Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/97 p. 1
  • “Bụrụkwanụ Ndị Na-ekele Ekele”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Bụrụkwanụ Ndị Na-ekele Ekele”
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ekele Onye Ọ Bụla Meere Gị Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • “Gosikwanụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ekpere E Ji Ekele Chineke
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • ‘Gosinụ na Unu Bụ Ndị Nwere Ekele’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 3/97 p. 1

“Bụrụkwanụ Ndị Na-ekele Ekele”

1 A zụrụ ihe ka ọtụtụ n’ime anyị mgbe anyị bụ ụmụaka ịsị “biko” na “i meela” mgbe mmadụ gosiri anyị nsọpụrụ ma ọ bụ obiọma. Pọl na-adụ anyị ọdụ mgbe nile ‘ịbụ ndị na-ekele ekele,’ anyị kwesịkwara inwe ekele karịsịa nye Jehova. (Kọl. 3:15, 16) Ma olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị nye Onye Okike Ukwu anyị? Oleekwa ihe ndị pụrụ iche mere anyị ga-eji nye ya ekele?

2 Pọl onyeozi dere, sị: “Ekele dịrị Chineke, Onye na-enye anyị mmeri site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Kọr. 15:57) Kwa afọ n’oge Ememe Ncheta, a na-echetara anyị banyere ịhụnanya a na-akparaghị ókè nke ma Chineke ma Kraịst gosiri n’inye ihe mgbapụta ahụ nke na-enye anyị olileanya nke ndụ agwụghị agwụ. (Jọn 3:16) Ebe ọ bụ na onye a hụrụ n’anya anwụnahụwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ anyị nile, lee ka anyị si nwee ekele maka nkwa Jisọs nke mbilite n’ọnwụ! Obi anyị na-ejupụta n’ekele mgbe anyị na-atụgharị uche n’olileanya nke ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a n’anwụghị ma ọlị. (Jọn 11:25, 26) O siri ike ịchọta okwu a ga-eji kwupụta ekele maka ngọzi nile magburu onwe ha anyị ka ga-enweta site n’aka Jehova n’ime Paradaịs elu ala na-abịanụ. (Mkpu. 21:4) Olee ihe ndị karịrị ndị a onye ọ bụla pụrụ inwe mere ọ ga-eji ‘bụrụ onye na-ekele’ Chineke?

3 Ụzọ Isi Gosipụta Ekele Nye Chineke: O kwesịrị ekwesị mgbe nile ikwupụta ekele anyị n’ekpere gwa Jehova maka ịdị mma ya. (Abụ Ọma 136:1-3) A na-akpalikwa anyị igosipụta ekele anyị nye ya n’ụzọ ndị ọzọ dị mma. Dị ka ihe atụ, n’ezie anyị ga-anọ ya na Sunday, March 23, maka Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Iji nye aka gboo mkpa ihe onwunwe nke ọgbakọ anyị na nke ọrụ zuru ụwa ọnụ anyị ji obi ụtọ ‘na-asọpụrụ Jehova site n’akụ̀ anyị.’ (Ilu 3:9) Anyị na-akwado ndị okenye n’ụzọ zuru ezu ma na-ekwenyere ha, si otú a na-egosi ekele anyị nye Jehova maka enyemaka ọ na-enye anyị site n’aka ha. (1 Tesa. 5:12, 13) Kwa ụbọchị, anyị na-agbalịsi ike ịnọgide na-enwe ezi àgwà nke na-ewetara aha Chineke otuto. (1 Pita 2:12) Jehova na-enwe obi ụtọ n’ihe àmà ndị a nile nke ekele anyị.—1 Tesa. 5:18.

4 Ngosipụta Kasị Mma nke Ekele Anyị: Iji mkpụrụ obi dum na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ịsọpụrụ aha Jehova, ikwupụta ekele n’ekpere, na iji ịnọgidesi ike n’ihe na-agbachitere eziokwu ahụ so ná ngosipụta ndị kasị mma nke ekele sitere n’obi ndị anyị pụrụ ime nye Onye Okike anyị maka ihe nile o meworo n’ihi anyị. Jehova na-enwe obi ụtọ ịhụ ka anyị na-ejere ya ozi dị nsọ n’ịkwado uche ya “ka a zọpụta mmadụ nile.” (1 Tim. 2:3, 4) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị nkwusa bụ́ ndị pụrụ ime ndokwa maka ya ji na-aza òkù ahụ pụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke February idenye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’otu ma ọ bụ karịa n’ime ọnwa March, April, na May. Itinyekwu mgbalị n’ozi ahụ bụ ụzọ dị mma isi ‘bụrụ ndị na-ekele’ Chineke. Ị̀ ga-enwe ike isonye n’òtù ndị ọsụ ụzọ n’April? na May?

5 E nyewo anyị olileanya e ji n’aka nke ịdị ndụ ebighị ebi. Mgbe anyị hụrụ o mezuru, anyị ga-enwekwu ọtụtụ ihe kwa ụbọchị mere anyị ga-eji nọgide na-enye Jehova ekele ọṅụ.—Abụ Ọma 79:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya