Ọgọst
Tuzdee, Ọgọst 1
Nna, gbaghara ha.—Luk 23:34.
Ọ ga-abụ na ọ bụ ndị agha Rom ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ ka ọ sịrị ka a gbaghara. Jizọs ekweghị ka ihe ọjọọ ha mere ya mee ka o wewe iwe ma ọ bụ buwere ha iwe n’obi. (1 Pita 2:23) Anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ otú ahụ Jizọs mere. (Kọl. 3:13) Ụfọdụ ndị, ma ndị ikwu anyị, nwere ike ịna-emegide anyị n’ihi na ha aghọtaghị ihe anyị kweere na otú anyị si ebi ndụ. Ha nwere ike ikwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara anyị, menye anyị ihere n’ihu ndị ọzọ, mebisie akwụkwọ anyị ma ọ bụkwanụ kwuo na ha ga-emerụ anyị ahụ́. Kama ibuwere ndị na-emegide anyị iwe n’obi, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o mepee anya ha ka ha nabata eziokwu. (Mat. 5:44, 45) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara ndị na-emegide anyị, nke kacha nke, ma ọ bụrụ na ha emekpọọla anyị ọnụ. Ma, anyị buwere ha iwe n’obi, anyị na-akpatara onwe anyị nsogbu. (Ọma 37:8) Ọ bụrụ na anyị agbaghara mmadụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị achọghị ka ihe ọjọọ o mere anyị ka na-ewe anyị iwe.—Efe. 4:31, 32. w21.04 8-9 ¶3-4
Wenezdee, Ọgọst 2
Ha nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro . . , kpasuokwa ya iwe.—Ọma 78:40.
È nwere onye ị hụrụ n’anya a chụrụ n’ọgbakọ? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịgbawa gị obi. Chegodị otú obi si gbawaa Jehova mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi nọbu n’ezinụlọ ya nupụụrụ ya isi. (Jud 6) Cheekwa otú obi dị ya mgbe ndị ọ hụrụ n’anya bụ́ ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro. (Ọma 78:41) Ka obi sie gị ike na ọ na-ewute Nna anyị nke eluigwe ma onye ị hụrụ n’anya hapụ ya. Ọ na-aghọta mwute anyị na-enwe, ọ ga-agbakwa gị ume ma kwadoo gị. Ndị nwa ha ha hụrụ n’anya hapụrụ ọgbakọ nwere ike ịna-eche ma ò nwere ihe ha gaara eme iji nyere nwa ha aka ịnọgide na-efe Chineke. Otu nwanna nwoke sịrị: “M na-ata onwe m ụta mgbe ahụ. M rọdịrị nrọ ọjọọ maka ya.” Otu nwanna nwaanyị ụdị ihe a mere jụrụ onwe ya, sị: “Gịnị ka m mejọrọ? Ọ dị m ka agbalịghị m ike m niile ịkụziri nwa m banyere Jehova.” w21.09 26 ¶1-2, 4
Tọzdee, Ọgọst 3
[Ha ghọtara] na ha bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.—Ọrụ 4:13.
Ụfọdụ ndị na-eche na ndị Chineke agaghị akụziliri ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ha agaghị ụlọ akwụkwọ ndị okpukpe a ma ama. Ma, ha kwesịrị ịgbalị na-achọpụta nke bụ́ eziokwu. Ọ bụ ihe Luk so dee Baịbụl mere. Luk gbalịrị isi “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” Ọ chọrọ ka ndị ga-agụ akwụkwọ ya “mara n’ụzọ zuru ezu” ma ihe ha nụrụ gbasara Jizọs ọ̀ bụ eziokwu. (Luk 1:1-4) Ndị Juu bi na Beria n’oge ochie mere ka Luk. Mgbe mbụ ha nụrụ ozi ọma gbasara Jizọs, ha nyochara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma iji mata ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu. (Ọrụ 17:11) Ndị mmadụ kwesịkwara ịna-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ha kwesịrị inyocha Akwụkwọ Nsọ iji mara ma ihe ndị ohu Chineke na-akụziri ha ọ̀ bụ eziokwu. Ha kwesịkwara ịgụ gbasara ihe ndị ohu Chineke mere n’oge anyị a. Ọ bụrụ na ha achọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ ga-eme ka ịkpọasị ma ọ bụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu ghara imegharị ha anya. w21.05 3 ¶7-8
Fraịdee, Ọgọst 4
Jirinụ obi unu niile hụ anyị n’anya.—2 Kọr. 6:13.
Ò nwere onye nọ n’ọgbakọ unu ị ga-achọ ịkpọ ka ọ bịa n’ụlọ gị? E nwere oge ndị ọ ga-atọgbu ụmụnna anyị atọgbu ka anyị na ha nọrịa. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike ha na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova ịnọ n’oge ha na-eme ememme okpukpe. Obi na-ajọ ụfọdụ ndị ezigbo njọ n’ụbọchị ụfọdụ, dị ka n’ụbọchị dabara n’ụbọchị onye ha nwụrụ. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge ka anyị na ha nọrịa, anyị na-egosi na anyị ji ‘obi anyị niile’ hụ ha n’anya. (Fil. 2:20) E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka owu na-ama Onye Kraịst mgbe ụfọdụ. Ma, ka anyị ghara ichefu na Jehova ma otú ihe niile si dịrị anyị. Ọ na-esi n’aka ụmụnna anyị egboro anyị mkpa anyị. (Mat. 12:48-50) Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ n’ihe ndị Jehova meere anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-akwado ụmụnna anyị. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, anyị ma na anyị anọghị naanị anyị n’ihi na Jehova nọnyeere anyị mgbe niile. w21.06 12-13 ¶18-20
Satọdee, Ọgọst 5
Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ, ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto . . . n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.—1 Pita 2:12.
Jizọs adaghị mbà. Ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ụfọdụ egeghị ya ntị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ma na ndị mmadụ kwesịrị ịmata nke bụ́ eziokwu. Ọ chọkwara inye ọtụtụ ndị ohere ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ makwa na ụfọdụ ndị na-anabughị ekwe ege ntị ga-emecha gewe ntị. Legodị ihe mere n’ezinụlọ yanwa. N’ime afọ atọ na ọkara Jizọs jere ozi ya n’ụwa, o nweghị otu nwanne ya ghọrọ onye na-eso ụzọ ya. (Jọn 7:5) Ma mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ha ghọrọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 1:14) Anyị amaghị onye ga-emecha ghọọ onye na-efe Chineke. Ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge ịmụta eziokwu karịa ibe ha. Ma ndị na-achọghịdị ige anyị ntị na-ahụ àgwà ọma anyị nakwa na anyị anaghị ada mbà. O nwere ike ime ka ha ‘nye Chineke otuto.’ w21.05 18 ¶17-18
Sọnde, Ọgọst 6
Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, “Alaeze eluigwe adịla nso.”—Mat. 10:7.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ gbara mkpị. Ọ gwara ha ka ha kwusaa ozi ọma nke Alaeze, gosikwa ha otú ha ga-esi arụ ya. (Luk 8:1) Ọ gwakwara ha ihe ha ga-eme ma ndị mmadụ nabata ozi ha ma ọ bụkwanụ jụ ya. (Luk 9:2-5) O kwukwara ebe ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusaru ozi ọma ahụ, gwakwa ha na ozi ha ga-abụrụ “mba niile àmà.” (Mat. 24:14; Ọrụ 1:8) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kụziere ndị niile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya idebe ihe niile o yere n’iwu. Jizọs gosiri na a ga na-arụ ọrụ a dị mkpa ruo n’oge anyị a, “ruo ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 28:18-20) Ná mkpughe Jizọs kpugheere Jọn, o mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya niile kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova.—Mkpu. 22:17. w21.07 2-3 ¶3-4
Mọnde, Ọgọst 7
Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, ghara ịna-amarịta aka, gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.—Gal. 5:26.
N’ụwa taa, ọtụtụ ndị na-achọkarị ịka ndị ọzọ. Ha anaghịkwa achọ ịma ihe ihe ha na-eme ga-akpatara ndị ọzọ. Onye na-azụ ahịa nwere ike ime ihe ga-akpatara ndị ọzọ nsogbu ka o nwee ike ịka ndị ọzọ. Onye na-eme egwuregwu nwere ike zọọ ibe ya ụkwụ ka o nwee ike merie n’asọmpi. Nwa akwụkwọ chọrọ ịba mahadum a ma ama nwere ike ghọọ aghụghọ n’ule ka o nwee ike ịbanye. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ma na ihe ndị a dị njọ. Ha so n’ọrụ “ndị e ji mara anụ ahụ́.” (Gal. 5:19-21) Ụfọdụ ụmụnna hà nwere ike ịna-achọ ka ha ka ndị ọzọ mma n’amaghị ama, na-emekwa ka ndị ọzọ na-eme otú ahụ? Ihe a bụ ajụjụ dị ezigbo mkpa n’ihi na ịma aka nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịdị n’udo. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụ gbasara ndị ji obi ha fee Chineke n’oge ochie na-achọghị ka ha ka ndị ọzọ. w21.07 14 ¶1-2
Tuzdee, Ọgọst 8
Onye na-emetere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere na-enwe obi ụtọ. Jehova ga-anapụta ya n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya.—Ọma 41:1.
Ịhụnanya pụrụ iche na-eme ka anyị chọọ inyere ndị dara mbà aka. Ọtụtụ ụmụnna anyị taa na-eji obi ha niile enyere ụmụnna ha aka ma nsogbu bịara ha ma ọ bụkwanụ ma ha daa mbà. Ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, dịrịkwa njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji nyere ha aka. (Ilu 12:25; 24:10) Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị na-eme otú ahụ. Ọ sịrị: “Na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.” (1 Tesa. 5:14) Ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị dara mbà aka bụ ige ha ntị nke ọma na ime ka obi sie ha ike na anyị hụrụ ha n’anya. Obi na-adị Jehova mma ma anyị nyere ndị ohu ya aka. Ilu 19:17 sịrị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.” w21.11 10 ¶11-12
Wenezdee, Ọgọst 9
Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma. Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ.—Ọma 34:8.
Gịnị ka anyị nwere ike ime ugbu a iji jikere maka ọdịnihu? Ihe ndị anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ. Anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ na anyị na Jehova dị ná mma. Ka anyị na-amatakwu Chineke, obi ga-esikwu anyị ike na ọ ga-echebeli anyị mgbe Gọg nke Megọg ga-abịa ịlụso anyị ọgụ. Ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si gosiri ihe mere obi ji sie Devid ike na Jehova ga-anọnyere ya. Ọtụtụ mgbe, Devid tụkwasịrị Jehova obi. O nweghịkwa mgbe Jehova gharịpụrụ ya. Mgbe Devid bụ okorobịa, ọ lụsoro otu dike onye Filistia aha ya bụ Golayat ọgụ. Devid gwara ya, sị: “Jehova ga-enyefe gị n’aka m taa.” (1 Sam. 17:46) Mgbe ọ na-ejere Eze Sọl ozi, Sọl gbalịrị ọtụtụ ugboro igbu ya. Ma, “Jehova nọnyeere Devid.” (1 Sam. 18:12) Ebe ọ bụ na Jehova enyerela Devid aka n’oge gara aga, ọ ma na ọ ga-enyere ya aka ná nsogbu nke a bịaara ya. w22.01 6 ¶14-15
Tọzdee, Ọgọst 10
Ụmụ Chineke niile amalitekwa iti mkpu otuto.—Job 38:7.
Jehova na-eji ndidi rụọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịrụ n’agbanyeghị oge ọ ga-ewe ya. Ọ na-eme ya iji wetara aha ya otuto nakwa iji mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú Jehova si jiri nwayọọ nwayọọ kee ụwa maka ụmụ mmadụ. Mgbe Baịbụl na-ekwu otú e si kee ụwa, o kwuru gbasara otú Jehova si kpebie “otú ọ ga-aha,” igwunye “ntọala ya,” nakwa ịdọnye “nkume ji ya.” (Job 38:5, 6) Jehova wepụtadịrị oge leruo ihe ndị o kere eke anya. (Jen. 1:10, 12) Ì nwere ike iche otú obi dị ndị mmụọ ozi mgbe ha hụrụ ihe ọhụrụ ọ bụla Jehova kere? Ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu ha atọgbu. O nwere mgbe o ruru, ha amalite “iti mkpu otuto.” Gịnị ka anyị na-amụta? O were Jehova ọtụtụ puku afọ tupu ya arụchaa ọrụ ya. Ma, mgbe Jehova lechara ihe niile o ji nlezianya kee, ọ sịrị na “ha dị nnọọ mma.”—Jen. 1:31. w21.08 9 ¶6-7
Fraịdee, Ọgọst 11
I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi.—Mat. 25:23.
N’ihe atụ ahụ Jizọs mere, otu nwoke chọrọ ime njem. Tupu ya agawa, ọ kpọrọ ndị ohu ya ma nye onye nke ọ bụla talent ọ ga-eji zụọ ahịa. Nwoke ahụ ma ihe ohu ya nke ọ bụla ga-emeli. N’ihi ya, o nyere onye nke mbụ talent ise, nye onye nke ọzọ talent abụọ, nyekwa onye nke atọ otu talent. Ohu ya nke mbụ na nke abụọ rụsiri ọrụ ike inwetara nna ha ukwu uru. Ma, ohu nke atọ ejighị ego nna ya ukwu nyere ya mee ihe ọ bụla. N’ihi ya, nna ya ukwu chụrụ ya n’ọrụ. Ohu nke mbụ na nke abụọ maara na ọrụ ahụ nna ha ukwu nyere ha dị mkpa. Ha jikwa ya kpọrọ ihe. Ha ritekwuru talent e nyere ha okpukpu abụọ ọzọ n’uru. Nna ha ukwu kwụrụ ha ụgwọ maka ịrụsi ọrụ ike. Ọ bụghị naanị na obi dị nna ha ukwu ụtọ maka ihe ha mere, kama, ọ jara ha mma ma nyekwuo ha ọrụ. w21.08 21 ¶7; 22 ¶9-10
Satọdee, Ọgọst 12
M ka ga-eme ọzọ ka eluigwe na ụwa . . . maa jijiji.—Hag. 2:6.
Jehova enweerela ụmụ mmadụ ezigbo ndidi n’oge ikpeazụ a. Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla. (2 Pita 3:9) O nyela onye ọ bụla ohere ichegharị. Ma, ọ gaghị enwe ndidi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-adị ndị na-ekweghị akwado Alaeze Chineke otú ọ dị Fero n’oge Mosis. Jehova gwara Fero, sị: “M gaarala eweli aka m kpatara gị na ndị obodo gị ọrịa ọjọọ, ka e wee kpochapụ gị n’ụwa. Ma ihe mere m ji hapụ gị ndụ bụ ka m gosi gị ike m nakwa ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.” (Ọpụ. 9:15, 16) Mba niile ga-emecha mara na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. (Ezik. 38:23) Ịma jijiji nke e kwuru okwu ya n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si ga-eme ka e bibie ndị dị ka Fero kpamkpam, bụ́ ndị na-ekwetaghị na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị. w21.09 18-19 ¶17-18
Sọnde, Ọgọst 13
Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-ebe ákwá bee ákwá.—Rom 12:15.
Ọ̀ na-ewute gị na a chụrụ onye ị hụrụ n’anya n’ọgbakọ? Ụfọdụ ndị gị na ha nọ n’ọgbakọ, hà na-ekwu ihe ndị nwere ike ime ka ihe ahụ merenụ na-ewutekwu gị? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ga na-ekwu ihe kwesịrị ekwesị mgbe niile. (Jems 3:2) Anyị niile ezughị okè. N’ihi ya, ya ejula gị anya na ọ ga-esiri ụfọdụ ndị ike ịma ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ha ekwuo ihe ga-ewute gị n’amaghị ama. Cheta ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere anyị. Ọ sịrị: “Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.” (Kọl. 3:13) Nọgide na-enyere ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ aka. Ha chọrọ ka ị hụ ha n’anya ma na-agba ha ume ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Hib. 10:24, 25) Mgbe ụfọdụ, ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ na-eche na a kpapụla ha n’ọgbakọ. Ekwela ka ọ dị ha otú ahụ. Ndị na-eto eto a chụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha n’ọgbakọ bụ ndị ọ kacha mkpa ka a na-agba ume ma na-aja mma. w21.09 29 ¶13-14; 30 ¶16
Mọnde, Ọgọst 14
Onye ma ihe na-ege ntị ka ọ mụtakwuo ihe.—Ilu 1:5.
Ọ bụrụ na onye agadi na onye na-eto eto ana-ekwurịta okwu, ọ na-abara ha abụọ uru. (Rom 1:12) Ọ ga-eme ka onye ahụ na-eto eto nwekwuo obi ụtọ maka otú Jehova si na-elekọta ndị na-efe ya, meekwa ka onye agadi ahụ mara na e ji ya kpọrọ ihe. Ọ ga-eme ya obi ụtọ ịkọrọ gị otú Jehova sirila gọzie ya. Nká nwere ike ime ka ndị agadi gharazie ịma mma elu ahụ́. Ma, ndị na-ejere Jehova ozi na-amakwu mma n’anya ya ka ha na-aka nká. (1 Tesa. 1:2, 3) Gịnị mere o ji bụrụ eziokwu? Ọ bụ n’ihi na kemgbe ha nọ n’ọgbakọ, ha ekwela ka mmụọ Jehova kpụgharịa ha ma mee ka ha na-akpa àgwà ndị dị mma. Ka anyị na-agbalịkwu ịmata ndị agadi anyị na ha nọ n’ọgbakọ, ịkwanyere ha ùgwù, na ịmụta ihe n’aka ha ka anyị na-amatakwu na ha baara anyị ezigbo uru. Okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ na-esikwu ike ma ndị na-eto eto jiri ndị agadi nọ n’ọgbakọ ha kpọrọ ihe, ndị agadi ejirikwa hanwa kpọrọ ihe. w21.09 7 ¶15-18
Tuzdee, Ọgọst 15
Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe.—Mat. 7:1, 2.
Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị ghara iji obi ọjọọ na-emeso ndị mmadụ ihe. Kama, ka anyị na-eṅomi Chineke anyị, onye ebere ya “na-enweghị atụ.” (Efe. 2:4) Imetere mmadụ ebere abụghị naanị inwe mwute maka ihe mere onye ahụ. Ndị na-emere ndị ọzọ ebere na-eme ihe iji nyere ha aka. Anyị niile kwesịrị ịna-eleru anya ka anyị mata ndị e kwesịrị inyere aka n’ezinụlọ anyị, n’ọgbakọ anyị, nakwa n’obodo anyị. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi meere ndị mmadụ ebere. È nwere onye e kwesịrị ịkasi obi? Ànyị nwere ike inyere ya aka, dị ka ihe atụ, inye ya nri ma ọ bụ imere ya ihe ndị ọzọ dị ya mkpa? È nwere nwanna lọghachiri n’ọgbakọ e kwesịrị imeta enyi ma na-agba ume? Ànyị nwere ike izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke iji kasie ha obi? (Job 29:12, 13; Rom 10:14, 15; Jems 1:27) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ndị e kwesịrị imere ụdị ihe ndị a, ọ ga-eme ka anyị ghọta na ndị e kwesịrị imere ebere juru eju bara abara. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ ebere, ọ ga-eme Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye ebere ya “na-enweghị atụ,” ezigbo obi ụtọ. w21.10 13 ¶20-22
Wenezdee, Ọgọst 16
Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.—Ọma 23:1.
N’Abụ Ọma nke 23, Devid kwuru ihe ndị bara ezigbo uru, ya bụ, uru ndị o ritere n’ihi ikwe ka Jehova bụrụ Onye na-azụ ya. Jehova ‘na-edu ya aga n’ụzọ ziri ezi.’ Jehova na-akwado ya ma mgbe ihe dịịrị ya mma ma mgbe ihe na-adịghịrị ya mma. Devid makwa na “n’ebe ahịhịa ndụ juru” Jehova mere ka ọ makpuru emeghị ka ọ ghara inwe nsogbu ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ime ka obi dị ya ka ọ̀ na-eje ije “na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị.” Ọ ga-enwekwa ndị iro. Ma, ọ gaghị “atụ egwu ihe ọ bụla” ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye na-azụ ya dị ka atụrụ. Gịnị mere Devid ji kwuo na ‘e nweghị ihe ga-akọ ya’? Ebe ọ bụ na o nwere ihe niile ga-enyere ya aka ka ya na Chineke dịrị ná mma, o nweghị ihe kọrọ ya. Ihe na-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ abụghị akụnụba. Obi dị ya ụtọ maka ihe ndị Jehova nyere ya. Ihe kacha ya mkpa bụ na Jehova na-agọzi ya, na-echebekwa ya. Ihe Devid kwuru gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara ikwe ka ihe onwunwe bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. w22.01 3-4 ¶5-7
Tọzdee, Ọgọst 17
A ga-akwụ onye ọ bụla n’ime ha ụgwọ ihe ọ rụrụ.—1 Kọr. 3:8.
Ndị mmadụ egeghị ọtụtụ ndị fere Jehova n’oge gara aga ntị. Dị ka ihe atụ, Noa bụ “onye nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume” ruo ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ afọ iri ise. (2 Pita 2:5) O doro anya na Noa tụrụ anya na ndị mmadụ ga-ege ya ntị. Ma Jehova ekweghị ya nkwa na ọ ga-adị otú ahụ. Kama, mgbe Jehova na-agwa ya ka ọ rụọ ụgbọ ahụ, ọ sịrị ya: “Ị ga-abanye n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.” (Jen. 6:18) Ọ bụrụkwa na Noa chere gbasara otú ụgbọ ahụ ọ ga-arụ ga-aha, ọ ga-abụ na ọ matara na ọtụtụ ndị agaghị ege ya ntị. (Jen. 6:15) Ma, mgbe e mechara, o nwedịghị otu onye chegharịrị n’ụwa ọjọọ ahụ. (Jen. 7:7) Nke ahụ ò mere ka Jehova were ya na Noa arụtaghị ọrụ ya? Mba. N’anya Jehova, Noa mere nke ọma n’ihi na o mere ihe niile Jehova gwara ya mee.—Jen. 6:22. w21.10 26 ¶10-11
Fraịdee, Ọgọst 18
Aka m juru eju mgbe m pụrụ, ma Jehova emeela ka m gbara aka lọta.—Rut 1:21.
Chegodị otú obi ga-adị Rut mgbe ọ nụrụ ka Naomi kwuru ihe ndị a. Rut agbaala ezigbo mbọ iji nyere ya aka. Rut esorola ya bee ákwá, kasie ya obi, sorokwa ya mee njem ọtụtụ ụbọchị. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Naomi sịrị: “Jehova emeela ka m gbara aka lọta.” Ihe ndị a Naomi kwuru mere ka o yie ka ọ̀ bụ na o jighị aka Rut na-enyere ya kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ na ihe ahụ gbawara Rut obi. Ma, ọ kwụsịghị inyere Naomi aka. (Rut 1:3-18) Taa, nwanna nwaanyị nọ ná nsogbu nwere ike gwa anyị okwu ọjọọ n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara inyere ya aka. Ma, ka anyị gbalịa ghara iwere ya iwe. Ka anyị nọgide na-enyere ya aka, na-arịọkwa Jehova ka o nyere anyị aka ịchọta ụzọ ndị anyị ga-esi kasie ya obi. (Ilu 17:17) Nwanna nwaanyị e kwesịrị inyere aka nwere ike ịsị na ya achọghị ka e nyere ya aka. Ma, ịhụnanya pụrụ iche ga-eme ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ya aka.—Gal. 6:2. w21.11 11-12 ¶17-19
Satọdee, Ọgọst 19
Dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme.—1 Pita 1:15.
Na Baịbụl, a na-ejikarị okwu bụ́ “nsọ” na “ịdị nsọ” akọwa ịdị ọcha n’omume ma ọ bụ ife ofufe dị ọcha. O nwekwara ike ịpụta ihe e dowere iche maka ofufe Chineke. E nwekwara ike ikwu na mmadụ dị nsọ ma ọ bụrụ na ọ na-eme omume dị ọcha, na-efe Jehova otú ọ chọrọ, nakwa ma ọ bụrụ na ya na ya dị n’ezigbo mma. Ọ na-eju anyị anya na n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova bụ́ onye dị nsọ chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi. Jehova dị ọcha n’ụzọ niile. Anyị si n’ihe ndị mmụọ ozi nọ nso n’ocheeze ya a na-akpọ ndị seraf kwuru mata ihe a. Ụfọdụ n’ime ha kwuru, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.” (Aịza. 6:3) Ihe mere ndị mmụọ ozi ndị a na Jehova, bụ́ onye dị nsọ, ji dị n’ezigbo mma bụ na hanwa dịkwa nsọ. w21.12 3 ¶4-5
Sọnde, Ọgọst 20
Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.—Efe. 5:15, 16.
Ndị na-eto eto na-echekarị gbasara ihe ha ga-eji ndụ ha eme. Ndị nkụzi ha na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst nwekwara ike ịgba ha ume ka ha banye mahadum, nke ga-eme ka ha nweta ezigbo ọrụ ma bụrụ aka ji akụ̀. Ihe a nwere ike iwekọrọ oge ha. Ma, nne na nna ha na ndị enyi ha n’ọgbakọ nwere ike ịna-agba ha ume ka ha jiri oge ha jeere Jehova ozi. Olee ihe nwere ike inyere onye na-eto eto hụrụ Jehova n’anya aka ikpebi ihe ga-akacha baara ya uru? Ịgụ Ndị Efesọs 5:15-17 na ịtụgharị uche na ya ga-abara ya uru. Ọ bụrụ na onye na-eto eto agụchaa amaokwu Baịbụl ndị a, o nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị bụ “ihe Jehova chọrọ”? Olee ihe m ga-eme ya amasị ya? Olee ihe m ga-eme ya abụrụ na m ji oge m na-eme ihe kacha mma?’ Cheta na “oge a anyị bi na ya jọrọ njọ” nakwa na ụwa a Ekwensu na-achị na-agba egwú ụla ya. w22.01 27 ¶5
Mọnde, Ọgọst 21
N’eziokwu, ụmụnne ya ndị nwoke enweghị okwukwe na ya.—Jọn 7:5.
Olee mgbe Jems ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs? Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara “n’ihu Jems, mechaakwa, pụta n’ihu ndịozi niile.” (1 Kọr. 15:7) Mgbe Jems na Jizọs hụchara, Jems ghọrọ onye na-eso ụzọ ya. Ọ nọkwa ya mgbe ndịozi Jizọs nọ n’ụlọ dị n’elu na Jeruselem na-eche mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa. (Ọrụ 1:13, 14) Mgbe e mechara, Jems sokwa n’òtù na-achị isi n’oge ndịozi. (Ọrụ 15:6, 13-22; Gal. 2:9) Tupu afọ 62 Oge Ndị Kraịst, mmụọ nsọ mekwara ka o deere Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ahụ na-abakwara anyị uru taa, ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. (Jems 1:1) E nwere otu nwoke aha ya bụ Josifọs kọrọ ihe ndị mere n’oge ndịozi Jizọs. O kwuru na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ananayas nwa Anas nyere iwu ka e gbuo Jems. Jems nọgidekwara na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. w22.01 8 ¶3; 9 ¶5
Tuzdee, Ọgọst 22
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?—Mat. 27:46.
Otu ihe anyị ga-amụta n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa bụ na anyị ekwesịghị ịtụwa anya na Jehova ga-ewepụrụ anyị ihe niile nwere ike itinye anyị n’ọnwụnwa. Ebe ọ bụ na a nwara Jizọs ruo ọnwụ, anyịnwa kwesịkwara ịdị njikere ikwesị ntụkwasị obi, ọ bụrụgodị na a ga-anwa anyị ruo ọnwụ. (Mat. 16:24, 25) Ma, obi siri anyị ike na Chineke agaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa ihe anyị ga-edili. (1 Kọr. 10:13) Ihe ọzọ anyị ga-amụta bụ na e nwere ike ịta anyị ahụhụ maka ihe anyị na-emeghị otú ahụ e mere Jizọs. (1 Pita 2:19, 20) Ihe mere e ji na-emegide anyị abụghị n’ihi na o nwere ihe ọjọọ anyị mere. Kama, ọ bụ n’ihi na anyị abụghị nke ụwa, nakwa n’ihi na anyị na-ekwusa ozi ọma. (Jọn 17:14; 1 Pita 4:15, 16) Jizọs ghọtara ihe mere Jehova ji kwe ka ọ taa ahụhụ. Ma, e nwere ụfọdụ ndị na-efe Chineke tara ahụhụ ma na-eche mgbe ụfọdụ ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ụfọdụ mee ha. (Hab. 1:3) Chineke anyị bụ́ onye na-enwe ndidi na onye obi ebere anaghị ewere ha ka ndị na-enweghị okwukwe, kama, ọ ma na nkasi obi nke naanị ya nwere ike inye dị ha mkpa.—2 Kọr. 1:3, 4. w21.04 11 ¶9-10
Wenezdee, Ọgọst 23
Ka ekpere m masị gị ka insens a kwadebere nke ọma.—Ọma 141:2.
Jehova ga-anabata ofufe anyị ma ọ bụrụ na anyị na-efe ya otú ọ chọrọ, hụ ya n’anya ma na-asọpụrụ ya. Anyị ma na Jehova kwesịrị ka e fee ya ofufe. Anyị chọkwara ife ya otú ọ chọrọ. Otu n’ime ụzọ ndị anyị si efe ya bụ ikpe ekpere. Baịbụl ji ekpere anyị si n’ala ala obi kpee tụnyere insens a mụnyere n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. Insens ahụ na-atọ Jehova ụtọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ekpere anyị si n’ala ala obi kpee si ‘eme ya obi ụtọ,’ ọ bụrụgodị na ọ bụ okwu ndị dị mfe ka anyị kwuru. (Ilu 15:8; Diut. 33:10) Ọ na-atọ Jehova ụtọ ịnụ ka anyị na-agwa ya na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Ọ chọrọ ka anyị na-akọrọ ya ihe ndị bụ́ mkpa anyị, olileanya anyị, na ihe ndị na-amasị anyị n’ekpere. Tupu anyị ekpewe ekpere, anyị kwesịrị ibu ụzọ chebara ihe ndị anyị chọrọ ịgwa Jehova n’ekpere echiche. Anyị mee ya, ekpere anyị ga-adị ka insens na-esi ísì ọma anyị mụnyeere Nna anyị nke eluigwe. w22.03 20 ¶2; 21 ¶7
Tọzdee, Ọgọst 24
A ga-eme ka unu ndị a na-akpagbu na anyịnwa nwere onwe anyị mgbe a ga-esi n’eluigwe kpughee Onyenwe anyị Jizọs, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike.—2 Tesa. 1:7.
N’Amagedọn, ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikpebi onye Jehova ga-emere ebere ma ọ bụ onye ọ na-agaghị emere ebere. (Mat. 25:34, 41, 46) Obi ọ̀ ga-esi anyị ike na ihe ọ bụla Jehova kpebiri kacha mma, ka ànyị ga-akwụsị ife Jehova maka na anyị ekwetaghị ihe o kpebiri? O doro anya na anyị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike ugbu a na ihe ọ bụla Jehova kpebiri dị mma n’ihi na ọ ga-eme ka anyị tụkwasị ya obi kpamkpam n’ọdịnihu. Chegodị otú obi ga-adị anyị n’ụwa ọhụrụ Chineke. A gaghịzi enwe okpukpe ụgha ma ọ bụkwanụ ndị azụmahịa anyaukwu ha na ndị ọchịchị na-agbakọ aka eme ka ihe siere ndị mmadụ ike kemgbe ụwa. Ọrịa na nká ga-ala ka naị. Mmadụ agaghịzi na-anwụnahụ anyị. A ga-eke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agbụ ruo otu puku afọ. Nsogbu niile nnupụisi ha kpatara agaghịzi adị. (Mkpu. 20:2, 3) Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ mgbe ahụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi na otú o si eme ihe kacha mma. w22.02 6-7 ¶16-17
Fraịdee, Ọgọst 25
Ndị na-eme udo na-enwe obi ụtọ.—Mat. 5:9.
Jizọs gbara mbọ mee ka ya na ndị mmadụ dịrị n’udo, gbaakwa ndị mmadụ ume ka ha na ndị ha na ha na-ese okwu kpezie. Ọ kụziiri ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jehova nabata ofufe ha, na ha ga-eme ka ha na ụmụnna ha dịrị n’udo. (Mat. 5:23, 24) O nyekwaara ndịozi ya aka ọtụtụ ugboro idozi okwu ha na-ese gbasara onye kacha ukwuu n’ime ha. (Luk 9:46-48; 22:24-27) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme udo, ihe anyị ga-eme abụghị naanị izere ịkpata nsogbu. Anyị kwesịrị ịgba mbọ buru ụzọ mee ihe ga-eme ka anyị na ndị mmadụ mee udo, na-agbakwa ụmụnna anyị ume ka ha dozie esemokwu ha nwere. (Fil. 4:2, 3; Jems 3:17, 18) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe ndị m dị njikere ịhapụ iji mee ka mụ na ndị ọzọ dịrị n’udo? Ọ bụrụ na nwanna emejọọ m, m̀ na-eburu ya iwe n’obi? M̀ na-eche ka ọ bịa ka mụ na ya kpezie, ka ọ̀ bụ m na-ebu ụzọ aga ka mụ na ya mee udo ọ bụrụgodị na m chere na ọ bụ ya mejọrọ m?’ w22.03 10 ¶10-11
Satọdee, Ọgọst 26
A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.—Ọrụ 20:35.
Ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl buru amụma na ndị Chineke “ga-eji obi ha wepụta onwe ha” na-ejere Jehova ozi, na-emekwa ihe Jizọs kwuru. (Ọma 110:3) Amụma a na-emezu taa. Kwa afọ, ndị Jehova na-eji ọtụtụ nde awa na-ekwusa ozi ọma. Ha wepụtara onwe ha na-eme ya. A naghịkwa akwụ ha ụgwọ. Ha na-ewepụtakwa oge na-enyere ụmụnna ha aka, na-egboro ha mkpa ha, na-agba ha ume, na-emekwa ka okwukwe ha na-esikwu ike. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-ejikwa ọtụtụ awa na-akwado ihe omume ha ga-eme n’ọmụmụ ihe, na-agakwa eleta ụmụnna ha iji gbaa ha ume. Gịnị mere ha ji eme ihe ndị a niile? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova na ndị agbata obi ha n’anya. (Mat. 22:37-39) Ihe ndị Jizọs mere gosiri na ọ na-eche gbasara ndị ọzọ karịa onwe ya. Anyị na-agbalị ike anyị niile ịna-eme ka ya. (Rom 15:1-3) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ya, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. w22.02 20 ¶1-2
Sọnde, Ọgọst 27
Unu goo mmadụ ọrụ, unu ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya chi abọọ.—Lev. 19:13.
Ọtụtụ ndị n’Izrel oge ochie bụ ndị ọrụ ubi. A na-akwụ ndị e goro ọrụ ụgwọ ná mgbede ụbọchị ahụ ha rụrụ ọrụ. Iji onye e goro ọrụ ụgwọ ga-eme ka ọ ghara inwe ego ọ ga-eji nye ezinụlọ ya nri n’ụbọchị ahụ. Jehova sịrị: “Ọ dara ogbenye, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya bụ ihe o chekwubere.” (Diut. 24:14, 15; Mat. 20:8) Taa, a na-akwụ ọtụtụ ndị ọrụ ụgwọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’ọnwa. N’ihi ya, ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 19:13 ka bakwara uru taa. Ụfọdụ ndị were ndị mmadụ n’ọrụ na-emegbu ndị ha were n’ọrụ, na-akwụ ha ụgwọ dị ezigbo ntakịrị karịa ihe e kwesịrị ịkwụ ha. Ha ma na e nweghị ihe ọzọ ndị ahụ ga-eme ma ọ́ bụghị ịrụwa ọrụ ahụ ka agụụ ghara igbu ha. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ihe ha na-eme bụ ijichi ụgwọ ọrụ onye ha were n’ọrụ. Onye Kraịst were ndị mmadụ n’ọrụ kwesịrị ichebara ihe a echiche. w21.12 10 ¶9-10
Mọnde, Ọgọst 28
Akpịrị na-akpọ m nkụ.—Jọn 19:28.
Ọ ga-abụ na akpịrị na-akpọ Jizọs nkụ n’ihi ahụhụ ndị ọ tarala. Ọ chọrọ ihe ga-atụjụ ya akpịrị. Jizọs ewereghị ya na onye dị ka ya ekwesịghị ikwu otú ọ dị ya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-ekwu otú ọ dị anyị. Ụfọdụ n’ime anyị anaghị achọkarị ịgwa ndị ọzọ otú ihe si dịrị ha. Ma, ọ bụrụ na ọ daba na anyị chọrọ ka e nyere anyị aka, anyị kwesịrị ikwu ozugbo ka e nyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị emeela okenye ma ọ bụkwanụ na ahụ́ esichaghị anyị ike, anyị nwere ike ịgwa enyi anyị ka o buru anyị gaa ebe anyị ga-azụrụ ihe ma ọ bụ gaa ụlọ ọgwụ. Ọ bụrụ na anyị dara mbà ma ọ bụkwa na o nwere ihe mere obi ji na-ajọ anyị njọ, anyị nwere ike ịgwa otu okenye ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ ma nke a na-akọ ka o gee anyị ntị ma ọ bụ gwa anyị “okwu ọma” ga-eme ka obi dị anyị mma. (Ilu 12:25) Ka anyị chetakwa na ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya, ha chọkwara inyere anyị aka ‘n’oge nsogbu.’ (Ilu 17:17) Ma, ha agaghị amatali ihe dị anyị n’obi. Ha agaghị ama na anyị chọrọ enyemaka, ọ gwụla ma ànyị gwara ha. w21.04 11-12 ¶11-12
Tuzdee, Ọgọst 29
Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà ma nsogbu bịara gị, ike ga-agwụ gị.—Ilu 24:10.
Ọ naghị adịrị ọtụtụ n’ime anyị mfe ma ihe gbanwee ná ndụ anyị. A gbanweerela ụfọdụ ụmụnna anyị jerela ozi oge niile pụrụ iche ruo ọtụtụ afọ ọrụ ha ma ọ bụkwanụ kwụsị ụfọdụ n’ime ha ọrụ kpamkpam. Ụfọdụ akwụsịkwala ozi ha na-eje na-atọgbu ha atọgbu n’ihi na ha emeela agadi. O nwere ike ịna-ewute anyị ma ụdị ihe a mee anyị. Ọ ga-aka adịrị anyị mfe ịnabata mgbanwe ma ọ bụrụ na anyị agbalịa lee ihe anya otú Jehova si ele ya. Jehova na-arụ ọtụtụ ihe taa. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na ya na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) Otú Jehova si hụ anyị n’anya anaghị agbanwe agbanwe. N’ihi ya, ọ bụrụ na mgbanwe nzukọ Jehova mere agbasa gị, anọkwala na-echegbu onwe gị gbasara ihe mere e ji mee mgbanwe ahụ. Kama ịna-achọ ka ihe dịrị gị otú ọ dị ‘n’oge gara aga,’ kpee ekpere ma rịọ Jehova ka o mee ka ị hụ uru mgbanwe ahụ bara. (Ekli. 7:10) Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-eme ka anyị jiri ọṅụ nọgide na-efe Jehova, ọ bụrụgodị na ihe agbanwee ná ndụ anyị. w22.03 17 ¶11-12
Wenezdee, Ọgọst 30
Jehova, Jehova, Chineke . . . na-egosi puku kwuru puku ọgbọ ịhụnanya pụrụ iche.—Ọpụ. 34:6, 7, ihe e dere n’ala ala peeji ya.
Olee ndị Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche? Ọ bụ naanị mmadụ ka a na-egosi ịhụnanya pụrụ iche. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche. Ndị ọ na-egosi ụdị ịhụnanya a bụ ndị ya na ha dị n’ezigbo mma. Chineke anyị hụrụ ezigbo ndị enyi ya n’anya. O nwere ihe magburu onwe ya o zubere imere ha. Ọ gaghịkwa ahapụ ime ya. Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya. Jizọs gwara otu nwoke aha ya bụ Nikọdimọs, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:1, 16; Mat. 5:44, 45. w21.11 2 ¶3; 3 ¶6-7
Tọzdee, Ọgọst 31
Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.—Luk 21:19.
Ndụ siri ike n’ụwa a anyị nọ n’ime ya. Ihe nwekwara ike ịka njọ n’ọdịnihu. (Mat. 24:21) Anyị na-atụsi anya ike otu ụbọchị mgbe nsogbu ndị a niile na-agaghị adịkwa, mgbe ha ga-abụ ihe e ji akọ akụkọ na ihe e chefuru echefu. (Aịza. 65:16, 17) O doro anya na anyị kwesịrị ịnọgide na-agbalịsi ike ka anyị na-atachi obi. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.” (Luk 21:19) Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ndị ọzọ si tachie obi n’ụdị nsogbu ndị anyị na ha na-alụ, ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi. Ònye kacha atachi obi? Ọ bụ Jehova Chineke. Ò juru gị anya? O nwere ike iju gị anya ma ọ bụrụ na i chebaraghị ya echiche. Ọ bụ Ekwensu na-achị ụwa a anyị nọ n’ime ya. Ọ bụ ya mere nsogbu ji jupụta na ya. Jehova nwere ikike ịkwụsị nsogbu niile n’otu ntabi anya. Ma, ọ na-eche ka ụbọchị ọ kara aka ịkwụsị ha ruo. (Rom 9:22) Ma, Chineke anyị ka na-atachi obi ruo mgbe oge ahụ ga-abịa. w21.07 8 ¶2-4