Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 2 p. 10-11
  • 3. Gịnị Mere Ndị Ezigbo Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3. Gịnị Mere Ndị Ezigbo Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
  • Ihe Ị Ga-echebara Echiche
  • Ihe Baịbụl Kwuru
  • 4. È Kere Anyị Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?
    Teta!—2020
  • Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata
    Teta!—2015
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 2 p. 10-11
Ebe otu nne na nna na-ele obere nwa ha nwoke ka o dina n’ụlọ ọgwụ mgbe e gbubichara ya aka.

3. Gịnị Mere Ndị Ezigbo Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya

Obi anaghị adị anyị mma ma anyị hụ ka ndị ezigbo mmadụ na-ata ahụhụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-echezi na ịbụ ezigbo mmadụ enweghị uru ọ bara.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche

Ụfọdụ ndị kweere na a na-alọ ụwa alọ. Ha sịrị na ndị mere ihe ọma na-alọ ụwa ọma, ndị mere ihe ọjọọ alọ ụwa ahụhụ. Ihe nkwenkwe a pụtara bụ na ọ bụrụgodị na mmadụ bụ ezigbo mmadụ ugbu a, ọ ka ga-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ndị o mere n’ụwa ya mbụ.” Ma, . . .

  • Oleekwanụ uru ahụhụ ahụ ga-abara onye ahụ ebe ọ bụ na o nweghị ike icheta ihe ndị o mejọrọ n’ụwa ya mbụ?

  • Ọ bụrụ na ihe na-ekpebi otú ihe ga-adịrị anyị bụ ndụ anyị biri n’ụwa mbụ anyị, gịnịzi mere anyị ji ezere ihe mberede, na-agbalịkwa ka ahụ́ na-adị anyị mma?

    MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

    Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị? Ọ dị na jw.org.

Ihe Baịbụl Kwuru

Ahụhụ anyị na-ata esighị n’aka Chineke.

Kama, ihe na-akpata ọtụtụ n’ime ha bụ mmadụ ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.

“Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha, ọ bụghịkwa ndị maara ihe na-enweta ihe oriri, ọ bụghịkwa ndị nwere nghọta na-enweta akụnụba, ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”​—EKLIZIASTIS 9:11.

Ihe ọzọ mere anyị ji ata ahụhụ bụ n’ihi na anyị bụ ndị mmehie.

A na-ejikarị okwu bụ́ “mmehie” akọwa ihe ọjọọ mmadụ mere. Ma, Baịbụl na-ejikwa okwu a akọwa ọnọdụ anyị niile ketara n’aka nne na nna anyị mbụ, ma ànyị bụ ndị ezigbo mmadụ ma ànyị bụ ndị ajọ mmadụ.

“Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu.”​—ABỤ ỌMA 51:5

Mmehie akpaala ụmụ mmadụ aka ọjọọ.

O meela ka anyị na Onye kere anyị ghara ịdị ná mma, meekwa ka anyị na ihe ndị ọzọ Chineke kere ghara ịdị ná mma. Ihe a akpatarala mmadụ niile ahụhụ n’otu n’otu nakwa n’ozuzu.

“Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.”​—NDỊ ROM 7:21.

“Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”​—NDỊ ROM 8:22.

Gịnị mere ndị ezigbo mmadụ ji ata ahụhụ?

Ihe na-akpata ọtụtụ ahụhụ anyị na-ata bụ n’ihi na anyị niile bụ ndị mmehie, ma ndị ezigbo mmadụ ma ndị ajọ mmadụ. Ọ bụ mmehie na-akpata ọtụtụ nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe, o sokwa n’ihe mere ndị mmadụ ji eme ibe ha ihe ọjọọ.

Ọ̀ bụ otú a ka Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị? È kere anyị ka anyị na-ata ahụhụ?

Gụọ ajụjụ nke 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya