Julaị
Satọdee, Julaị 1
E mechaa, [ịdọ aka ná ntị] na-abara ndị e ji ya zụọ ezigbo uru. Ha ga na-eme ezi omume, obi eruokwa ha ala.—Hib. 12:11.
Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ so ná nhazi Jehova mere n’ọgbakọ ya. Ọ na-abara ma onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ uru. Ụfọdụ ndị n’ọgbakọ nwere ike ịna-akatọ mkpebi e mere ịchụpụ onye mere mmehie n’ọgbakọ. Ma cheta na ọtụtụ mgbe, ndị ahụ na-ekwu otú ahụ anaghị achọ ikwu ihe ọjọọ onye ahụ mere. Anyị amachaghị ihe niile merenụ. N’ihi ya, o kwesịrị ka anyị tụkwasị ndị okenye obi na ha gbalịrị ike ha iji ihe Baịbụl kwuru ‘kpeere Jehova ikpe. (2 Ihe 19:6) Ọ bụrụ na anyị akwadoo mkpebi ndị okenye mere ịchụ onye anyị hụrụ n’anya n’ọgbakọ, o nwere ike inyere ya aka imecha lọghachikwute Jehova. Nwanna Nwaanyị Elizabeth sịrị: “O siiri anyị ezigbo ike anyị na nwa anyị nwoke ịkwụsị ịna-emekọrịta ihe. Ma, mgbe ọ lọghachikwutere Jehova, o kwuru na ọ dị mma na a chụrụ ya n’ọgbakọ. O mechara kwuo na ya mụtara ọtụtụ ihe ndị baara ya uru.” w21.09 28-29 ¶11-12
Sọnde, Julaị 2
O wee hụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ tụnyere obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.—Luk 21:2.
Chee gbasara nwaanyị ahụ di ya nwụrụ. O doro anya na ọ ga-adị ya ka ya bụrụ na o nwekwuru ihe ọ ga-enye Jehova. Ma, o mere ihe ọ ga-emeli. O nyere Jehova ihe kacha mma o nwere. Jizọs makwa na Jehova ji onyinye a nwaanyị a nyere kpọrọ ihe. Otu ihe dị mkpa anyị ga-amụta n’akụkọ a bụ na obi na-adị Jehova ezigbo ụtọ ma anyị na-enye ya ihe kacha mma anyị nwere, ya bụ, ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi. (Mat. 22:37; Kọl. 3:23) Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-eme ike anyị niile n’ozi ya. Obi na-adịkwa ya ụtọ maka oge na ike anyị na-eji eme ihe gbasara ofufe ya, dị ka ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ị mụtara n’akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Chee gbasara otu onye i nwere ike iji akụkọ a mee ka obi sie ike na Jehova ji ihe niile ọ na-eme n’ofufe ya kpọrọ ihe. O nwere ike ịbụ nwanna nwaanyị merela agadi obi ya na-ama ikpe ma ọ bụ na-eche na o nweghịzi uru ọ bara n’ihi na ọ naghị emelizi ihe ndị ọ na-emebu n’ofufe Jehova n’ihi ọrịa ma ọ bụ na ike anaghịzi adị ya. w21.04 6 ¶17, 19-20
Mọnde, Julaị 3
Onye na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enwe obi ụtọ, n’ihi na o dichaa ọnwụnwa ahụ, Jehova ga-enye ya ndụ.—Jems 1:12.
Jehova ma oge kacha mma ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ndidi ya emeela ka oké ìgwè mmadụ dị ọtụtụ nde nwee ike ịbịa fewe ya ma na-eto ya. Ha nwere ezigbo obi ụtọ na Jehova nwere ndidi ka a mụọ ha, ha amụta banyere ya, hụ ya n’anya, nyefeekwa ya onwe ha. Mgbe ọtụtụ nde mmadụ tachiri obi ruo ọgwụgwụ, Jehova enyekwa ha ụgwọ ọrụ ha, ka ọ ga-edo anya na ndidi Jehova bara uru. N’agbanyeghị nsogbu niile Ekwensu kpatara, Jehova ka bụkwa “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Anyị nwekwara ike iji obi ụtọ na-eche ruo mgbe Jehova ga-eme ka e doo aha ya nsọ, mee ka a mata na ọ bụ yanwa ka o ruuru ịchị, bibie ndị ọjọọ niile, meekwa ka nsogbu anyị niile kwụsị. Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-atachi obi ma nwee obi ike n’ihi na anyị ma na Nna anyị nke eluigwe na-atachikwa obi. w21.07 13 ¶18-19
Tuzdee, Julaị 4
Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?—Jọn 1:46.
Ọtụtụ ndị n’oge Jizọs ekweghị na ya. N’anya ha, Jizọs bụ naanị nwa ọkwá nkà. Ọ bụkwa onye Nazaret bụ́ obodo a na-ejighị kpọrọ ihe. Nataniel bụ́ onye mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs jụdịrị, sị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” O nwekwara ike ịbụ na o bu amụma ahụ e buru na Maịka 5:2 n’obi, ebe kwuru na ọ bụ na Betlehem ka Mesaya ga-esi pụta, ọ bụghị Nazaret. Aịzaya onye amụma buru amụma na ndị iro Jizọs agaghị echegbu onwe ha “banyere ihe niile mere n’ọgbọ” Mesaya ahụ. (Aịza. 53:8) Ọ bụrụ na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ha gaara ahụ na e buru amụma na a ga-amụ Jizọs na Betlehem nakwa na ọ ga-esi n’agbụrụ Eze Devid. (Luk 2:4-7) N’ihi ya, a mụrụ Jizọs n’ebe ahụ e buru amụma ya na Maịka 5:2. Oleezi ihe bụ́ nsogbu? Ọ na-adịkarị ndị mmadụ ngwa ngwa ikwubi ihe. Ha aghọtaghị ihe niile merenụ. Ọ bụ ya mere ha ji sụọ ngọngọ. w21.05 2-3 ¶4-6
Wenezdee, Julaị 5
Ọ bụrụ na onye ezi omume . . . baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.—Ọma 141:5.
E nwere ndị ọzọ Baịbụl kwuru na Chineke gọziri n’ihi na ha nabatara ndụmọdụ e nyere ha. Chegodị gbasara Job. Ọ bụ eziokwu na ọ na-atụ egwu Chineke, o zughị okè. Mgbe ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ya, o nwere ihe ndị na-adịghị mma o kwuru. Ihe a mere ka ma Elaịhu ma Jehova nye ya ndụmọdụ. Gịnị ka Job mere? Ọ sịrị: “M kwuru okwu n’aghọtaghị ihe ndị juru m anya . . . Ekwukwaghị m ihe m kwuru. Anọzi m ọdụ n’ájá nakwa ná ntụ iji gosi na echegharịala m.” (Job 42:3-6, 12-17) Job dị umeala n’obi. Otú o si gosi ya bụ na ọ nabatara ndụmọdụ Elaịhu nyere ya n’agbanyeghị na ọ tọgburu Elaịhu atọgbu. (Job 32:6, 7) Ọ bụrụkwa na anyị adịrị umeala n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ e nyere anyị ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ na anyị tọrọ onye nyere anyị ya. È nwere onye n’ime anyị ọ na-adịghị mkpa ịgba mbọ na-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma na-emekwu nke ọma n’ozi ọma? w22.02 11 ¶8; 12 ¶12
Tọzdee, Julaị 6
Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.—Jọn 13:35.
Ọ bụ ọrụ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ime ka udo na-adị n’ọgbakọ na ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ka owu ghara ịna-ama ha. Ihe anyị na-eme na ihe anyị na-ekwu nwere ike ịgba ndị ọzọ ume. Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ndị ndị ezinụlọ ha na-anọghị n’ọgbakọ aka ka ha mara na ụmụnna hụrụ ha n’anya? Na-emeta ndị ọhụrụ enyi. Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịnabata ndị ọhụrụ n’ọgbakọ anyị. (Rom 15:7) Ma, ọ bụghị naanị ekele ka anyị ga na-ekele ha. Anyị chọrọ ka anyị na ha dịrị n’ezigbo mma. N’ihi ya, gosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi. Gbalịa ka ị ghọta ihe ndị ha na ha na-alụ. Ma, ajụkwala ha ajụjụ ndị ga-emenye ha ihere. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike ikwu ihe dị ha n’obi. N’ihi ya, kpachara anya ka ị ghara ịmanye ha ikwu okwu. Kama, jiri akọ na-ajụ ha ajụjụ ma na-ege ha ntị ma ha zawa ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ onye ahụ otú o si bata n’ọgbakọ. w21.06 11 ¶13-14
Fraịdee, Julaị 7
Ha ga-ege m ntị. Ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.—Jọn 10:16.
Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-efe Jehova ka “otu ìgwè atụrụ” nke nwere “otu onye ọzụzụ atụrụ.” N’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 165, e kwuru, sị: “I kwesịrị ịgba mbọ hụ na o nweghị ihe ga-etisa ịdị n’otu a, ebe ọ bụ na ọ na-abara gị uru.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị “na-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha.” N’anya Jehova, anyị niile bụ ‘ndị dị nta’ bara uru. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ewere ụmụnna gị? Jehova na-ahụ ihe niile anyị na-eme iji nyere ha aka na iji lekọta ha. (Mat. 10:42) Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kpebiri na “anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.” (Rom 14:13) Anyị na-ewere ụmụnna anyị ka ndị ka anyị ukwuu. Anyị chọkwara iji obi anyị niile na-agbaghara ha. Ka anyị ghara ikwe ka ndị ọzọ mee ka anyị sụọ ngọngọ. Kama, “ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo, ka anyị na-emekwa ihe ndị ga-agba ibe anyị ume.”—Rom 14:19. w21.06 24 ¶16-17
Satọdee, Julaị 8
Chineke . . . na-eme ka o too.—1 Kọr. 3:7.
Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe ndị anyị na-amụta na ya, na-emekwa ihe ndị nzukọ ya na-akụziri anyị, anyị ga-eji nke nta nke nta na-akpa àgwà ka Kraịst. Anyị ga-amatakwukwa Chineke nke ọma. Jizọs ji ihe atụ kọwaa otú eziokwu Alaeze anyị na-ekwusa si yie obere mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-eto n’obi ndị chọrọ ime ihe dị mma. Ọ sịrị: “Mkpụrụ ndị ahụ pulitere, tookwa, ma [onye kụrụ ya amaghị] otú o si mee. Mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ si n’ala puo. Akwụkwọ na-ebu ụzọ apụta, oko ya apụtazie. N’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka na-esi n’oko ya apụta.” (Mak 4:27, 28) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na otú ahụ mkpụrụ si eji nwayọọ nwayọọ eto ka onye nabatara eziokwu Alaeze na-eji nwayọọ nwayọọ agbanwe ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ana-abịarukwu Jehova nso, anyị na-ahụ na ha na-agbanwe ụfọdụ ihe ná ndụ ha. (Efe. 4:22-24) Ma, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ ahụ dị ntakịrị na-eto. w21.08 8-9 ¶4-5
Sọnde, Julaị 9
Ọ ka mma na mmadụ ji ihe ndị ọ na-ahụ anya na-eme onwe ya obi ụtọ kama ịchọgharịwa ihe na-agụ ya agụụ.—Ekli. 6:9.
Anyị ga-enweli ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. Onye obi na-adị ụtọ n’ihe “ọ na-ahụ anya” na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị o nwere, dị ka otú ihe si dịrị ya ugbu a. Ma, onye na-achọgharị ihe na-agụ ya agụụ ọ na-agaghị enwetali agaghị enwe obi ụtọ. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ọṅụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị anyị nwere ugbu a nakwa n’ịchọ ime ihe ndị anyị nwere ike ime. Ò kwere omume mmadụ inwe obi ụtọ n’ihe ndị o nwere ike imeli ugbu a? Ọtụtụ ndị chere na ọ gaghị ekwe omume n’ihi na kwa ụbọchị ndị mmadụ na-achọ ime ihe ndị ha na-emetụbeghị. Ma, ọ ga-ekweli omume. Anyị ga-enweli obi ụtọ n’ihe anyị nwere ugbu a. Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya? Iji chọpụta, tụlee ihe atụ Jizọs mere gbasara talent na Matiu 25:14-30, lekwasịkwa anya n’ihe ọ ga-akụziri anyị gbasara otú anyị ga-esi enweta ọṅụ ma na-enwekwu ọṅụ n’ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a. w21.08 21 ¶5-6
Mọnde, Julaị 10
Ebi m ebe dị elu na ebe dị nsọ, ma, mụ na ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi nọkwa.—Aịza. 57:15.
Jehova na-eche gbasara “ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi.” Anyị niile, ọ bụghị naanị ndị okenye, nwere ike inyere ụmụnna anyị aka. Otu ụzọ anyị nwere ike isi gbaa ha ume bụ igosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi. Jehova chọrọ ka anyị na-egosi ụmụnna ndị a na ọ hụrụ ha n’anya. (Ilu 19:17) Otú ọzọ anyị nwekwara ike isi nyere ụmụnna anyị aka bụ ịdị umeala n’obi na ịghara ịna-eji nkà ndị anyị nwere na-etu ọnụ. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka e towe anyị ka ọ ghara ime ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ. Kama nke ahụ, ka anyị jiri nkà anyị nwere na ihe ndị anyị ma na-agba ụmụnna anyị ume. (1 Pita 4:10, 11) Anyị nwere ike isi n’otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya mụta otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ bụ nwoke kacha ukwuu dịtụrụla ndụ n’ụwa. Ma, ọ “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:28-30) O ji okwu ndị dị mfe nghọta na ihe atụ ndị na-eru n’obi kọwaara ndị na-enweghị ka ọ hà ha ihe.—Luk 10:21. w21.07 23 ¶11-12
Tuzdee, Julaị 11
Jụọkwanụ ndị okenye unu, ha ga-agwa unu.—Diut. 32:7.
Na-agakwuru ndị agadi ka gị na ha na-ekwurịta okwu. N’eziokwu, e nwere ike ha anaghị ahụcha ụzọ nke ọma ma ọ bụ na-agasi ike ma ọ bụkwanụ na-ekwu okwu nke ọma. Ma, ha ka chọrọ ịna-ejere Jehova ozi. Ha emeekwarala onwe ha “ezigbo aha” n’ebe Jehova nọ. (Ekli. 7:1) Cheta ihe mere Jehova ji jiri ha kpọrọ ihe. Nọgide na-akwanyere ha ùgwù. Na-eme ka Ịlaịsha. Ịlaịsha ekweghị ahapụ Ịlaịja ruokwa n’ụbọchị ikpeazụ ha abụọ nọkọrọ. Ugboro atọ ka Ịlaịsha kwuru, sị: “Agaghị m ahapụ gị.” (2 Eze 2:2, 4, 6 ) Iji gosi na i nwere mmasị n’ebe ndị agadi nọ, na-ajụ ha ajụjụ. (Ilu 1:5; 20:5; 1 Tim. 5:1, 2) Jụọ ha ajụjụ ndị dị ka: “Mgbe ị ka na-eto eto, gịnị mere obi ji sie gị ike na ị chọtala eziokwu ahụ?” “Olee otú ihe ndị mere gị si mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?” “Olee ihe ndị ị chọpụtara na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ n’ozi ọ na-ejere Jehova?” (1 Tim. 6:6-8) Gee ha ntị nke ọma ka ha na-aza gị ajụjụ ndị ahụ. w21.09 5 ¶14; 7 ¶15
Wenezdee, Julaị 12
Ọ bụ Chineke na-enye unu ume maka na ọ dị ya ezigbo mma ime otú ahụ. Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.”—Fil. 2:13.
Anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma anyị na-eme ike anyị niile idebe iwu o nyere anyị ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (1 Jọn 5:3) Chegodị ihe a: Ị malitela izi ndị mmadụ ozi ọma n’ihi na ị hụrụ Jehova n’anya. Ime ya ọ̀ dịịrị gị mfe? O yiri ka ọ dịchaghịrị gị mfe. N’oge mbụ ị gara izi ndị mmadụ ozi ọma, ụjọ ọ̀ tụrụ gị? O doro anya na ụjọ tụrụ gị. Ma, ị ma na ọ bụ ọrụ Jizọs chọrọ ka ị rụọ, gị arụọ ya. O yikwara ka ọ malitere ịdịtụrụ gị mfe ka oge na-aga. Ma, oleekwanụ gbasara iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl? Ọ̀ na-atụ gị ụjọ? O nwere ike. Ma, ọ bụrụ na ị rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ ma nwee obi ike ịgwa mmadụ ka ị malitere ya ọmụmụ Baịbụl, Jehova nwere ike inyere gị aka ịna-eme ndị na-eso ụzọ. w21.07 3 ¶7
Tọzdee, Julaị 13
Ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha.—Mkpu. 13:16.
N’oge ochie, a na-aka ndị ohu akara iji gosi onye nwe ha. Taakwa, ndị ọchịchị ga-achọ ka onye ọ bụla gosi onye ọ na-akwado. Ha ga-achọ ka ndị mmadụ si n’otú ha si eche echiche na n’ihe ndị ha na-eme gosi na ha na-akwado ọchịchị ụwa a. Ànyị ga-ekwe ka a kaa anyị akara a iji gosi na anyị na-akwado ọchịchị ụwa a? Ihe ga-esiri ndị na-ekweghị ka a kaa ha akara ike. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na o nweghị “onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ.” (Mkpu. 13:17) Ma, ndị Chineke ma ihe Chineke ga-eme ndị nwere akara ahụ e kwuru gbasara ya ná Mkpughe 14:9, 10. N’ihi ya, kama ha ga-ekwe ka a kaa ha akara ahụ, ha ga-adị ka ndị dere “Abụ m nke Jehova” n’aka ha. (Aịza. 44:5) Ugbu a bụ oge iji kwụsie ike n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ ikwu na anyị bụ nke ya. w21.09 18 ¶15-16
Fraịdee, Julaị 14
Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.—Ilu 27:17.
Iji jezuo ozi anyị, anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ. Pọl onyeozi kụziiri Timoti otú e si ekwusa ozi ọma na otú e si akụzi ihe, gbaakwa ya ume ka o si otú ahụ na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe. (1 Kọr. 4:17) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ otú ahụ Timoti mere. Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ọma. O nweghị ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ Chineke enyereghị ya aka. (Ọma 127:1; Luk 11:13) Kpọọ okwu aha ma ị na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka. Dị ka ihe atụ, gwa ya ka o duga gị na nke onye chọrọ ịmụta gbasara ya nakwa onye dị njikere ige ntị. Anyị kwesịkwara iwepụta oge na-amụ Baịbụl. Okwu Chineke kwuru, sị: “Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Rom 12:2) Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị ga-amatakwu Chineke nke ọma. Anyị gwawazie ndị mmadụ gbasara ya, ha ga-amata na anyị kweere n’ihe anyị na-ekwu. w21.05 18 ¶14-16
Satọdee, Julaị 15
Ọrụ Onyenwe anyị unu na-arụsi ike abụghị na nkịti.—1 Kọr. 15:58.
Ọ bụrụkwanụ na n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara na ekpere anyị kpere, onye anyị na-amụrụ ihe anaghị eme nke ọma, ya adịkwa mkpa ka anyị kwụsị ịmụrụ ya Baịbụl? Ọ bụrụkwanụ na e nwebeghị onye anyị nyeere aka ka o ruo eru ime baptizim? Ọ̀ ga-eme ka obi mawa anyị ikpe, anyị echewe na Jehova anaghị agọzi ozi anyị? Chọpụta otú Jehova si ekpebi ma ozi anyị ọ̀ na-aga nke ọma. Jehova na-ele mbọ anyị na-agba na otú anyị si atachi obi. N’anya Jehova, ozi anyị na-ejere ya na-aga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịhụnanya na ịdị uchu na-arụ ya n’agbanyeghị ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị anyị ntị. Pọl dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.” (Hib. 6:10) Jehova na-echeta mbọ anyị na-agba na otú anyị si jiri ịhụnanya na-ejere ya ozi ọ bụrụgodị na e nweghị onye anyị mụụrụ Baịbụl ya emee baptizim. N’ihi ya, ihe ahụ Pọl kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si nwere ike ịkasi anyị obi. w21.10 25 ¶4-6
Sọnde, Julaị 16
Ndị niile Nna m nyere m ga-abịakwute m, emekataghị m chụpụ onye na-abịakwute m.—Jọn 6:37.
Otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ dị obiọma, hụkwa ha n’anya. Ọ ma na otú ihe si dịrị ha dị iche iche, marakwa na ha nwere nkà dị iche iche. N’ihi ya, ihe ndị ha ga-emeli nakwa ihe ha ga-arụpụtali n’ozi ọma dị iche iche. Ma, obi na-adị ya ụtọ na onye ọ bụla n’ime ha na-eme ike ya. Jizọs ji ihe atụ o mere gbasara talent gosi ihe a. N’ihe atụ ahụ, otu nwoke nyere ohu ya nke ọ bụla ọrụ “dị ka ike ya hà.” Ndị ohu abụọ ahụ rụsiri ọrụ ike. Ma, otu nwetara uru karịa onye nke ọzọ. N’agbanyeghị ya, nna ha ukwu jara onye nke ọ bụla n’ime ha mma, sị ya: “I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mat. 25:14-23) Jizọs hụrụ anyị n’anya, jirikwa obiọma na-emeso anyị ihe. Ọ ma na otú ihe si dịrị anyị na ihe anyị ga-emeli abụghị otu. Obi na-adịkwa ya ụtọ ma anyị mee ike anyị niile. Anyị kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. w21.07 23 ¶12-14
Mọnde, Julaị 17
Agaghị m eme onyenwe m ihe ọ bụla.—1 Sam. 24:10.
Ọ bụghị mgbe niile ka Eze Devid mere ebere. Dị ka ihe atụ, mgbe Nebal bụ́ nwoke obi ọjọọ kparịrị Devid na ndị agha ya ma jụ inye ha nri, Devid were iwe ọkụ ma kpebie na ya ga-egbu nwoke ahụ na ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya. Nwunye Nebal bụ́ Abigel nwere obiọma, na-enwekwa ndidi. O mere ngwa ngwa bunye Devid nri nke mere ka Devid gharazie igbu Nebal na ụmụ nwoke nọ n’ụlọ ya. (1 Sam. 25:9-22, 32-35) Mgbe ezigbo iwe ji Devid, o kpebiri na Nebal na ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya kwesịrị ịnwụ. Mgbe e mechara, o kwukwara na nwoke ahụ Netan ji mee ihe atụ kwesịrị ịnwụ n’ihi ihe o mere. Na nke abụọ a, anyị nwere ike ịna-eche ihe mere Devid bụ́ nwoke na-eme ebere ga-eji kpee ụdị ikpe a. Ka anyị lee ihe mere n’oge ahụ Devid kwuru ihe a. N’oge ahụ, obi nọ na-ama ya ikpe. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ọjọọ na-ekpe ikpe, o gosiri na ya na Jehova adịghịzi ná mma. w21.10 12 ¶17-18; 13 ¶20
Tuzdee, Julaị 18
Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.—1 Pita 1:16.
Ihe a e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si na-akụziri anyị na anyị nwere ike iṅomi Jehova bụ́ onye kacha dịrị nsọ. Anyị kwesịrị ịdị nsọ. O nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume n’ihi na anyị ezughị okè. O nwere oge ndị Pita onyeozi mejọrọ ihe. Ma, ihe ndị o mere gosiri na anyị nwere ike ịdị nsọ. Ọ bụrụ na e kwuo gbasara onye dị nsọ, ihe nwere ike ịgbata ọtụtụ ndị n’obi bụ onye ihu na-anaghị atọ ọchị, onye na-eyi uwe ndị okpukpe, nakwa onye na-eme nsọ nsọ. Ma, ọ bụghị ya bụ ịdị nsọ. Baịbụl kwuru na Jehova, bụ́ onye dị nsọ, bụ Chineke “obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Baịbụl kwuru na ndị na-efe Chineke “na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 144:15) Jizọs katọrọ ndị na-eyi uwe pụrụ iche na ndị na-eme ezi omume naanị ka ndị ọzọ hụ ha. (Mat. 6:1; Mak 12:38) Ezigbo Ndị Kraịst ma ihe mmadụ ịdị nsọ pụtara n’ihi ihe Baịbụl gwara ha. Anyị ma na Chineke anyị dị nsọ ma hụ anyị n’anya agaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. w21.12 2 ¶1, 3
Wenezdee, Julaị 19
Jiri obi gị niile . . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.—Mak 12:30.
N’ime ihe niile Chineke meere anyị, o nwere ike ịbụ na otu n’ime ihe ndị kachanụ bụ onyinye o nyere anyị ife ya ofufe. Anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya ma anyị ‘na-eme ihe ndị o nyere n’iwu.’ (1 Jọn 5:3) Jizọs kwuru uche Nna ya mgbe o nyere anyị iwu ka anyị na-eme ndị na-eso ụzọ, na-emekwa ha baptizim. (Mat. 28:19) O nyekwara anyị iwu ka anyị hụ ibe anyị n’anya. (Jọn 13:35) Jehova ga-anabata ndị niile na-erube isi n’iwu ya n’ezinụlọ nke ndị na-efe ya zuru ụwa ọnụ. (Ọma 15:1, 2) Na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Ịhụnanya bụ àgwà Jehova kachanụ. (1 Jọn 4:8) Jehova hụrụ anyị n’anya tupu anyị amata onye ọ bụ. (1 Jọn 4:9, 10) Anyị na-eṅomi ya ma ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ndị ọzọ n’anya. (Efe. 5:1) Otu n’ime ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ inyere ha aka ịmata Jehova ugbu a oge ka dị. (Mat. 9:36-38) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-eme ka ha nwee olileanya ịbụ ndị ezinụlọ Chineke. w21.08 5-6 ¶13-14
Tọzdee, Julaị 20
E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a.—Jọn 15:13.
Jizọs hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe dị Nna ya mma, meekwa ihe ga-abara anyịnwa uru. (Jọn 14:31) Otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. N’ụbọchị niile ọ dịrị ndụ n’ụwa, o gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-enwere ha ọmịiko, ma mgbe ụfọdụ na-emegide ya. Otu ụzọ dị mkpa o si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ịkụziri ha banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:43, 44) Jizọs gosikwara na ọ hụrụ Chineke na ndị mmadụ n’anya mgbe o ji obi ya niile kweta ka ndị mmehie taa ya ahụhụ ma gbuo ya. O si otú a mee ka anyị niile nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị nyefere Jehova onwe anyị ma mee baptizim n’ihi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya. N’ihi ya, dịkwa ka Jizọs, otú anyị si emeso ndị mmadụ kwesịrị igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, agaghị ahụli Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-anaghị ahụ anya.”—1 Jọn 4:20. w22.03 10 ¶8-9
Fraịdee, Julaị 21
Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.—Efe. 5:15, 16.
Ọ bụ eziokwu na anyị na Jehova ịnọrị na-amasị anyị, ma ọ naghị adị mfe mgbe niile. Ọrụ na-ejukarị anyị aka, nke nwere ike ime ka o siere anyị ike iwepụta oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Ọrụ ego, ọrụ anyị na-arụ n’ezinụlọ, nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa anyị na-eme nwere ike iwekọrọ oge anyị, ya emee ka ọ dị anyị ka ọ̀ bụ na anyị agaghị enweli ohere ikpe ekpere, ịmụ ihe, na ịtụgharị uche. E nwere ihe ọzọ nwere ike ịna-ewekọrọ oge anyị. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike kwe ka ihe ndị na-adịghị njọ anyị na-eme mee ka anyị ghara inwe ohere anyị ga-eji bịarukwuo Jehova nso. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe ndị anyị na-eme iji zurutụ ike. Ọ dị mma ka anyị na-ewepụta oge ezurutụ ike. Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ihe ndị dị mma anyị na-eme iji zurutụ ike nwere ike ime ka anyị ghara inwecha ohere ime ihe gbasara ofufe Chineke. Anyị ekwesịghị ikwe ka izurutụ ike gbochie anyị ime ihe ndị kacha mkpa.—Ilu 25:27; 1 Tim. 4:8. w22.01 26 ¶2-3
Satọdee, Julaị 22
Unu ga-ewere onye mbịarambịa binyeere unu ka nwa afọ. Unu ga-ahụkwa ya n’anya otú unu hụrụ onwe unu n’anya.—Lev. 19:34.
Mgbe Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha hụ mmadụ ibe ha n’anya, ihe o bu n’obi abụghị ka ha hụ naanị ndị ha na ha si n’otu agbụrụ ma ọ bụ n’otu obodo n’anya. Ha kwesịkwara ịhụ ndị mbịarambịa nọ n’etiti ha n’anya. Ọ bụ ihe a ka e kwuru na Levitikọs 19:33, 34. Ebe ahụ kwuru na ha kwesịrị ịna-emeso onye mbịarambịa “ka nwa afọ,” ‘hụkwa ya n’anya’ otú ha si hụ onwe ha. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel kwesịrị ịhapụ ma onye mbịarambịa ma ogbenye ka ha na-ewere ihe ha wefọrọ n’ubi ha. (Lev. 19:9, 10) Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịna-ahụ ndị mbịarambịa n’anya. (Luk 10:30-37) Olee otú ha ga-esi eme ya? E nwere ọtụtụ ndị mbịarambịa taa. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ụfọdụ n’ime ha gị na ha bi nso. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-akwanyere ha ùgwù, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka. w21.12 12 ¶16
Sọnde, Julaị 23
Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.—Ọma 34:10.
Ọ bụrụ na anyị ekwere ka Jehova na-eduzi anyị ugbu a, obi ga-esi anyị ike na ọ ga-azọpụta anyị n’ọdịnihu. Okwukwe ga-eme ka anyị gakwuru onye anyị na-arụrụ ọrụ gwa ya ka o nye anyị oge anyị ga-eji gaa mgbakọ, na-aga ọmụmụ ihe, na ozi ọma. Ọ bụrụkwanụ na ọ jụ ma chụọ anyị n’ọrụ, obi ò siri anyị ike na Jehova agaghị ahapụ anyị nakwa na ọ ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa? (Hib. 13:5) Ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge niile nwere ike ịkọ otú Jehova si enyere ha aka mgbe ọ bụla enyemaka dị ha mkpa. Jehova anaghị ahapụ ndị na-erubere ya isi. Ebe ọ bụ na Jehova nọnyeere anyị, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Chineke anyị agaghị ahapụ anyị ma ọ bụrụhaala na ihe kacha anyị mkpa ná ndụ bụ ime uche ya. w22.01 7 ¶16-17
Mọnde, Julaị 24
Ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova.—2 Ihe 19:6.
Olee ihe e nwere ike iji mata ma ànyị tụkwasịrị ndị okenye obi? Ọ bụrụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ bụ onye anyị na ya dị n’ezigbo mma, anyị nwere ike ịna-eche na ndị okenye elebaraghị okwu ahụ anya nke ọma ma ọ bụkwanụ ma otú ha si kpee ikpe ahụ ọ̀ bụ otú Jehova gaara esi ekpe ya. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịnabata ihe ndị okenye kpebiri? Anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova mere ndokwa ka a na-achụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Ọ na-abakwara ma ọgbakọ ma onye ahụ mere mmehie uru. A hapụ onye mere mmehie dị oké njọ na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ, o nwere ike ime ka ndị ọzọ soro ya kpawa àgwà ọjọọ. (Gal. 5:9) Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ime ka ọ ghara ịma otú ihe o mere dịruru ná njọ, meekwa ka ọ ghara ịgba mbọ mee ka ya na Jehova dịrị ná mma. (Ekli. 8:11) Ka obi sie anyị ike na ndị okenye ga-elezi anya tupu ha ekpebie ma à ga-achụ mmadụ n’ọgbakọ. w22.02 5-6 ¶13-14
Tuzdee, Julaị 25
Ọ gaghị azọgbu ahịhịa amị fọrọ obere ka ọ kpọnwụọ, ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.—Mat. 12:20.
Okenye kwesịrị ịdị obiọma, nweekwa ndidi karịchaa ma ọ bụrụ na onye o si na Baịbụl nye ndụmọdụ anabataghị ya ozugbo. Okenye ekwesịghị iwe iwe ma ọ bụrụ na nwanna o nyere ndụmọdụ anabataghị ya ozugbo ma ọ bụ ghara ime ihe ọ gwara ya ozugbo. Ọ bụrụ na okenye ahụ ekpewe ekpere n’onwe ya, o nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ gọzie onye ahụ o nyere ndụmọdụ ma nyere ya aka ịghọta ihe mere o ji nye ya ndụmọdụ ahụ ma mee ya. O nwere ike iwe nwanna ahụ e nyere ndụmọdụ oge iji chebara ndụmọdụ ahụ e nyere ya echiche. Ọ bụrụ na okenye ahụ ejiri ndidi na obiọma gwa nwanna ahụ okwu, ọ ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ige ntị na ndụmọdụ ahụ ọ na-enye ya. Ndụmọdụ ọ bụla anyị nyere kwesịrị isi n’Okwu Chineke. Cheta na ihe anyị bu n’obi enye ndụmọdụ bụ ka ọ baara ụmụnna anyị uru nakwa ‘ka obi dị ha ụtọ.’—Ilu 27:9. w22.02 18 ¶17; 19 ¶19
Wenezdee, Julaị 26
Ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya.—Ilu 13:12.
Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nye anyị ike anyị ga-eji die ọnwụnwa bịaara anyị ma ọ bụ ike anyị ga-eji akwụsị ihe ndị na-adịghị Jehova mma anyị na-eme, anyị nwere ike iche na Jehova na-egbu oge ịza anyị ekpere. Gịnị mere na ọ bụghị ekpere niile anyị kpere ka Jehova na-aza ozugbo? Ọ na-ewere ekpere anyị si n’obi anyị na-ekpe ka ihe na-egosi na anyị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. (Hib. 11:6) Jehova na-achọkwa ịhụ na anyị ji obi anyị niile na-achọ ime ihe anyị na-ekpe n’ekpere ma chọọ ime uche ya. (1 Jọn 3:22) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe ndidi ma mee ihe dabara n’ihe anyị na-ekpe n’ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịkwụsị àgwà ọjọọ anyị na-akpa. Ihe Jizọs kwuru mere ka anyị ghọta na ọ bụghị ekpere niile anyị kpere ka a ga-aza ozugbo. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa aka n’ụzọ ka a ga-emeghere ụzọ.”—Mat. 7:7, 8. w21.08 8 ¶1; 10 ¶9-10
Tọzdee, Julaị 27
M ji iwu gị kpọrọ ihe nke ukwuu. M na-echebara ya echiche kwa ụbọchị.—Ọma 119:97.
I kwesịrị ịnọgide na-amụ Baịbụl ka okwukwe gị sie ike na e nwere Onye kere ihe niile. (Josh. 1:8) Cheekwa gbasara otú amụma ndị e buru na Baịbụl sirila mezuo na otú ihe ndị dere ya kwuru si daba n’ihe ibe ha kwuru. Ịmụ gbasara ihe ndị a niile ga-eme ka i kwetasie ike na e nwere Onye kere anyị ma ihe ma hụ anyị n’anya, nakwa na ọ bụ uche ya ka e dere na Baịbụl. (2 Tim. 3:14; 2 Pita 1:21) Ị na-amụ Okwu Chineke, chọpụta uru ihe ndị e dere na ya na-abara anyị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na ịhụ ego n’anya nwere ike ịkpatara anyị ọtụtụ nsogbu, meekwa ka ‘ahụ́ niile na-afụ mmadụ ụfụ.’ (1 Tim. 6:9, 10; Ilu 28:20; Mat. 6:24) Ndụmọdụ a Baịbụl nyere anyị ka anyị ghara ịhụ ego n’anya dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, zere ịhụ ego n’anya. È nwere ndụmọdụ Baịbụl ọzọ baara gị uru? Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ezigbo ndụmọdụ juru na Baịbụl, anyị ga-ahụ na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ihe ga-akacha abara anyị uru. Ihe ndị a ga-eme ka anyị na-atụkwasị ya obi mgbe niile. (Jems 1:5) Ọ ga-emekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.—Aịza. 48:17, 18. w21.08 17-18 ¶12-13
Fraịdee, Julaị 28
N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe.—Hib. 6:10.
Ọ bụrụ na i mewela agadi, ka obi sie gị ike na Jehova chetara ozi niile i jeere ya n’oge gara aga. I jirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. I diela ọnwụnwa dị iche iche ma ndị nke tara akpụ, mee ihe Baịbụl kwuru, meekwa ka ndị ọzọ mata na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime. Ị rụọla ọrụ ndị tara akpụ n’ọgbakọ Jehova, zụọkwa ndị ọzọ. Ị gbalịala ike gị niile ịna-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ. Ị kwadoola ụmụnna gị ndị nọ n’ozi oge niile, na-agbakwa ha ume. Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu n’ihi na ị na-erubere ya isi. O kwere nkwa na ya agaghị “ahapụ ndị na-erubere ya isi.” (Ọma 37:28) O kwere unu nkwa na ‘isi unu chagodị awọ́, ọ ka ga na-elekọta unu.’ (Aịza. 46:4) N’ihi ya, echekwala na otú a ị bụzi agadi na ị dịghịzi mkpa n’ọgbakọ Jehova. Ị ka dịkwa ezigbo mkpa. w21.09 3 ¶4
Satọdee, Julaị 29
Jehova emeerela ndị na-atụ egwu ya ebere.—Ọma 103:13.
Jehova na-eme ebere n’ihi na amamihe ya enweghị atụ. Ọ na-eme mkpebi ga-abara ihe ndị o kere eke uru. Baịbụl kwuru na ‘amamihe nke si n’eluigwe na-emetere ndị ọzọ ebere, na-emekwa ihe dị mma.’ (Jems 3:17) Dị ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, Jehova ma na imere ụmụ ya ebere ga-abara ha uru. (Aịza. 49:15) Ebere Jehova na-eme ka anyị nwee olileanya n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. N’ihi ya, amamihe Jehova na-eme ka ọ na-eme ebere mgbe ọ bụla ọ hụrụ ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Ma, Jehova ma mgbe ọ na-ekwesịghị ime ebere. Ebe ọ bụ na ọ ma ihe, ọ gaghị emere mmadụ ebere mgbe ime otú ahụ ga-egosi na ọ na-akwado ihe ọjọọ. Ọ bụrụkwanụ na ohu Jehova amara ụma na-ebi ndụ rụrụ arụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ka anyị na onye dị otú ahụ “kwụsị ịna-emekọrịta ihe.” (1 Kọr. 5:11) A na-achụpụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Ihe a dị ezigbo mkpa iji chebe ụmụnna anyị nakwa iji gosi na ụzọ Jehova dị ọcha. w21.10 9-10 ¶7-8
Sọnde, Julaị 30
Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.—2 Kọr. 9:7.
Anyị na-efe Jehova ma anyị na-enye onyinye iji kwadoo nzukọ ya. Ndị Izrel ekwesịghị ịgba aka bịa n’ihu Jehova. (Diut. 16:16) Ha kwesịrị iweta onyinye otú ike ha hà. Ha na-esi otú ahụ egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe niile Jehova na-emere ha. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị o ji nzukọ ya na-emere anyị? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ inye onyinye iji kwadoo ego a na-emefu n’ọgbakọ anyị nakwa maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, otú ọ bụla akpa anyị hà. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onyinye Chineke kacha anabata bụ onyinye si mmadụ n’obi, n’ihi na Chineke na-atụ anya ka mmadụ nye ihe ọ ga-enyeli, ọ bụghị ihe ọ na-agaghị enyeli.” (2 Kọr. 8:4, 12) Jehova ji onyinye ọ bụla anyị si n’obi anyị nye ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ọ hà.—Mak 12:42-44. w22.03 24 ¶13
Mọnde, Julaị 31
Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.—1 Tesa. 5:14.
Ndị okenye agaghị emeli ka nsogbu niile na-abịara ndị Jehova kwụsị, ma Jehova chọrọ ka ndị okenye na-eme ike ha niile iji na-agba atụrụ ya ume ma na-echebe ha. Olee otú ndị okenye nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ọgbakọ ga-esi enwe oge ha ga-eji enyere ụmụnna ha aka? Na-eme ka Pọl. Ọ na-adịkarị njikere ịja ụmụnna ya mma na ịgba ha ume. Ọ ga-adị mma ma ndị okenye na-eme ka ya ma na-egosi ụmụnna ha na ha hụrụ ha n’anya, na-enwekwara ha ọmịiko. (1 Tesa. 2:7) Pọl gwara ụmụnna ya na ọ hụrụ ha n’anya nakwa na Jehova hụrụ ha n’anya. (2 Kọr. 2:4; Efe. 2:4, 5) Pọl weere ndị nọ n’ọgbakọ ka ndị enyi ya, na-ewepụtakwa oge ya na ha ana-anọrị. Ọ gwara ha ihe na-echegbu ya nakwa ebe ndị ọ na-anaghị emete n’ihi na ọ tụkwasịrị ha obi. (2 Kọr. 7:5; 1 Tim. 1:15) Ma ihe mere Pọl ji gwa ha ihe ndị a abụghị ka ha metewere ya ebere, kama ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ inyere ha aka. w22.03 28 ¶9-10