Ịnagide Imempụ n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
EGWU ọ̀ na-atụ gị ịpụ ezi n’abalị? Ọ̀ dị gị mkpa inwe ihe abụọ ma ọ bụ atọ i ji akpọchi ọnụ ụzọ na window gị dị iche iche? Ọ̀ dịtụwo mgbe e zuuru moto ma ọ bụ ịnyịnya ígwè gị? Ọ̀ dịwo mgbe a dọkapụrụ redio dị n’ime moto gị? Ị̀ na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a na-eyi egwu mgbe ị nọ n’ógbè ụfọdụ?
Ọ bụrụ na ị zaa ee nye nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a, mgbe ahụ, ị na-agbalị ịnagide imempụ n’ime ụwa nke nọ n’ọgba aghara. Gịnị ka ị pụrụ ime banyere ya? Bible ọ̀ pụrụ inyere gị aka ịnagide ya?
Echiche Ndị Omempụ na Ikpe Ziri Ezi
N’ihe banyere imempụ, e nwere isi ihe atọ dịnụ: ndị omempụ, ndị uwe ojii, na ndị ndị omempụ wakwasịrị. Gịnị dị mkpa ka gị onwe gị, bụ́ onye ha pụrụ ịwakwasị, nwee ike ịnagide imempụ? Ọ̀ dị ihe i nwere ike ime nke pụrụ imetụta nke ọ bụla n’ime ihe atọ ndị a? Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ ịgbanwe ndị omempụ ahụ?
N’ezie, ọtụtụ ndị omempụ emewo ka imempụ bụrụ ọrụ ha na-arụ ná ndụ. Ha ahọrọwo ya dị ka ụzọ ndụ nke dị mfe karị. Echiche ha yiri ka ọ̀ bụ, ‘N’ihi gịnị ka ị ga-eji rụọ ọrụ ma ọ bụrụ na ị pụrụ iji ihe ndị ọzọ kpataworo wee na-akwado ndụ gị?’ Ndị omekome na-awakwasị ndị mmadụ maara na ndị ahụ ha na-awakwasị ga-achọkarị inyefe ha ego ha n’alụghị ọgụ ọ bụla. Ebe ọ bụkwa na e nweghị ohere dị ukwuu nke ha ịbụ ndị e jidere ma tụọ ha mkpọrọ, nye ha, imempụ na-aba uru n’ezie.
Ọzọkwa, usoro ụlọ ikpe anaghị aga were were, ọ na-egbukwa oge. N’ọtụtụ mba, e nweghị ụlọ ikpe, ndị ọkà ikpe, na ụlọ mkpọrọ zuru ezu. Okwu imempụ ndị a ga-eleba anya na ha na-anyịji usoro ahụ aka. Usoro ikpe ziri ezi na-aga nwayọọ nwayọọ nke na ọnọdụ ahụ dị otú ahụ Bible si kọwaa ya n’ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, sị: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.” Dị ka ụkpụrụ Bible nke a na-egosi, e nwere nanị olileanya dị nta nke inwe ihe ngwọta site n’ibelata ọnụ ogụgụ ndị omempụ ma ọ bụ ịgbanwe ha.—Eklisiastis 8:11.
Gịnị banyere ihe nke abụọ ahụ, bụ́ ndị uwe ojii? È nwere olileanya ọ bụla na ndị uwe ojii ga-enwe ike ịchịkwa ọnọdụ ahụ? Ha onwe ha ga-aza, sị: Ebe a na-agbagọ iwu ndị e nwere maka ọdịmma nke ihe ruuru ndị omempụ, ebe e nwere ndị ọkà iwu ndị na-ejikarị nkà iwu mee ka onye ikpe mara laara onwe ya, ebe ndị obodo dị iche iche na-adịghị njikere ibu ibu oké mmefu nke inwekwu ọtụtụ ụlọ mkpọrọ ndị buru ibu karị, ebe ndị uwe ojii na-enweghịkwa ndị ọrụ zuru ezu, ọ bụ nanị ihe dị nta ka ha pụrụ ime iji megide oké ntiwapụta nke imempụ.
Nke fọdụrụ bụ ihe nke atọ ahụ, bụ́ ndị ahụ imempụ pụrụ imetụta: bụ́ anyị, ndị ọha mmadụ. Ọ̀ dị ihe ọ bụla anyị pụrụ ime iji nyere onwe anyị aka ịnagide nke ọma karị ọnọdụ nke a nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nwekwaghị nchịkwata?
Ezi Amamihe na Ichezi Echiche
Akwụkwọ Bible bụ Ilu na-asị: “Chebe nzube ihe na izuzu; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ, bụkwaara olu gị amara. Mgbe ahụ ka ị ga na-eje ije n’ụzọ gị ná ntụkwasị obi, ị gaghị akpọbikwa ụkwụ gị.” A pụrụ itinye ndụmọdụ nke a n’ọrụ n’ọnọdụ ndị pụrụ ime ka mmadụ daba n’aka ndị omempụ. Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ ezi amamihe pụrụ isi nyere anyị aka n’ihe banyere nke a?—Ilu 3:21-23.
Ndị omempụ na-eyikarị anụ ndọgbu. Ha na-achọ ndị ọ ga-akasị dịrị ha mfe ịwakwasị. Ha achọghị ịbanye n’ihe ize ndụ nke ịlụ ọgụ ma ọ bụ njide ebe ọ bụ na ha pụrụ inweta otu ihe ahụ site n’onye nke dịịrị ha mfe. Ya mere, ndị ha na-awakwasịkarị bụ ndị agadi, ndị na-arịa ọrịa, ndị na-amaghị ụzọ, na ndị ọ pụrụ ịbụ na ha amaghị ọnọdụ ize ndụ dị n’ebe ahụ. Ndị omekome na-ahọrọ ebe na oge kasị kwesị ekwesị maka ịwakwasị ndị mmadụ. Ọ bụ n’ebe a ka onye pụrụ ịdaba n’aka ha pụrụ iji ezi amamihe mee ihe.
Dị ka Bible si kọwaa ha, ndị hụrụ ihe ọjọọ n’anya na-arụkarị ọrụ ha n’okpuru ihe mkpuchi nke ọchịchịrị. (Ndị Rom 13:12; Ndị Efesọs 5:11, 12) Ọ bụ eziokwu taa na ọtụtụ mpụ a na-eme megide ndị mmadụ na ihe onwunwe ha bụ ndị a na-eme n’anyasị. (Tụlee Job 24:14; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:2.) N’ihi ya, mgbe ọ bụla o kwere mee, onye nwere amamihe ga-ezere ịnọ n’ezi n’ógbè ebe dị ize ndụ n’oge abalị. N’obodo New York ahụ nke jupụtara n’imempụ, ihe ndekọ ndị uwe ojii na-enwe kwa ụbọchị na-egosi na ndị omekome na-awakwasị ọtụtụ ndị mgbe anyanwụ dasịrị, karịsịakwa, mgbe elekere iri nke anyasị gasịrị, ọ na-abụkarịkwa mgbe ha na-alaghachi n’ebe obibi ha dị iche iche. Ndị mwakwasị ndị ahụ na-anọ n’ụzọ ndị tọgbọ chakoo na-achọ ndị ha ga-awakwasị. Ya mere, ọ bụrụ na i nwere ohere ime nhọrọ n’etiti ichere ụgbọ bọs ma ọ bụ taksi, ma ọ bụkwanụ iji ụkwụ gabiga ógbè ebe dị ize ndụ, nwee ndidi ma chere. Ma ọ bụghị otú ahụ, ahụmahụ ị ga-enweta pụrụ ịbụ ihe mgbu.
E tiri otu onye Kraịst ihe nke ukwuu, zuokwa ya ohi mgbe o ji ụkwụ gaa ije na-adịghị ogologo n’ebe fọrọ nke nta ka ọ gbachie ọchịchịrị kama ichere bọs n’ihe dị ka elekele iri nke abalị. E nwere ndị ọzọ nọ n’okporo ụzọ ahụ, ma ndị omekome atọ esiworo ndị na-elezighị anya ọnyà. Otu n’ime ha gbaara ndị nke ọzọ àmà mgbe onye ha chọrọ ịwakwasị malitere ịgbagote n’okporo ụzọ ahụ. N’ekwughị okwu ọ bụla, ha wakwasịrị onye ahụ, wee zuo ya ohi. Ha mere oké ngwa ngwa ọbụna nke na otu onye agbata obi enweghị ohere ime ihe ọ bụla iji gbochie ha. Onye ahụ ha wakwasịrị mesịrị nakwere, sị: “Mgbe ọzọ, aga m echere bọs.”
Onye Ọkà Nzopụ ahụ, bụ́ otu nwa okoro nke na-ama aka n’akpa n’akwụkwọ Dickens bụ́ Oliver Twist, bụ ihe atụ na-adịghị eyi egwu nke ụdị ndị nnupụisi na-anọ n’okporo ụzọ n’oge a. N’adịghị ka Onye Ọkà Nzopụ ahụ, ndị ohi na ndị omekome nke oge a, n’agbanyeghị afọ ndụ ha, yikarịrị ka hà ga-eji égbè ma ọ bụ mma, ha ga-ejikwa ya eme ihe. Ndị njem na-amachaghị ụzọ, ndị bịara abịa, na ndị na-eme mkpagharị efu n’ime obodo ukwu nke na-ekwo ekwo na-adịkarịrị ndị omekome dị otú ahụ mfe ịwakwasị. Ha ga-ezuru ihe ọ bụla i ji oké ngwa ngwa tupu otu ntabi anya agabiga! Gịnị pụrụ inye onye ohi oké mkpali? Ihe a na-anya n’olu e ji ọlaedo mee ma ọ bụ ọla ndị ọzọ dị oké ọnụ ndị a na-agba ebe a ga na-ahụ ha anya. Ma ọ bụ kamera nke onye njem nya n’olu ya. O yiri nnọọ iyikwasị ihe e dere ede nke na-asị, “Bịanụ were m!” Otú a, ọ dị mkpa iji ezi uche mee ihe. Zochie ọla ọ bụla dị n’ahụ gị ezochi, jirikwa kamera ahụ otú ọ na-agaghị apụtacha ìhè, ma eleghị anya na-etinye ya n’ime akpa. Nke a bụ ezi amamihe.
Ịmụrụ anya bụkwa ụzọ ọzọ e si eme ihe megide imempụ. Bible na-asị: “Onye maara ihe, anya ya abụọ dị n’isi ya, ma onye nzuzu na-ejegharị n’ọchịchịrị.” (Eklisiastis 2:14) Itinye ịdọ aka ná ntị nke a n’ọrụ n’ihe banyere nsogbu nke imempụ ga-eduje mmadụ n’ịrịba ama ndị na-akpagharị n’ụzọ a na-enyo enyo, ndị na-enweghị nzube ọ bụla pụtara ìhè. Na-elepụ anya maka ndị ohi ndị pụrụ ịbịa n’azụ gị ma pụnara gị akpa gị mgbe ị na-aga n’akụkụ ụzọ. Ebe ọ bụ na ụfọdụ na-anọ n’ọgba tum tum ma pụnara ndị mmadụ ihe ha mgbe ha na-agbafere, agala ije kpọmkwem n’akụkụ okporo ụzọ ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na i bu obere igbe ma ọ bụ akpa nta ọ bụla. Zere ịbanye ụgbọ okporo ígwè ndị na-agba n’okpuru ala ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nweghị onye ọzọ nọ n’ime ha. Ị na-anọ ná nchebe karị mgbe e nwere ìgwè ndị mmadụ n’ebe ìhè dịkwa nke ọma. Ndị ohi achọghị ka a hụ ha ma mara ndị ha bụ.
Ohi ntika ụlọ bụkwa imempụ ọzọ a na-emekarị nke a pụrụ izere ọtụtụ mgbe ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ mụ anya karị n’ihe banyere imempụ. Bible ji ihe ịma atụ ziri ezi mee ihe, bụ́: “Ha si na window nile aba n’ime dị ka onye ohi.” (Joel 2:9) Ezi amamihe chọrọ gị n’aka na i kwesịghị ịhapụ ọnụ ụzọ ma ọ bụ window gị n’akpọchighị ha akpọchi. Ọ na-abụ eziokwu mgbe nile na mgbochi na-adị mma nke ukwuu karịa ọgwụgwọ. Imefukwu ego iji chebe ebe obibi gị bụ n’ezie ihe nchebe megide izu ohi na mmerụahụ.
Gịnịkwanụ Ma Ọ Bụrụ Na A Wakwasị Gị?
Ee, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na, n’agbanyeghị ihe mgbochi nile i mere, onye omekome akwụsị gị n’ụzọ? Gbalịa ka ahụ ghara ịma gị jijiji ma ọ bụkwanụ ka ị ghara ime ka ị̀ ga-agba ọsọ. Cheta na ọ pụkwara ịbụ na ahụ erughị onye ohi ahụ ala, na ọ pụkwara ịghọtahie ihe ị na-eme. Gbalịa iso onye ahụ kwurịta okwu, tụgharịtakwa uche ma ọ bụrụ na onye ahụ ekwere ka e mee otú ahụ. (Ee, onye ahụ na-awakwasị gị pụkwara ịbụ nwanyị.) Mgbe ụfọdụ, e mewo ka obi dajụlata ndị omekome site n’ime ka ha mara na onye ha na-awakwasị bụ ezi onye Kraịst nke nwere obi eziokwu. N’agbanyeghị ihe bụ mmeghachi omume ya, anwala anwa iguzogide ya ma ọ bụrụ nanị ego ma ọ bụ ihe onwunwe gị ka ha chọrọ. Nyefee ha ihe ọ bụla ha sị gị nye ha. Bible na-akụzi na ndụ mmadụ dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla ọ pụrụ inwe.—Tụlee Mak 8:36.
N’emeghị ka o yie ka ị̀ na-enyocha ya enyocha, gbalịa ịrịba ama ihe ọ bụla pụrụ iche dị n’ahụ onye omekome ahụ, ma ọ bụ n’uwe ya ma ọ bụ n’ọdịdị ahụ ya. Olee otú ụda olu ya dị? Ụmụ irighiri ihe ndị a nile pụrụ ịba uru mgbe ị ga-akọrọ ndị uwe ojii banyere imempụ ahụ, ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị omempụ bụ ndị na-eme ya mgbe mgbe, ndị nwekwara usoro ime ihe nke ha, o wee si otú a dị mfe karị ịmata ndị ha bụ.
Gịnịkwanụ banyere iji ihe ị ga-eji chebe onwe gị? O doro anya na ọ gaghị abụ ihe amamihe ka onye Kraịst jiri ngwá ọgụ ọ bụla. Ọ bụrụ na onye omekome echee na ị na-achọ iwere ngwá ọgụ, ọ gaghị echere ya echiche tupu o merụọ gị ahụ ma ọ bụ gbuo gị. Ọzọkwa, oleekwa ụzọ ị pụrụ isi gbasoo ụkpụrụ Bible ahụ nke bụ ‘iso mmadụ nile na-adị n’udo’ ma ọ bụrụ na i ji ngwá ọgụ ị ga-eji mesogwara ihe n’ike?—Ndị Rom 12:18.
N’agbanyeghị atụmatụ mgbochi nile ị pụrụ ime, e nweghị ihe ọ bụla na-ekwe gị nkwa na ọ dịghị ụbọchị ọ bụla ị ga-adaba n’aka ndị omempụ. N’obodo ndị jupụtara n’imempụ, ị nọrọhaala n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị, ọ ga-emetụta gị. N’oge na-adịbeghị anya gara aga na New York, otu onye ọkà iwu hapụrụ ọfis ya ije zụrụ otu iko kọfi. Mgbe ọ na-abanye n’ime ụlọ ahịa ahụ, ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’ime moto gbafetara ma jiri égbè gbakasịa ebe ahụ. E gburu onye ọkà iwu ahụ mgbe mgbọ tụrụ ya n’isi. N’ihi “mgbe na ihe ndapụta,” ọ tụfuru ndụ ya. Lee nnọọ oké ihe ọdachi nke ahụ bụ! È nwere olileanya ọ bụla dị maka ngwọta na-adịgide adịgide nye oké ntiwapụ imempụ e nwere n’oge a nke na-agazu ụwa dum?—Eklisiastis 9:11.
Mgbe Imempụ Ga-akwụsị
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jisọs buru amụma na otu ọgbọ gaje ịbịa nke gaje ịhụ ihe omume ndị na-atụ egwu karịa ọgbọ ọ bụla dịworo tupu ya. Ebe e nwere telivishọn na usoro nzirịta ozi ndị na-eme ka a mara ihe merenụ ozugbo ha na-eme, ọtụtụ nde, ee e, ọtụtụ puku nde mmadụ, na-ahụ ajọ mpụ dị iche iche kpọmkwem mgbe a na-eme ha na channel a na-eji agbasa akụkọ n’ógbè nke ha. Ụwa dum aghọwo otu obodo nta, akụkọ ụwa na-aghọkwa akụkọ otu ógbè ozugbo ahụ. Dị ka ihe si na nke a pụta, ihe na-eme eme na-emetụ ụmụ mmadụ n’ahụ kwa ụbọchị, dịkwa ka Jisọs buru n’amụma, ọtụtụ mmadụ “na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Luk 21:26.
Jisọs buru ụzọ hụ ihe ndị ahụ meworo kemgbe 1914, bụ́ ihe omume ndị ga-ebute ‘ọgwụgwụ usoro ihe nke a’ ụzọ. (Matiu 24:3-14) Ma o kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Nke ahụ pụtara na ọchịchị ezi omume Chineke ga-enwe oké mmetụta n’elu ala n’oge na-adịghị anya.—Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:1-4.
N’okpuru ọchịchị ahụ, ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi, ndị na-achọ udo, na ndị ahụ na-erubere Chineke isi ga-ekere òkè n’ọnọdụ Paradaịs nke elu ala. Gịnị ga-eme ndị omempụ na ndị mmebi iwu? “Dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ. N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” N’okpuru ọchịchị ezi omume ahụ sitere n’eluigwe, a gaghị enwe ma ọgba aghara ma imempụ.—Abụ Ọma 37:2, 9.
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịmatakwu ihe banyere olileanya nke a dabeere na Bible nke ọchịchị ụwa nke udo nke na-adịgide adịgide, mee ka gị na Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu zute taa ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nke dị n’ógbè unu. Ọ ga-amasị ha inyere gị aka ịghọta Bible, n’anaghị gị ego ọ bụla.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala”
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Onye ahụ na-ama aka n’akpa nke Charles Dickens kọrọ akụkọ ya, bụ́ Onye Ọkà Nzopụ ahụ, bụ́ onye na-amaghị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere ndị omekome nke oge a
[Ebe E Si Nweta Foto]
Graphic Works of GEORGE CRUIKSHANK, by Richard A. Vogler, Dover Publications, Inc.