Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/1 p. 29-31
  • Jiri Ihe Onwunwe Gị Nye Jehova Nsọpụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ihe Onwunwe Gị Nye Jehova Nsọpụrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịma Mma nke Ịbụ Onye Na-eto Eto—Ike na Ịnụ Ọkụ n’Obi
  • Onye Ozizi Ukwu Anyị Na-ezi Anyị Ihe
  • Ịba Ọgaranya n’Okwukwe na n’Ọrụ Ọma Ọ Bụ Ezie na 0 Nwere Nkwarụ
  • Onye Ọ Bụla Pụrụ Iji Onyinye ‘Mejuo Aka ya’
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/1 p. 29-31

Jiri Ihe Onwunwe Gị Nye Jehova Nsọpụrụ

ABỤGHỊ m ọgaranya; abụ m nanị onye na-eto eto, enwekwara m nanị ihe onwunwe ole na ole.’ ‘Agụghị m oké akwụkwọ; gịnị ka m pụrụ inye Jehova?’ ‘Enwere m oké nkwarụ; Jehova ga-elefurugodị m anya.’ ‘Emewo m agadị; oge agabigawo mgbe m ga-enwe ike inweta ihe onwunwe.’

Echiche ndị dị otú a hà na-abata n’uche gị mgbe ị na-atụle isiokwu nke Ihe odide a? Ma, ị pụrụ inwe ihe onwunwe karịa otú i chere. Cheta okwu Onyenwe anyị Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Smụana: “Amatara m mkpagbu gị, na ogbenye ị bụ (ma ị bụ ọgaranya).” (Mkpugbe 2:9) Tupu mgbe ahụ, Jisọs ekwuwo n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, sị: “Kwụsịnụ ịkpadoro onwe unu akụ n’elu ala . . . Kama, kpadooronụ onwe unu akụ n’eluigwe . . . N’ihi na ebe akụ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Matiu 6: 19-21, NW) Okwu ndị a nke Onyenwe anyị hà na-akwalite mmụọ gị? Ee, ọ pụrụ ịdị ihe dị n’ime gị nke Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, were n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Ka anyị nyochaa.

Ịma Mma nke Ịbụ Onye Na-eto Eto—Ike na Ịnụ Ọkụ n’Obi

Olee otú onye na-eto eto ga-esi jeere Jehova ozi bara uru? Ilu 20:29 na-ekwe anyị nkwa na ndị na-eto eto nwere akụ mara mma—ike anụ ahụ. Lee ka ọ na-esi enye ume ọhụrụ ịhụ ka onye na-eto eto tinyere ume na ịdị ọhụrụ ya n’ijere Chineke anyị ozi!

Ka anyị laa azụ n’akụkọ ihe mere eme gaa ná mmalite afọ ndị 1930 mgbe ọtụtụ ndị na-eto eto nụrụ ihe banyere eziokwu ahụ nke dị n’ime Bible. Otu onye gbara 16 afọ gbazitere n’aka enyi ya akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ Creation, nke Watch Tower Society bipụtara. Ka ọ na-erule n’isiokwu ahụ bụ “Ihe Okike Ọhụrụ ahụ,” wee gụọ ihe banyere odudo nsọ, ọ matara ihe ọ chọrọ iji ndụ ya mee. Ozugbo ahụ, ọ raara onwe ya nye Onye Okike ahụ pụrụ ime ihe nile. N’afọ na-eso ya, ọ gụrụ akwụkwọ ọzọ, bụ Vindịcation (Akwụkwọ nke Mbụ), wee mụta ihe banyere ohere nke ikere òkè n’iwepụ aha na ịbụ ọkaaka nke Chineke n’ụta. Ihe ọmụma nke a kpaliri n’ime ya oké ọchịchọ nke ịje ozi oge nile. N’otu afọ ahụ, o tinyere akwụkwọ ịrịọ ka e nye ya ihe ùgwù nke ịbụ onye ọsụ ụzọ, ruokwa taa, ọ ka nọ n’ije ozi oge nile. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ndị ha na ya toro n’otu mgbe ejezuwo ozi elu ala ha, ọtụtụ n’ime ha ndị ka nọ ndụ ka na-egosi mmụọ nke iji mkpụrụ obi ha nile rara onwe ha nye Nna anyị nke eluigwe.

Ndị na-eto eto bụ ndị Kraịst taa hà na-egosipụtakwa otu àgwà ọma nke a? Ha na-eme otú ahụ n’ezie! Akụkọ ndị dị na Yearbook na-egosi na ìgwè mmadụ ndị yiri igirigi na-esonyere ìgwè ndị ọrụ ọsụ ụzọ ugbu a. (Abụ Ọma 110:3) Mba Philippines nyere akụkọ na 13 pasenti nke ndị ọsụ ụzọ oge nile ha nwere agbarubegbị 20 afọ. Ọ̀ dịkwa otú ahụ n’ebe ndị ọzọ? Ee, ọ dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere n’agwaetiti nta nke Trinidad and Tobago na-egosi na e debara aha 282 ndị ọsụ ụzọ oge nile ndị ọhụrụ n’agbata September 1, 1986, na September 30, 1988. N’etiti ndị ahụ, 48 agbarubeghị 20 afọ. Ọ̀ ga-amasị gị ịnụrụ okwu site n’ọnụ otu n’ime ha?

Nke a bụ Charmaine Francis. Nwa agbọghọ ahụ sịrị: “Malite na mgbe m bụ nwata e ku n’aka, ndị mụrụ m na-agwa m okwu banyere ijere Jehova ozi na ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye ya. Mgbe ndị mụrụ m jụrụ m ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na a tụọ ha mkpọrọ n’ihi ikwusa ozi ọma, ana m aza, sị, ‘M ga-ejere Jehova ozi.’ Araara m onwe m nye mgbe m dị 13 afọ, meekwa baptism mgbe m dị 14 afọ. Ozugbo nke ahụ gasịrị, mgbe ọ bụla anyị nwere ezumike ụlọ akwụkwọ, ana m ekere okè n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Na 1983, amalitere m ozi ọsụ ụzọ oge nile. N’afọ mbụ m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ, enwere m ọṅụ nke inyere otu nwanyị lụworo di aka ịghọ onye na-ejere Jehova ozi. Ana m eduzi ọmụmụ Bible itoolu ugbu a. Otu n’ime ha na-akwadebe ime baptism, atọ ndị ọzọ na-abịakwa nzukọ dị iche iche.”

Ugbu a, ndị na-eto eto, ọ̀ bụ na unu ekweghị na unu nwekwara ihe bara uru unu pụrụ iji nye Jehova nsọpụrụ? N’ezie, unu nwere! Ọbụna ma a sị na ị nọghị n’ozi oge nile ugbu a, ị pụrụ inye Jehova nsọpụrụ dị ka ọnọdụ gị si dị. Ọ pụrụ ịbụ na ị ka nwere ọtụtụ afọ nke ije ụlọ akwụkwọ n’ihu gị. N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ohere dị nnọọ mma nke ito Jehova n’ebe ndị nkuzi na ụmụ klasị ibe gị nọ. Christian Kalloo, onye gbara afọ iri, ji akwụkwọ Life—How Dịd It Get Here—By Evolution or by Creation? nke ya bịa akwụkwọ. Gịnị si na nke a pụta? O tinyere mkpụrụ asaa n’aka ndị nwere mmasị n’isiokwu ahụ. O tinyekwara otu n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ị pụkwara ime ihe yiri nke ahụ. —Tụlee Matiu 21:15, 16.

Onye Ozizi Ukwu Anyị Na-ezi Anyị Ihe

Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta.” O nyere Jehova otuto maka ikike o nwere ikwuwa okwu. O dekọkwara nkwa Jehova, bụ́: “Mmụọ m nke dị n’ahụ gị, na okwu m nile nke m tinyeworo n’ọnụ gị, agaghị apụ n’ọnụ gị, na n’ọnụ mkpụrụ gị, na n’ọnụ mkpụrụ nke mkpụrụ gị.” (Aịsaịa 50:4; 59:21) Dị nnọọ ka ndị ikom na-agụghị oké akwụkwọ, ndị bụkwa ndị nkịtị, ghọrọ ndị ozi Jisọs, Chineke mekwara ka ha bụrụ ndị maara ihe n’ihe ime mmụọ, otú ahụ ka Jehova meworo ka ndị nkịtị bụrụ ndị maara ịhe taa.

Akwụkwọ Yearbook nke 1986 nwere okwu agbamume nye ndị ahụ na-enweghị mmụta akwụkwọ dị ukwuu. N’ọtụtụ mba, Ndịàmà Jehova na-eme ndokwa maka klasị ebe a na-amụ otú e si agụ na otu e si ede ihe iji kuziere ndị tozuworo ogo mmadụ otú e si agụ ihe. Lee nnọọ ka Jehova siworo gọzie ndị dị otú ahụ! Site na 1962 ruo 1984 na Nigeria, ihe dị ka 19,238 enwewo ọganihu magburu onwe ya n’ịmụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe, ha nwekwara ike ịgụrụ onwe ha Bible ugbu a, nweekwa ike ịgụrụ ya ndị ahụ ha na-agbara àmà. Lee nnọọ ngọzi bara ụba ha nwetaworo! Otu nwanna mere nke ọma nke na ọ ghọrọ onye nkuzi nke klasị ndị na-amụ otú e si agụ ihe n’ọgbakọ ya.

Tụleekwa ahụmahụ nke Ezekiel Ovbiagele. Ọ maghị otú e si agụ ihe mgbe o mere baptism na 1940. Mgbe ọ mụtasịrị otú e si agụ ihe, o nwere ọganihu ruo n’ịghọ onye e debara aha ya dị ka onye ọsụ uzọ, mgbe oge ụfọdụ gasịkwara na 1953, a họpụtara ya dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.

Afọ ndụ anaghị egbochi usoro mmụta ihe. Ụfọdụ ndị pụrụ ihota ilu ochie ahụ bụ: “Ị pụghị ikuziri nkịta meworo agadị ụdị egwuregwu ndị ọhụrụ!” Nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu n’ihe banyere nkịta, ma ndị mmadụ abụghị ụmụ anụmanụ. Ọbụna ndị meworo okenye pụrụ ịmụta ihe, ha na-amụtakwa ihe ma ọ bụrụ na ha chọrọ n’ezie ịmara ma na-ejere Jehova ozi. Ị pụrụ ịmara ụfọdụ ndị meworo otú ahụ. Dị ka ihe atụ, a gbara Alice Okon nke bi na Nigeria ume ịgụ Bible ma mụta ihe banyere olileanya nke ọ na-esetịpụ; ọ naara ihe ọmụma ahụ, nweekwa ọṅụ n’olileanya ahụ dị n’ihu. N’ịbụ onye gbaworo 80 afọ, o mebegbị agadị gabiga okè nke na ọ pụkwaghị ịmụta ihe. Ì chere na o meghị ka obi Jehova ṅụrịa? O nwere okwukwe dị ukwuu. Ilu 3:14 na-emesi anyị obi ike na inwe amamihe “dị mma karị ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karị ọlaedo ọma.” Mgbe mmadụ nwere ike ikwu okwu nke eziokwu ahụ nke ọma, okwu ya na-eyi “mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha.”—Ilu 25:11; Ndị Kọlọsi 3:16.

Ịba Ọgaranya n’Okwukwe na n’Ọrụ Ọma Ọ Bụ Ezie na 0 Nwere Nkwarụ

Mmadụ nke nwere nkwarụ anụ ahụ site n’afọ nne ya pụrụ inwe mmetụta nke nkụda aka mgbe ọ na-emewanye okenye, na-amatakwa ọnọdụ ya. Ọ na-abụkwa ihe siri oké ike mgbe mmadụ malitere inwe ọrụsị mgbe o meworo okenye. Ọnọdụ nke ụdị ndị ahụ ọ̀ bụ nke olileanya na-adịghị na ya? Ee e, ọ pụrụ ọbụna imegbe ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

N’oge Agha Ụwa nke Mbụ, Edward Stead nwere ụlọ ọrụ ebe ọ na-elekọta ụmụ anụ nke dị n’obodo nta nke Arvada, Wyoming, U.S.A., nwunye ya nwekwara otu obere ụlọ oriri. Ịbụ onye ajọ ọrịa ahụ ọkụ ahụ si Spain metụtara mere ka ike nguzogide ọrịa ya dị ala, ọrịa akwara bụ rheumatoid arthritis wee jide ya, bụ nke kpọchisịrị nkwonkwo ya nile wee hịkọsịa ahụ ya gaa n’ọdịdị nke oche ndị ngwụrọ ahụ ọ na-anọ na ya. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ ọ pụrụ ime, ọ ka nwere ike ikwu okwu, o nwekwara ike imegharịtụ aka ya nke nta. Ruo nwa mgbe nta, ọ tụlere echiche nke igbu onwe ya. Mgbe ahụ, ọ nụrụ eziokwu ahụ, wee jiri ịnụ ọkụ n’obi nakwere ya.

Ná mmalite, ọ na-anọdụ n’ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ oriri ahụ wee na-agwa ndị na-abịa ebe ahụ okwu banyere okwukwe ọhụrụ ya. O nwere ike imegharị aka ya ruo n’okè nke ịsaghe akwụkwọ ndị ahụ dabeere na Bible iji gosi ndị ahụ kwụsịrịnụ ige ya ntị. Ụfọdụ ndị nwere mmasị ná mgbalị ya kpọrọ ya onye ngwụrọ ahụ na-anya ụgbọ elu. Ọzọ, o kpebiri na ya pụrụ ịgba àmà n’obodo ndị ọzọ ma ọ bụrụ na e wuoro ya otu ihe pụrụ iche n’elu moto pickup. E mere nke a, ruokwa ọtụtụ afọ, ọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ụzọ nke a pụrụ iche, na-aga njem ọtụtụ puku maịlụ site Wyoming ruo Texas, ya na ụmụ okorobịa ndị ọsụ ụzọ abụọ ma ọ bụ atọ ndị na-elekọta ya. Ruo ogologo oge nile ọ dị ndụ, ọ bụụrụ ndị nile maara ya isi iyi nke agbamume.

Ọ bụrụ na ị na-enwe mmetụta nke nkụda aka n’ihi ịbụ onye nwere nkwarụ, biko gụọ akụkọ ahụ dị na peji 22-25 nke Ụlọ Nche (Bekee) November 15, 1986. Ndị ikom nile a kpọtụrụ aha n’ebe ahụ bụcha ndị okenye ọgbakọ, ndị ndụmọdụ ime mmụọ, ndị ruru eru inye ụmụnna ha nkasi obi, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha zuru okè n’anụ ahụ, ma nwee mkpa ịbụ ndị e wuliri elu n’ime mmụọ. Lee ka ha si bụrụ ndị bara ọgaranya n’anya Chineke!—1 Timoti 6:18.

Esterleta Dịck, onye gbaworo 63 afọ, abụwo Onyeàmà e mere baptism ruo 16 afọ. Na 1978, ìsì kpuru ya, ma ọ nọwo na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile kemgbe afọ abụọ gara aga. Olee otú nke a si kwe omume? Ọ dị mma, ka ọ zaa n’onwe ya.

Ọ sịrị, “Otu ụbọchị, otu nwanna nwa agbọghọ bụ onye ọsụ ụzọ jụrụ m, sị: ‘Nwanna nwanyị Dịck, ị na-eru ihe mgbaru ọsọ gị mgbe nile dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka. Gịnị mere ị gbalịghị ịghọ onye ọsụ ụzọ oge nile?’”

Esterleta tụrụ egwu na ya ga-abụrụ ụmụnna ihe mgbochi, ma o chetara na onye nlekọta sekit gbara ume maka ije ozi ọsụ ụzọ. Ọ sịrị: “Amalitere m, ugbu a, anọwokwa m afọ abụọ n’ije ozi ọsụ ụzọ. Ana m agba àmà okporo ụzọ, enwekwara m ọtụtụ nletagbachi. Karịsịa, ana m eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi isii. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Tupu m jee na nke onyenwe ụlọ, a na-agụpụtara m ebe ihe ọmụmụ ahụ sitere n’ụlọ. ya na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara, nke mere na ana m enwe ike itinye ọnụ n’ọmụmụ ihe ahụ. Atọ n’ime ndị m na-eduziri ọmụmụ Bible na-eso m eje nzukọ dị iche iche, otu emewokwa baptism.”

Onye Ọ Bụla Pụrụ Iji Onyinye ‘Mejuo Aka ya’

Inye ihe ọ̀ bụ nanị n’ụzọ ime mmụọ? Ee e. Mgbe Eze Devid oge ochie na-eme nkwadebe maka iwu ụlọ nsọ ahụ, ọ jụrụ, sị: “Ònyekwa na-enwe afọ ofufo nye onwe ya imejuru Jehova aka ya taa?” (1 Ihe Emere 29:5) Onye ọ bụla pụrụ ime otú ahụ. Otú ahụkwa taa, ma ụmụntakịrị ma ndị okenye, ma hà nọ n’ahụ ike ma ọ bụ na ha anọghị, ọtụtụ ndị na-achọ inye onyinye afọ ofufo maka iji hụ na ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu. A pụrụ ime nke a site n’alaka ụlọ ọrụ dị ná mba nke onye ahụ ma ọ bụ site n’ọgbakọ ya. N’ụzọ dị otú a, ruo ókè ike onye ọ bụla ruru, onye ọ bụla pụrụ inye aka n’ibu ibu mmefu a na-eme iji hụ na e kwusara ozi ọma nke a n’elu ụwa dum mmadụ bi. Ọ bụ ihe ùgwù.—2 Ndị Kọrint 9:8-12.

Nke ka mkpa, i nwere ihe onwunwe ime mmụọ ị ga-eji nye Jehova nsọpụrụ. Ndị na-eto eto nwere ike na ịdị ọhụrụ nke ịbụ ndị na-eto eto. Ndị na-amaghị akwụkwọ pụrụ ịmụta inye Jehova mkpụrụ nke egbugbere ọnụ ha. Ndị nwere nkwarụ pụrụ inwe ọganihu, ha emewokwa otú ahụ, n’inweta ihe ọmụma, amamihe, na nghọta, nke na ọtụtụ n’ime ha abụghị nanị na ha bụ ndị na-eto Jehova n’oge nile, kama ha bụkwa ndị na-enye ndụmọdụ na ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ̀ bụ na ị baghị ọgaranya karịa otú i chere? Ya mere, jiri ihe onwunwe gị nye Jehova nsọpụrụ.—Ndị Hibru 13:15, 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya