Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/95 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka October

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka October
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite October 2
  • Izu Na-amalite October 9
  • Izu Na-amalite October 16
  • Izu Na-amalite October 23
  • Izu Na-amalite October 30
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 10/95 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka October

RỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-edokwa Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ nile pụrụ idozigharị ihe otú ha chọrọ iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti nke “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” na maka ntụleghachi 30 minit nke isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ. E kwesịrị ibu ụzọ kenye ụmụnna abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru ntụleghachi nke ụbọchị dị iche iche nke usoro ihe omume mgbakọ distrikti ahụ, bụ́ ndị ga-enwe ike ilekwasị anya n’isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ntụleghachi nke a a kwadebere nke ọma ga-enyere ọgbakọ aka icheta isi ihe ndị e kwuru maka iji ha mee ihe n’onwe ha nakwa iji ha mee ihe n’ubi. Azịza ndị na-ege ntị ga-aza na ahụmahụ ndị a ga-akọ kwesịrị ịdị mkpirikpi ma gaakwa n’isi ihe kpọmkwem.

Izu Na-amalite October 2

Abụ 149 (69)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.

10 min: “Ịbụ Ndị Jehova Na-enyocha—N’ihi Gịnị Ka O Ji Baa Uru?” Okwu na-agba ume nke onye okenye ga-ekwu.

15 min: “Na-eto Jehova Mgbe Nile.” Ajụjụ na azịza. Mesie ike mkpa ọ dị itinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a kpọtụrụ uche na ndị e hotara ehota n’omume.

15 min: “Nyefee Magazin n’Oge Ọ Bụla.” Tụlee ihe ndị bụ isi, ma mgbe ahụ tụleghachi isiokwu ndị a pụrụ iji mee ihe n’inyefe mbipụta ndị kasị ọhụrụ. Mee ụzọ ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ nke iche ihe n’ihu mmadụ.

Abụ 153 (43) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 9

Abụ 131 (101)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto’ nke 1995.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf 1-15.

15 min: “Ànyị Na-amụrụ Anya—Na-ezere Ihe Ndị Na-adọpụ Uche?” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, kwukwuo okwu na-adabere n’Ụlọ Nche nke May 1, 1992, peji nke 20-22.

Abụ 128 (28) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 16

Abụ 120 (26)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Dọrọ uche gaa n’akwụkwọ nta ahụ bụ́ Good News for All Nations, bụ́ nke na-enye ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ n’ọnụ ụzọ ruo ọnụ ụzọ na 59 asụsụ dị iche iche. Gbaa mmadụ nile ume iji akwụkwọ nta a mee ihe mgbe e zutere ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ n’ókèala.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto’ nke 1995.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf 16-28. Tụleghachi “Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti.”

15 min: “Nletaghachi Ndị Nwere Nzube.” Tụlee ihe ndị bụ ihe mgbaru ọsọ anyị n’ime nletaghachi. Mee ndokwa ka ndị nkwusa ruru eru mee ihe ngosi abụọ dị iche iche. Mee ka onye nkwusa kọwaa otú ụtụ a na-ana si ghara ịdị na-ezu ọnụ ahịa ya.

Abụ 130 (58) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 23

Abụ 100 (50)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ Ọchịchị Chineke.

15 min: “Ọgbakọ Dị Anyị Mkpa.” Ajụjụ na azịza.

20 min: Dọrọ Mmasị Gaa ná Nzukọ. Onye nlekọta ije ozi eduzie mkparịta ụka nke ya na ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ga-enwe, na-eji broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile eme ihe. Kọwaa ihe mere o ji baa uru ime ka ndị nwere mmasị mata otú nzukọ a si arụ ọrụ, otú e si edokwa ihe omume dị iche iche, na otú ha pụrụ isi kere òkè. Tụleghachi isi ihe ndị sitere na peji nke 14 na 15, n’isiokwu bụ́ “Nzukọ maka Ịkpasu Ịhụnanya na Ọrụ Ọma.” Ìgwè ahụ egosi ná mkpirikpi otú a pụrụ isi tinye nke a ná nkwurịta okwu ná nletaghachi ma ọ bụ n’ọmụmụ Bible iji nyere onye nwere mmasị aka ịghọta mkpa ọ dị ịga.

Abụ 126 (103) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 30

Abụ 159 (67)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ebe oge ezumike dị iche iche nke ụwa na-abịaru nso na December na January, gbaa mmadụ nile ume ịtụle itinye akwụkwọ dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka.

15 min: Ị̀ Nwalewo Ikwu Ka A Kpọọ Ndị Ọzọ? Okwu. Ndị nkwusa ụfọdụ enwewo ike ịmalite ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ n’ụzọ dị otú a: Mgbe ha sorosịworo onye nwere mmasị mụọ ihe ruo oge ụfọdụ, ha na-ajụ onye ahụ ma ọ̀ dị onye ọzọ ọ maara n’etiti ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu ya, bụ́ onye pụrụ inwe mmasị n’ọmụmụ Bible. Ọtụtụ mgbe a na-enye ọtụtụ aha. Jụọ ma ị pụrụ ịkpọtụ aha ya mgbe ị na-aga na nke ndị a. Mgbe ị na-eme nleta ahụ, ị pụrụ ikwu, sị: “Onye na onye dị otú a enwewo mmasị dị ukwuu n’ịmụ Bible nke na o chere na gị onwe gị kwa ga-enwe mmasị n’irite uru site n’usoro ihe omume anyị nke ọmụmụ Bible n’efu.” Nke a pụrụ inye ndepụta dị mma nke nletaghachi ndị pụrụ ịghọ ọmụmụ Bible ndị na-amịpụta mkpụrụ. Gbakwụnye otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ sitere n’aka ndị nkwusa ndị chọtaworo ndị nwere mmasị ma ọ bụ maliteworo ọmụmụ ihe ndị ọhụrụ n’ụzọ dị otú a.

20 min: Inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible Ma Ọ Bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’Ọnwa November. Tụleghachi akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ Akukọ Bible ahụ na-adabere na peji okwu mmalite na usoro isiokwu. Gosi onye nwe ụlọ na e kewara akụkọ ndị dị n’ime akwụkwọ ahụ gaa ná nkebi asatọ na n’usoro ha ji mee. Zaa ajụjụ ndị a: Na gịnị ka akụkọ ndị dị n’akwụkwọ ahụ dabeere? Akụkọ ndị dị aṅaa ka a kọrọ n’ime akwụkwọ a, n’ihi gịnịkwa ka ha ji kwesị ndabere? Olee otú akwụkwọ Akukọ Bible ahụ pụrụ isi nyere mmadụ aka ịmata Bible nke ọma, na-enyekwa olileanya dị aṅaa dị ebube? Akụkọ ole ka a kọrọ n’ime akwụkwọ ahụ ná ngụkọta, oleekwa otú ha pụrụ isi bụrụ ihe na-adọrọ mmasị nye ma ndị agadi ma ụmụntakịrị? Olee otú a pụrụ isi jiri akụkụ Bible ndị e depụtara ná ngwụsị nke akụkọ ọ bụla mee ihe? Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi dị mkpirikpi na-eji okwu mmalite nke Nkebi nke 1 eme ihe ma na-eme ka Akụkọ nke 5 pụta ìhè. Ọ bụrụ na i ji akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi na-eme ihe, kwadebe otu ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị irè nke ị pụrụ iji mee ihe n’ịkọwara onye nwe ụlọ akwụkwọ ahụ. Chetara mmadụ nile iwere ụfọdụ n’akwụkwọ abụọ ndị a maka iji mee ihe n’ozi n’izu a.

Abụ 138 (71) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya