Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 3 p. 3
  • O Nweghị Onye Nwere Ike Ịgbanahụ Ọnwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Nweghị Onye Nwere Ike Ịgbanahụ Ọnwụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Jehova Nzukọ nke Nwe Aha Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Vidio Ọ Dị Mkpa Ka E Chebara Echiche nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Mmetụta nke Vidio Ndị Na-agba Àmà
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • “Otú A E Si Kụziere Anyị Ihe A Magburu Onwe Ya”
    Teta!—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 3 p. 3
Foto gosiri ebe otu nwaanyị bụ nwata, ebe ọ na-agụ egwú, ebe o ji okooko osisi, ebe ọ gbara akwụkwọ, ebe ya na di ya na nwa ya nwoke nọ, ebe ya na di ya nọ mgbe ha merela agadi, ebe ọ na-agụ egwú mgbe o merela agadi, na ebe naanị ya nọ ugbu a

O Nweghị Onye Nwere Ike Ịgbanahụ Ọnwụ

WEREGODỊ ya na ị na-ele fim na-akọ gbasara otu onye egwú a ma ama ihe ya na-amasị gị. Fim ahụ bidoro igosi mgbe ọ dị obere, mgbe ọ malitere ịmụ otú e si akpọ ngwá egwú, nakwa ọtụtụ ugboro ọ nọ na-amụgharị ya. Gị ahụzie ka ọ na-aga na-akụ egwú n’ebe dị iche iche n’ụwa, ghọzie onye a ma ama. O teghị aka, ya akawa nká, mechaa nwụọ. Fim ahụ agwụ.

Ihe e gosiri na fim ahụ abụghị ihe na-emeghị eme, kama, ọ bụ akụkọ banyere onye dịrị ndụ ma mechaa nwụọ. Ma onye e gosiri na fim ahụ ọ̀ bụ onye na-akụ egwú, onye sayensị, onye na-eme egwuregwu ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ a ma ama, otu ihe ahụ gakwaara eme ya. Onye ahụ nwere ike ọ rụzuru ọtụtụ ihe mgbe ọ dị ndụ, ma chegodị ihe ndị ọ gaara arụzu ma a si na o meghị agadi ma nwụọ.

Ọ na-agbawa obi ma anyị cheta na ọnwụ na-eche anyị niile ihu. (Ekliziastis 9:5) N’agbanyeghị mbọ niile anyị na-agba, anyị anaghị agbanahụ nká na ọnwụ. Ọrịa ma ọ bụ ihe mberede nwedịrị ike ime ka anyị gbabiri nwụọ. Baịbụl kwuru na anyị dị ka alụlụụ nke “na-apụta ruo nwa oge wee pụọ n’anya.”—Jems 4:14.

Ebe ọ bụ na anyị ejighị ndụ anyị n’aka, ụfọdụ ndị na-ebi ndụ “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:32) Ihe mere ndị mmadụ ji ebi ụdị ndụ a bụ n’ihi na ha ma na ha nwere ike ịnwụ mgbe ọ bụla, nakwa na ha enweghị olileanya ọ bụla maka ọdịnihu. O nwere mgbe ọ ga-eru, karịchaa mgbe onye ahụ nọ n’ezigbo nsogbu, o nwere ike ịna-ajụ onwe ya, sị: ‘Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?’ Olee ebe i nwere ike inweta azịza ya?

Ọtụtụ ndị na-atụ anya na ndị sayensị ga-enwe ike ịza ajụjụ ahụ. Ndị sayensị na ndị dọkịta achọpụtala ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ dịkwuo ndụ ogologo. Ụfọdụ ndị sayensị na-agbakwa mbọ ịhụ na ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa. Ma hà mezuru ya ma ọ bụ na ha emezughị ya, ajụjụ ndị mmadụ ka na-ajụ bụ: Gịnị mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ? Ànyị nwere olileanya na onye iro anyị bụ ọnwụ ga-emecha kwụsị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a, zaakwa ajụjụ bụ́, Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya