Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/95 p. 8
  • Nyefee Magazin n’Oge Ọ Bụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nyefee Magazin n’Oge Ọ Bụla
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Nletaghachi Ndị Nwere Nzube
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 10/95 p. 8

Nyefee Magazin n’Oge Ọ Bụla

1 Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee ekele maka Ụlọ Nche na Teta! Olee magazin ndị ọzọ na-adọrọ mmasị otú ahụ ná mba nile? N’ọnwa a, a ga-eji magazin ndị a na-eme ihe n’ọrụ nkwusa anyị, leekwa ihe ọmụma dị ukwuu mbipụta ndị kasị ọhụrụ bu! Dị ka ọ na-adịkarị, anyị na-etinye ihe ka ọtụtụ n’ime magazin anyị n’ọrụ ụlọ n’ụlọ; otú ọ dị, anyị ga-achọkwa ịdị njikere inyefe ha n’oge ọ bụla ọzọ kwesịrị ekwesị.

2 Mgbe ị na-enyefe “Ụlọ Nche” October 1, ị pụrụ ịkpalite mmasị n’isiokwu bụ́ “Ụwa nke Agha Na-adịghị na Ya—Olee Mgbe?” site n’ikwu, sị:

◼ “Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya ihe mere ụwa nke agha na-adịghị na ya ji yie ihe a na-apụghị inweta enweta n’agbanyeghị mgbalị nile nke ụmụ mmadụ. Gịnị ka i chere banyere okwu ndị a dị na peji nke 5 nke Ụlọ Nche October 1? [Gụpụta ahịrị okwu nke mbụ na nke ọ bụla n’ime paragraf abụọ ndị ahụ dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Okpukpe—Oké Ihe Ndọghachi Azụ,” ma nye ohere maka nzaghachi.] Otú ọ dị, nke a apụtaghị na a ga-enwe agha mgbe nile. Rịba ama nkwa Chineke n’ebe a n’Aịsaịa 9:6, 7.” Ị pụrụ ịgụpụta akụkụ akwụkwọ nsọ a na Bible gị ma ọ bụ dị ka e hotara ya n’isiokwu Ụlọ Nche ahụ. Kọwaa ná mkpirikpi na Ụlọ Nche na-akwado Alaeze Jehova dị ka nanị olileanya e nwere maka ụwa nke dị n’udo, ma gbaa onye ahụ ume ịtụ ụtụ Ụlọ Nche maka otu afọ n’ụtụ a na-enyefe ya.

3 Mgbe ị na-enyefe “Teta!” nke November 8, ị pụrụ ịsị:

◼ “Gịnị ka i chere banyere ajụjụ dị na peji nke abụọ nke magazin a: ‘N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Dị Mkpirikpi Otú A?’ [Nye ohere maka nzaghachi.] Usoro isiokwu a na-akpọtụ uche n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a na ndị ọzọ na-ekwu banyere ịka nká, mgbe ahụkwa ọ na-elekwasị anya n’ihe Onye Okike anyị kweworo nkwa ya banyere olileanya maka ndụ ebighị ebi.” Nyefee ụtụ maka Teta! Ọ bụrụ na a nataghị ụtụ ahụ, nyefee Teta! na Ụlọ Nche n’ọnụ ego ₦30.

4 Mgbe i zutere ndị nwere mmasị n’okpukpe, gịnị ma i jiri otu isiokwu sitere ‘n’Ụlọ Nche’ October 15 mee ihe? Ụzọ iche ihe n’ihu nke a pụrụ ịkpalite nzaghachi dị mma:

◼ “M ga-achọ ịmata ihe bụ echiche gị n’ajụjụ a: Ò kwere omume ịhụ Chineke n’anya ma na-atụ egwu ya n’otu mgbe ahụ?” Nye ohere maka nzaghachi, ma gụzie akụkụ akwụkwọ nsọ dị n’okpuru isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Tụọ Egwu Ezi Chineke ahụ Ugbu A?” (Ekli. 12:13) Jiri otu n’ime ihe atụ ndị dị na peji nke 199 nke akwụkwọ Reasoning mee ihe, ma nyefee ụtụ. Ma ọ bụrụ na a nataghị ya, nyefee magazin abụọ.

5 Mgbe ị na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, elegharala obere ụlọ ahịa na ebe azụmahịa dị iche iche anya. Ndị na-akpọtụrụ ụlọ ahịa na ebe azụmahịa dị iche iche mgbe nile na-akọwa ọrụ a dị ka nke na-enye obi ụtọ na nke na-amịpụta mkpụrụ. Ị pụrụ ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị mfe dị ka nke a mgbe ị na-enyefe “Teta!” nke October 8:

◼ “Anyị maara na ndị na-azụ ahịa na-enwe mmasị n’inweta ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ banyere ihe ndị metụtara ógbè ha. Eji m n’aka na isiokwu ndị a ga-amasị gị.” Mgbe ahụ kerịta otu isi ihe sitere n’isiokwu bụ́ “Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna—Olee Ókè Ha Pụrụ Inweru Ihe Ịga nke Ọma?” Mgbe ahụ nyefee magazin abụọ ma ọ bụrụ na a nataghị ụtụ.

6 Ọ bụrụ na onye ị gakwuuru ji ọrụ n’aka n’ezie, ị pụrụ igosi magazin ndị ahụ ma kwuo, sị:

◼ “Amaara m na ị dịghị atụbu anya onye ọbịa taa, ya mere m gaghị egbu oge. M ga-achọ inye gị ohere ịgụ ihe dị mkpa.” Rụtụ aka n’otu isiokwu ị họrọwooro, ma nyefee magazin ndị ahụ.

7 Nwee ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ e ji nlezianya mee, ma jeghachi na nke ndị nile natara magazin. Ọ bụrụ na a chọtara ezi mmasị ná nletaghachi, nyefee ụtụ maka otu ma ọ bụ magazin abụọ ahụ. Ka anyị dị njikere ma mụrụ anya inyefe magazin anyị n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya