Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/97 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Jikerela Maka Ọdachi?
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Otú Anyị Ga-esi Nyere Ụmụnna Anyị Aka ma E Nwee Ọdachi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Die Nsogbu Bịaara Ha
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 2/97 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị ka e kwesịrị ime mgbe e nwere ọdachi metụtara ụmụnna anyị kpọmkwem?

Ọ bụrụ na Ọdachi Emee n’Ógbè Gị: Ahụ amala gị jijiji. Nọgide jụụ, ma tụkwasị uche n’ihe bara uru n’ezie—ndụ, ọ bụghị ihe onwunwe. Lekọta mkpa anụ arụ ndị ezinụlọ gị nwere n’oge ahụ. Mgbe ahụ mee ka ndị okenye mara banyere ọnọdụ gị na ebe ị nọ n’oge ahụ.

Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’iweta ihe enyemaka. Ọ bụrụ na e bu ụzọ nye ịdọ aka ná ntị maka ọdachi, dị ka ọ dị n’oké ifufe ụfọdụ, ụmụnna ndị a kwesịrị ịhụ na mmadụ nile nọ n’ebe na-adịghị ize ndụ, ọ bụrụkwa na oge enye ohere ya, ha kwesịrị inweta na ikesa ihe ndị pụrụ ịdị mkpa.

Mgbe e mesịrị, ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịchọta ezinụlọ ọ bụla ma jụta maka ọdịmma ha. E kwesịrị ime ka onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ okenye ọzọ mara banyere ọnọdụ nke ezinụlọ ọ bụla, ọbụna ma ọ bụrụ na ihe dịcha mma. Ọ bụrụ na e nwere onye merụrụ ahụ, ndị okenye ga-agbalị idokwa maka ọgwụgwọ. Ha ga-enyekwa ụdị ihe onwunwe ọ bụla ndị dị ka nri, uwe, ebe obibi, ma ọ bụ ngwá ụlọ ndị dị mkpa. (Jọn 13:35; Gal. 6:10) Ndị okenye nọ n’ógbè ahụ ga-enye ọgbakọ ahụ nkwado ime mmụọ na nke mmetụta uche ma dokwaa ngwa ngwa o kwere omume ibidoghachị nzukọ ọgbakọ. Mgbe e mesịrị ntụle zuru ezu, otu okenye kwesịrị ịkpọtụrụ onye nlekọta sekit n’aha òtù ndị okenye ịkọrọ ya banyere mmerụ ahụ ọ bụla, mmebi e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ mmebi e nwere n’ebe obibi ụmụnna, tinyekwara mkpa ọ bụla pụrụ iche. Mgbe ahụkwa onye nlekọta sekit ga-akpọ na telifon ma ọ bụ zitere alaka ụlọ ọrụ ozi na-enye akụkọ maka ọnọdụ ahụ. Alaka ụlọ ọrụ ga-ahazi ihe inyeaka ọ bụla buru ibu dị mkpa.

Ọ Bụrụ na Ọdachi Emee Ebe Ọzọ: Cheta ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’ekpere gị. (2 Kọr. 1:8-11) Ọ bụrụ na ị chọọ inye enyemaka ego, ị pụrụ izitere Society onyinye gị, bụ́ ebe e nwere ụtụ ego enyemaka e debere iche maka nzube a. Adres ya bụ: Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State. (Ọrụ 2:44, 45; 1 Kọr. 16:1-3; 2 Kọr. 9:5-7; lee Ụlọ Nche August 1, 1986, peji nke 20-22.) Ezigala ihe n’ógbè ọdachi ahụ ọ gwụla ma ụmụnna ndị na-ahụ maka ya rịọrọ kpọmkwem maka ya. Nke a ga-eme ka mgbalị enyemaka gara n’usoro na nkesa nke ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụrụ ihe e ji n’aka. (1 Kọr. 14:40) Biko akpọla Society na telifon mgbe ọ na-adịghị mkpa, ebe ọ bụ na nke a pụrụ ime ka a ghara inwe ohere n’usoro fon bụ́ nke dị mkpa iji zaa fon ndị na-abata site n’ógbè ebe ọdachi ahụ mere.

Mgbe e mesịrị ntụle kwesịrị ekwesị, Society ga-ekpebi ma a ga-ehiwe kọmitii ihe enyemaka. A ga-eme ka ụmụnna ruru eru mara. Mmadụ nile kwesịrị ịkwado ndị okenye na-edu ndú ka e nwee ike lekọta mkpa dị ukwuu nke ụmụnna nile n’ụzọ zuru ezu.—Lee Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peji nke 310-315.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya