Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 3 p. 4-5
  • Mata nke Bụ́ Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mata nke Bụ́ Eziokwu
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Amaghị nke Bụ́ Eziokwu Nwere Ike Ịkpata
  • Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka
  • Otú Ịma nke Bụ́ Eziokwu Si Enye Aka
  • Ihe I Nwere Ike Ime
  • Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?
    Teta!—2020
  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 3 p. 4-5
Ebe ụmụ nwoke abụọ na-agba otu nwaanyị ajụjụ ọnụ ka ha mara ma ò ruru eru ka ha nye ya ọrụ n’ebe a na-arụ ụgbọala. Nwaanyị ahụ yiri onye ụjọ ji.

Mata nke Bụ́ Eziokwu

Nsogbu Amaghị nke Bụ́ Eziokwu Nwere Ike Ịkpata

Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka mmadụ kpọ onye ọzọ asị bụ ihe na-abụghị eziokwu ọ nụrụ gbasara onye ahụ. Legodị ihe atụ ndị a:

  • Ụfọdụ ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ kwetara na ụmụ nwaanyị agaghị arụli ọrụ ndị chọrọ nkà ma ọ bụ ọrụ ndị siri ike.

  • Na Yurop oge ochie, e boro ndị Juu ebubo na ha tinyere nsí n’olulu mmiri dị iche iche nakwa na ha na-ekesa ọrịa. Mgbe ndị Nazi na-achị, e bokwara ha ebubo ọzọ. E kwuru na ọ bụ ha mere ka ihe isi ike dị na Jamanị. Ebubo abụọ a mere ka a kpọ ndị Juu ezigbo asị. Ruokwa taa, a ka nwere ndị kpọrọ ndị Juu asị n’ihi ebubo ndị ahụ.

  • Ọtụtụ ndị kweere na onye ọ bụla nwere nkwarụ bụ onye iwe.

Ndị kweere ụdị ụgha ndị a nwere ike inye ihe atụ ndị nwere ike ime ka o yie ka ihe ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. Ha na-echekwa na onye ọ bụla na-ekwetaghị na ha amaghị ihe.

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

“Ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na mkpụrụ obi enweghị ihe ọmụma.”—ILU 19:2.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na mmadụ amaghị nke bụ́ eziokwu, o nwere ike ime ka o kweta ihe na-abụghị eziokwu. Anyị kwere ihe na-abụghị eziokwu gbasara ndị mmadụ, anyị ga-ewere ya na ha bụ ndị ajọ mmadụ.

Baịbụl Ọ̀ Na-akwado Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị?

Ụfọdụ na-ekwu na Baịbụl na-akwado ịkpọasị. Ma, gịnị ka Baịbụl na-akụzi?

  • Mmadụ niile si n’otu mmadụ: Chineke “sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla.”—Ọrụ Ndịozi 17:26.

  • Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  • Chineke na-ele ihe mmadụ bụ n’ime, ọ bụghị otú ọ dị n’ile anya: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”—1 Samuel 16:7.a

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

Otú Ịma nke Bụ́ Eziokwu Si Enye Aka

Ọ bụrụ na anyị mata nke bụ́ eziokwu gbasara ndị mmadụ, anyị agaghị ekweta ihe ndị bụ́ ụgha ndị ọzọ nwere ike ịna-ekwu gbasara ha. Ozugbo anyị chọpụtara na ihe anyị nụrụ gbasara otu agbụrụ abụghị eziokwu, o nwere ike ime ka anyị jụọ onwe anyị ma ihe anyị kweere gbasara agbụrụ ndị ọzọ ọ̀ bụ eziokwu.

Akụkọ Mere Eme: Jovica (Yurop)

Mgbe Jovica anyị kwuburu okwu ya na-eto eto, ọ na-anụ ka ndị obodo ha na-ekwu okwu ọjọọ gbasara otu agbụrụ n’obodo ha. Ọ na-anụkwa ya na redio nakwa na tiivi. O kwuru, sị: “M bịara na-ele ndị agbụrụ ahụ anya ọjọọ, kpọkwa ha asị. M chekwara na otú a m si ele ha anya adịghị njọ.

“Ma, mgbe m ghọrọ onye amị, ọ dabara na mụ na ndị amị si n’agbụrụ ahụ bi otu ebe, na-arụkọkwa ọrụ. Ka oge na-aga, m matakwuru ha nke ọma. M malitedịrị ịmụ asụsụ ha, na-egekwa egwú ha. Ihe malitere dabawara mụ na ha, mụ agbanwee otú m si ele ha anya. Ma, ama m na m nwere ike ịmalitekwa lewe ha anya ọjọọ. N’ihi ya, anaghị m ekwe ege akụkọ na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị agbụrụ ahụ. Anaghịkwa m ele fim ma ọ bụ soro m chịa a na-akwa ha emo na ya. Ama m na ile mmadụ anya ọjọọ nwere ike ịkpata iwe na ịkpọasị.”

Ihe I Nwere Ike Ime

  • E nwere ike inwe otu agbụrụ ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere àgwà na-adịghị mma. Ma, cheta na ọ bụghị mmdụ niile si n’agbụrụ ndị ahụ nwere àgwà ọjọọ ahụ.

  • Cheta na e nwere ike ị machaghị ihe niile gbasara ndị ọzọ.

  • Gbalịa si n’ebe a tụkwasịrị obi chọpụta nke bụ́ eziokwu.

Ha kwụsịrị ịkpọ ibe ha asị

Foto Ndị Na-egosi: 1. Ebe ụmụ nwoke abụọ na-aga ije ma na-akparịta ụka. 2. Ebe otu n’ime ha na-amụmụ ọnụ ọchị ebe ya na ndị enyi ya nọ.

Gịnị nyeere onye Arab na onye Juu aka ịkwụsị ịkpọ ibe ha asị?

Lee vidio isiokwu ya bụ Olee Mgbe Ezigbo Ịhụnanya Ga-eme Ka Ịkpọasị Laa Kpamkpam? Chọọ vidio a na jw.org/ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya