na Imetọ Ụmụaka.

    Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na e mesoro otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla ihe ike n’oge ọ bụ nwata. Ha kwukwara na e mesoro otu onye n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla ihe ike ma ọ bụ metọọ ya ma ọ bụkwanụ mee ya ha abụọ n’otu oge ná ndụ ya.

  • Ili dị iche iche nke na-egosi ebe a na-eli mmadụ.

    Ọnwụ Mmadụ.

    Ihe Òtù Mba Ụwa bipụtara nke a na-akpọ World Health Statistics nke afọ 2018 kwuru na “e gburu ihe dị ka narị puku mmadụ anọ na puku iri asaa na asaa n’ụwa niile n’afọ 2016.” Ndị nwụrụ n’agha na n’ọgba aghara n’afọ ahụ dịkwa ihe dị ka otu narị puku na puku iri asatọ.

  • Ihe na-egosi obi mmadụ ahụ́ na-adịghị.

    Ọrịa.

    N’otu isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ National Geographic, otu nwoke na-ede akwụkwọ aha ya bụ Fran Smith kwuru na ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-aṅụ sịga, na ịṅụ sịga sokwa akpata ọrịa ndị kacha egbu ndị mmadụ n’ụwa niile, ya bụ, ọrịa obi, ọrịa strok, ọrịa iku ume, na ọrịa kansa akpa ume.

  • Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-ezighị ezi nke na-egosi na aka ahaghị otu.

    Ịda Ogbenye na Mmegbu.

    Otu nwoke mụrụ banyere akparamàgwà mmadụ aha ya bụ Jay Watts kwuru, sị: “Ịda ogbenye, mmegbu, ịkpa ókè agbụrụ, imegbu ndị inyom, ịkwaga mba ọzọ n’ihi nsogbu na ịmarịta aka socha n’ihe ndị na-akpata nchegbu na ụra aga n’anya.”

    MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

    Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa? Ọ dị na jw.org.

Ihe Baịbụl Kwuru

Ebe nwoke ahụ ji sịga n’otu aka, jirikwa mmanya n’aka nke ọzọ nọzi n’ụlọ ọgwụ. Ebe nwunye ya tụgharịrị pụwa mgbe dọkịta gwara ya ihe na-agbawa obi banyere ahụ́ di ya.

Ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata ọtụtụ ahụhụ a na-ata n’ụwa taa.

Ọtụtụ n’ime ahụhụ ndị ahụ si n’aka ndị ọchịchị ọjọọ ndị na-eme ka ihe na-esiri ndị ha na-achị ike.

‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’​—EKLIZIASTIS 8:9.

Ma, e nwere ike ibelata ahụhụ.

Ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka mmadụ nwee ezi ahụ́ ike, na-emekwa ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma.

“Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́, ma ekworo bụ ure ọkpụkpụ.”​—ILU 14:30.

“Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”​—NDỊ EFESỌS 4:31.

Ọ̀ bụ anyị ka ahụhụ anyị na-ata si n’aka?

Baịbụl kwuru, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Ihe na-akpata ahụhụ ụfọdụ anyị na-ata bụ ụdị mkpebi ndị anyị mere. Ọ bụ ya mere ndị dọkịta ji agwa ndị mmadụ ka ha na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, na-emega ahụ́ ma zere ihe ndị nwere ike imerụ ha ahụ́, dị ka ịṅụ sịga. Ma, ọ bụghị ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata si ha n’aka. E nwere ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha na-enwe ihe mberede okporo ụzọ. E nwekwara ndị nke ọdachi ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-adakwasị.

Gịnị mere ndị ezigbo mmadụ ji ata ahụhụ?

Gụọ ajụjụ nke 3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya