Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp18 nke 2 p. 3
  • Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Obi N’amụma Bible
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Amụma Ndị Mezurulanụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Ịchọ Amụma Ndị A Pụrụ Ịtụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • È Nwere Onye Ma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
wp18 nke 2 p. 3
Ebe otu nwoke na-ekwu otú ihu ígwé ga-adị n’otu izu

Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu

Ì chetụla otú ihe ga-adịrị gị na ezinụlọ gị n’ọdịnihu? Ihe ọ̀ ga-adịrị unu mma ka ihe ọ̀ ga-esiri unu ike? Udo ọ̀ ga-adị n’ụlọ unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị adị? Ị̀ ga-aka nká, ka ị̀ ga-anwụchu ọnwụ? Ndị mmadụ echeela gbasara ajụjụ ndị a kemgbe ọtụtụ puku afọ.

Taa, ndị ọkachamara na-amụ otú ihe si eme n’ụwa, jiri ya na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ihe ha kwuru na-emezu ma ụfọdụ na-akụ afọ n’ala. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke aha ya bụ Guglielmo Marconi mepụtara telegram nke na-enweghị waya n’afọ 1912, a sị na o kwuru, sị: “Mwepụta a e wepụtara ihe ndị e ji ezirịta ozi ndị na-enweghị waya ga-eme ka a gharazie ịna-alụ agha.” Otu onye na-arụ n’otu ụlọ ọrụ a na-akpọ Decca Record Company jụrụ imepụtara ndị òtù egwú a na-akpọ the Beatles egwú ha n’afọ 1962. Ihe mere o ji jụ bụ na o chere na ọ gaghịzi ara ahụ́ ndị na-eji ụbọ akpọ egwú akwụsị iwu ewu.

Ọtụtụ ndị na-agakwuru ndị mmụọ ọjọọ iji mata ọdịnihu, ụfọdụ ana-agakwuru ndị na-agụ kpakpando. Ọtụtụ magazin na akwụkwọ akụkọ na-ekwukwa gbasara ịgụ kpakpando. Ndị ọzọ na-agakwuru ndị na-akọ ọdịnihu ma ọ bụ ndị na-eme anwansi, bụ́ ndị na-ekwu na ha ga-ejili enyo, nrọ ma ọ bụ akara aka mata otú ihe ga-adị n’ọdịnihu.

Ụfọdụ ndị n’oge ochie na-agakwuru dibịa afa iji mata ọdịnihu, dibịa afa ahụ agwa ha ihe chi ya kwuru. Dị ka ihe atụ, e kwuru na Eze na-achị Lidia aha ya bụ Krosus zigaara arụsị dị na Delfi, nke dị na Gris, onyinye dị oké ọnụ ahịa ka o nwee ike ịgwa ya ihe ga-eme ma ọ gaa ịlụso Saịrọs bụ́ eze Peshia agha. Dibịa afa ahụ gwara Krosus na ọ ga-ebibi “Alaeze ukwu” ma ọ gaa ịlụso Saịrọs agha. Krosus ji obi ike na ya ga-emeri gawazie ịlụso ya agha. Ma, alaeze ukwu e bibiziri n’agha ahụ bụ nke Krosus.

E nweghị ndị ọ gaara abụ ha merie n’agha ahụ, ya abụrụ na ihe o kwuru emeghị. Ma, amụma ahụ e buuru ya edoghị anya, n’ihi ya o nweghị uru ọ bara. Ihe niile Krosus nwere funahụrụ ya n’ihi ọdachi ozi a na-edoghị anya kpataara ya. Ihe ọ̀ na-agaziri ndị na-aga ka e si n’ụzọ ndị a e nwere taa gwa ha ihe ga-eme n’ọdịnihu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya