Ọ̀ Dị Ihe Ụzọ I Si Efe Ofufe Mere?
OKÉ anwụ na-acha n’obodo nta ahụ nke Africa n’oge etiti ehihie. A pụrụ ịnụ ụda nke oké ịkụ ịgba, ịbụ abụ, na ịkụ aka obi ụtọ site ná ndagwurugwu dị nso. Ma nke a abụghị nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ma ọlị. Ọ bụ ofufe ọdịnala nke Africa. Otú ọ dị, ụda ahụ na-ama ụda olu ọgba aghara na-abịa site n’otu ụlọ chọọchị mmụọ nsọ dị nso aka. N’ebe ahụ ndị ofufe na-egbu ka mmanya na-eji ọrụ ebube “agwọ ọrịa” ma na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ná nsọtụ nke ọzọ nke obodo ahụ ka e nwere ụdị ọzọkwa nke ofufe. Oké ụda olu nke otu onye Alakụba na-akpọ ndị Alakụba ibe ya òkù maka ekpere.
Ee, a pụrụ ịhụ ofufe okpukpe n’ụdị dị iche iche nke ukwuu n’ọtụtụ obodo ukwu dị iche iche na obodo nta ndị nke Africa. Ruo ọtụtụ ọgbọ afọ juru ndị Africa ịgbaso ọdịnala okpukpe nke ha. Ma mgbe ahụ, ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm bịara, na-esoro ìgwè ndị agha nke mba dị iche iche dị na Europe, jirikwa obi ịta mmiri gbalịa ime ka onye ọ bụla “ghọọ onye Kraịst”—gụnyere ọbụna aha ha.
Gịnị si na ya pụta? Ụdị okpukpe nke gwakọtara nkwenkwe na ihe omume dị iche iche nke ọdịnala Africa na nkwenkwe okpukpe e si ofesi bubata. Ruo taa ọtụtụ “ndị Kraịst” na-efe ofufe na-eji ọgwụ ọdịnala na ọgwụ nchebe dị iche iche eme ihe. Otú ọ dị, ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nyere echiche na-ezighị ezi banyere ezi Iso Ụzọ Kraịst, ha hapụkwara ihe nketa nke mkpasu iwe mgbe ha na-ala. Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ ha kpatara àgwà enweghị mmasị na Bible bụ́ nke dị n’etiti ndị Africa ụfọdụ taa.
Ka o sina dị, a ka na-agbaso ọtụtụ ụdị nke “Iso Ụzọ Kraịst” n’ebe nile. N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ìgwè chọọchị mmụọ nsọ dị iche iche abụwo ihe na-ewu nnọọ ewu; chọọchị ndị ji okwukwe agwọ ọrịa amụbawo. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kọwara ndọrọ mmasị nke chọọchị ndị a site n’ikwu na ‘echiche ndị Africa banyere okpukpe bụkarịsịrị iji rite uru. N’uche onye Africa, okpukpe aghaghị inwe ike iweta afọ ojuju nke ihe onwunwe kpọmkwem maka ịdị adị nke mmadụ. Ya mere, nye onye Africa kwenyere na ịjụ mmụọ ase dị mkpa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe nile, ụzọ ndị chọọchị mmụọ nsọ [ma ọ bụ ndị ji okwukwe agwọ ọrịa] si eme ihe kwekọrọ n’ọchịchọ nke ụzọ ndụ ya.’ Otú ọ dị, ọ dị mwute na o doro anya na e hiwewo ọtụtụ chọọchị mmụọ nsọ n’ụzọ bụ isi nanị dị ka ihe iji nweta ego.
Taa, e nwere ihe karịrị 6,000 ịrọ òtù okpukpe dị iche iche n’Africa. Ma eleghị anya ọ dịwo gị ka okpukpe na ịrọ òtù ndị a dum ji mkpịsị ugodi nke nzọpụta. Ma ajụjụ e nwere n’ezie bụ, Olee otú ọ dị Chineke?
Okpukpe Ọ Bụla Nnọọ Ọ̀ Pụrụ Ịdị Na-amasị Chineke?
N’ezie, Onye Okike nke eluigwe na ala agaghị ahapụ anyị n’enweghị nduzi n’ihe banyere nke a. (Emọs 3:7; Ọrụ 17:26, 27) E nwekwara ihe àmà dị ukwuu nke na a pụrụ ịchọta nduzi Chineke n’ime Bible. Ee e, Bible abụghị, dị ka ụfọdụ na-akpọ ya, akwụkwọ ndị ọcha. N’ezie, ọ dịghị mmadụ ọ bụla—onye isi ojii ma ọ bụ onye ọcha—pụrụ ịsị na ọ bụ ya dere ya. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta,” ka 2 Timoti 3:16 na-ekwu. Ịbụ eziokwu, ịga n’ihe a chọrọ, nke nkụzi nile nke Bible, ya ịbụ akwụkwọ meworo nnọọ ochie, nlanarị ya n’agbanyeghị ajọ mwakpo, amụma ya ndị ziri ezi na nkesa ya na-enweghị atụ gburugburu ụwa—ndị a bụ ihe àmà doro anya nke na o sitere n’aka Chineke.
Gịnị ka akwụkwọ ahụ na-akụziri anyị? Otu ihe bụ na ọ na-agwa anyị na e nwere nanị otu “ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Ebe ọ dị otú ahụ, olee otú a pụrụ isi nwee eziokwu n’ime okpukpe nile? Ọ̀ bụ na ìgwè okpukpe dị iche iche adịghị emegiderịta ibe ha mgbe a bịara n’ihe banyere kpọmkwem ụdị onye na ọdịdị nke Chineke? Jemes so dee Bible kwuru banyere “okpukpe nke dị ọcha ma ziekwa ezi.” (Jemes 1:27, Today’s English Version) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ịmata ezi okpukpe, a ghaghịkwa inwe okpukpe ụgha ma ọ bụ nke adịgboroja. Nke a ga-emegide echiche ahụ bụ na okpukpe nile bụ nanị ụzọ dị iche iche isi jeruo ebe Chineke nọ.
Ụkpụrụ Dị Iche Iche nke Onye Okike Maka Ofufe
Gịnị bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi na-efe Chineke? Bible na-akụziri anyị na ezi ofufe gbanyere mkpọrọgwụ n’ezi ihe ọmụma. Onye amụma ukwu ahụ bụ́ Jisọs Kraịst n’otu oge gwara nwanyị Sameria, sị: “Unu onwe unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị.” (Jọn 4:22) Nke a, ma eleghị anya, ọ̀ pụrụ ịbụ eziokwu n’ebe ị nọkwa? À kụziworo gị na Chineke Pụrụ Ime Ihe nile nwere aha nke aka ya, bụ́ Jehova? (Abụ Ọma 83:18) Ị̀ maara ihe ndị bụ nzube ya maka mmadụ na ụwa? (Matiu 6:9, 10; Ndị Efesọs 1:9, 10; 3:11) Okpukpe gị ọ̀ na-esetịpụrụ gị olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu ka mma? Ọ bụrụkwa na ị na-akpọ onwe gị onye Kraịst, ị̀ pụrụ ịkọwa ihe i kwere na ha site n’Akwụkwọ Nsọ, ka hà bụ nanị akụkọ si n’aka fere n’aka ị jiworo ntakịrị oge nyochaa?
Ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ụkọ nke ezi ihe ọmụma, ị pụrụ inweta ya site n’ọmụmụ nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Jehova Chineke na-atụ anya n’aka ezi ndị na-efe ya ofufe ịmara nke ọma ihe Akwụkwọ ahụ Dị Nsọ na-akụzi. Karịa nke ahụ, ọ na-atụ anya n’aka ha itinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. Àgwà anyị aghaghị ịdị ka nke onye ọbụ abụ ahụ bụ́ onye kwuru, sị: “Okwu gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Ruo ókè hà aṅaa ka okpukpe gị nyewooro gị aka ịmata na ịghọta Bible?
Akụkụ ọzọ dị mkpa nke ezi ofufe bụ okwukwe na Jisọs Kraịst, ọ bụghị nanị dị ka onye amụma ukwu kama dị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. Akwụkwọ Nsọ na-ekwupụta n’ụzọ doro anya na Jisọs bụ “Onye ahụ nke na-eduba mmadụ ná ndụ.” (Ọrụ 3:15; 4:12) Ọtụtụ na-asị na ha nwere okwukwe na Jisọs, ma ruo ókè hà aṅaa ka okwukwe ha bụ nke ezigbo ya? Ezigbo okwukwe na Kraịst na-achọ irube isi ná ntụziaka ya nile. Chineke n’onwe ya gbara ume nke a mgbe o kwupụtara, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya: nụrụnụ okwu Ya.” (Mak 9:7) Otú a ezi ndị ofufe na-agbalịsi ike ịgbaso nzọụkwụ Jisọs n’ụzọ chiri anya dị ka o kwere omume. (1 Pita 2:21) Otu ụzọ ha si eme nke a bụ site n’ikere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha nke ọ malitere. (Matiu 4:17; 10:5-7) Okpukpe gị ọ̀ na-agba gị ume ikere òkè n’ọrụ a n’onwe gị?
Ịhụnanya bụkwa ihe ọzọ a chọrọ maka ofufe bụ ezigbo ya. A kọwara Jehova Chineke dị ka ịhụnanya n’onwe ya, Jisọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-amata ha site n’ịhụnanya ha gosiri n’etiti onwe ha. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 4:8) N’ịtụle ọtụtụ nde mmadụ taa na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst, ọ̀ bụ na ụwa ekwesịghị nnọọ ijupụta n’ịhụnanya? Otú ọ dị, ụwa anyị bụ n’ezie ebe ịhụnanya kọrọ ụkọ karịsịa. Agha anapụwo ọtụtụ nde mmadụ ndụ n’ime narị afọ nke a nanị. Mpụ na ime ihe ike nọgidere na-arị elu. Ya mere jụọ onwe gị sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’okpukpe m, ụwa ọ̀ ga-abụ ebe ịhụnanya dị karị?’
N’ikpeazụ, Bible na-egosi na ndị na-efe ezi ofufe aghaghị ịnọpụ iche n’ụwa nke na-amaghị Chineke. Mgbe Chineke setịpụrụ mba ochie nke Israel iche dị ka ndị nchebe nke ofufe dị ọcha, Chineke dọrọ ndị ya aka ná ntị ka ha zere mkpakọrịta chiri anya nke ha na mba ndị rụrụ arụ dị ha gburugburu. (Deuterọnọmi 7:1-6) Na Jọn 17:16, Kraịst Jisọs n’otu aka ahụ kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” Ndị na-efe ezi ofufe nke Chineke enweghị ihe jikọrọ ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, omume rụrụ arụ, azụmahịa anyaukwu, ma ọ bụ nkà ihe ọmụma ọ bụla nke ụwa nke asọpụrụghị Chineke. (Jọn 18:36; 1 Jọn 2:15-17) Ha na-erube isi n’iwu ahụ e dere ná Ndị Rom 12:2: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a.” Nke ahụ ọ̀ bụ ihe okpukpe gị na-agba gị ume ime?
Enyemaka Dị
Ee, ụzọ i si efe ofufe nwere ihe o mere n’ezie n’ebe Chineke nọ. Nye ya, e nwere nanị otu ezi okpukpe. (Ndị Efesọs 4:4-6) Ntụle anyị dị mkpirikpi arụtụwo aka n’ụfọdụ n’isi ihe dị iche iche nke nkụzi Bible. Gịnị ma i mee mgbalị ịmụtakwu ihe?
N’agbanyeghị nzụlite okpukpe i nwere, Ndịàmà Jehova pụrụ inyere gị aka n’akụkụ nke a. A maara ha n’ụwa nile maka oké ọrụ nkụzi Bible ha. Ha tinyere uche n’inyere ndị mmadụ nke agbụrụ na nzụlite okpukpe nile aka inweta nghọta ka mie emi nke Bible. (Ilu 2:1-6) Ha na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị e mere ezi nnyocha maka ha.a N’ezie, ha ga-abịa ọbụna n’ebe obibi gị n’anaghị gị ego ọ bụla iji kụziere gị Bible ihu na ihu. Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-erite uru ugbu a site n’usoro nkụzi Bible nke a. Gịnị ma i mee otú ahụ n’onwe gị? N’ezie, ọ dị oké mkpa na i mere ya n’ihi na ụzọ isi efe ofufe nwere ihe o mere n’ezie.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu akwụkwọ dị otú ahụ bụ Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1990. Ọtụtụ mmadụ egosiwo mmasị maka ntụle ya nke ezi ọgụgụ isi na nkà mmụta banyere okpukpe ndị bụ isi n’ụwa.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nyere echiche na-ezighị ezi banyere ezi Iso Ụzọ Kraịst
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọtụtụ chọọchị mmụọ nsọ bụ ihe e guzobere iji nweta ego
[Foto dị na peeji nke 6]
Okwukwe na Jisọs bụ akụkụ dị oké mkpa nke ezi ofufe
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndịàmà Jehova na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma site n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu