Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 2 p. 4-5
  • Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI NA-EME KA NDỤ MMADỤ NWEE ISI
  • Ì Jikerela?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-echegbu Onwe Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 2 p. 4-5
Ebe ụmụ nwoke abụọ nọdụrụ ala n’ụlọ ọdachi mebisịrị

Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

Mgbe nnukwu idei mmiri na ala mbize mere ka pọtọpọtọ ju ebe niile mechara na Siera Lion, otu nwoke aha ya bụ Andrew kwuru, sị: “Idei mmiri na ala mbize mebiri ihe niile anyị nwere. Na mbụ, ọ dị anyị ka nke anyị ọ̀ gwụla.”

Mgbe otu ajọ ifufe kpachara mkpamkpa n’Agwaetiti Vejin, otu nwoke aha ya bụ David kwuru, sị: “Mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, anyị lọtara hụ na o mebiela ihe niile anyị nwere. O nyeghị anyị ọnụ okwu. Nwa m nwaanyị dara n’ala malite ibe ákwá.”

Ọ BỤRỤ na e nwetụla mgbe ọdachi na-emere onwe ya kpara gị aka, ị ga-aghọta otú ọ na-adị ndị o mere. Ọ na-eri ha ọnụ, dị ha ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ha na-anọ ná mgbagwoju anya, na-echegbu onwe ha, ụjọ ana-atụkwa ha. Ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị o merela nke na ọ na-adị ha ka ọnwụ bịa gburu ha.

Ọ bụrụ na ọdachi na-emere onwe ya bibiri ihe niile i nwere, o nwekwara ike ịdị gị ka ị gaghị edili ya. O nwedịrị ike ime ka ị malite iche na ndụ ị dị enweghịzi isi. Ma, Baịbụl na-egosi na nke gị agwụbeghị, nakwa na e nwere ezigbo ihe mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI NA-EME KA NDỤ MMADỤ NWEE ISI

Ekliziastis 7:8 kwuru, sị: “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya.” Ọ bụrụ na ọdachi na-emere onwe ya akpaa gị aka ọjọọ, o nwere ike ịdị gị mgbe ahụ o mere ọhụrụ ka olileanya adịghịzi. Ma, ọ bụrụ na i jisie ike die ya ma na-eme ihe ndị i kwesịrị ime, ihe ga-aka mma.

Baịbụl kwuru na e nwere oge ‘a na-agakwaghị anụ mkpu ákwá ma ọ bụ mkpu arịrị.’ (Aịzaya 65:19) Ihe a ga-emezu n’Alaeze Chineke, mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:​11, 29) Ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịkwa eme ọzọ. Obi mgbawa na nsogbu niile ọ kpataara ndị mmadụ agaghịzi adị n’ihi na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kwere nkwa na “a gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

Chegodị ihe a: Onye kere ihe niile ahaziela ‘ime ka anyị nwee ọdịnihu na olileanya,’ ya bụ, ka anyị biri n’Alaeze Chineke mgbe nsogbu na-agaghịzi adị. (Jeremaya 29:11) Ịmata ihe a ò nwere ike inyere gị aka? Sally, nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ kwuru, sị: “Ichetara onwe gị ihe ndị mara ezigbo mma Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu ga-enyere gị aka ichefu ihe ndị merela eme na idi nsogbu ndị gị na ha na-alụ ugbu a.”

Gbalịa mụtakwuo ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. Ime otú ahụ ga-eme ka obi sie gị ike na n’agbanyeghị ihe ọdachi ndị na-emere onwe ha kpataarala gị, ndụ ị dị ka nwere isi. Ọ ga-emekwa ka ị na-atụsi anya ike mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha na-agaghịzi adị. Ma, ka ọ dị ugbu a, ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka idi ihe ọdachi na-emere onwe ha kpataara gị. Lee ụfọdụ amaokwu Baịbụl nwere ike inyere gị aka.

Amaokwu Baịbụl Nwere Ike Inye Aka

Na-ehi ụra nke ọma.

“Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.”​—Ekliziastis 4:6.

Ndị na-eme nchọnchọ chọpụtara na ‘ọ bụrụ na onye ihe gbawara obi anaghị ehi ụra nke ọma, nsogbu ya ga-akakwu njọ.’ Ọ bụ ya mere onye ahụ ji kwesị ịna-ehi ụra nke ọma.

Na-ekwu otú obi dị gị.

“Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.”​—Ilu 12:25.

Kọọrọ onye ezinụlọ unu ma ọ bụ onye ọzọ ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị. Ọ ga-ege ntị, meda gị obi, gwakwa gị ihe ndị nwere ike inyere gị aka.a

Na-eche gbasara mgbe ihe ga-adị mma.

“Ma e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”​—2 Pita 3:13.

a Onye obi na-anaghị eru ala ruo ogologo oge, nwere ike ịga hụ dọkịta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya