Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka March

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka March
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite March 3
  • Izu Na-amalite March 10
  • Izu Na-amalite March 17
  • Izu Na-amalite March 24
  • Izu Na-amalite March 31
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 3/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka March

Izu Na-amalite March 3

Abụ 53 (27)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ịmalite kpọwa ndị nwere mmasị òkù ịbịa Ememe Ncheta na March 23. Gosi otu mkpụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta, gbaakwa mmadụ nile ume inweta ụfọdụ na ịmalite ikesa ha n’izu a.

10 min: “Enyemaka Bịara n’Ezi Oge.” Dọrọ uche gaa n’isiokwu ma mee ka isi ihe ndị bara uru sitere na nke ọ bụla ná mbipụta ndị ọhụrụ ahụ pụta ìhè.

20 min: “Inyere Ezinụlọ Dị Iche Iche Aka Inweta Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide.” (Paragraf nke 1-5) Kwuo okwu dị mkpirikpi na paragraf 1, mgbe ahụ tụlee otú a pụrụ isi zụlite mmasị n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ site n’iji isiokwu nke isiakwụkwọ ya, ihe osise ndị mara mma, na igbe ntụleghachi mee ihe. Mee ka ndị nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu ndị dị na paragraf nke 2-5. Gbaa mmadụ nile ume ime mgbalị pụrụ iche iji tinye akwụkwọ ahụ n’aka ezinụlọ ndị gosiworo mmasị na mbụ.

Abụ 71 (91) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 10

Abụ 56 (33)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.” Chetara mmadụ nile ịhụ na ha gbasoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta e dokwara maka March 18-23, dị ka e depụtara n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị.

20 min: “Bụrụkwanụ Ndị Na-ekele Ekele.” Ajụjụ na azịza. Mmadụ nile kwesịrị itinye ezi mgbalị ịkpọ ndị a na-amụrụ Bible, ndị nwere mmasị, ndị òtù ezinụlọ na-adịghị emegide emegide, na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ọ bụla na-adịghị esochi ọgbakọ anya òkù ịbịa Ememe Ncheta ahụ. Ihe ngosi dị mkpirikpi nke onye nkwusa na-akpọ onye nwere mmasị òkù ịga Ememe Ncheta, na-eji akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta eme ihe. Kwukwuo okwu n’Ụlọ Nche July 1, 1988, peji nke 11, paragraf nke 16-17. Gbaa ndị nile nwere ike ime ya ume ịsụ ụzọ inyeaka n’April na May.

15 min: “Inyere Ezinụlọ Dị Iche Iche Aka Inweta Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide.” (Paragraf nke 6-8) Tụọ aro ụfọdụ na-egosi ụzọ isi nyefee akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ mgbe a na-agba àmà mberede n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ogige ntụrụndụ, ma ọ bụ n’ụgbọ njem ọha na eze, tinyere mgbe e jere ileta ndị ikwu. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu ndị dị na paragraf nke 6 na 7. Nkwurịta okwu e nwere mgbe e mere nletaghachi ahụ kwesịrị inyere onye ahụ aka ịghọta otú ịmụ Bible pụrụ isi wusie nkekọ ezinụlọ ike. A ga-eduzi ọmụmụ ihe na broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, n’ebumnobi nke ịgafe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, ma ọ bụ a pụrụ ịmalite ọmụmụ ihe ahụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ n’onwe ya.

Abụ 72 (92) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 17

Abụ 63 (32)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Kọwapụta ndokwa ọgbakọ maka Ememe Ncheta. Mmadụ nile kwesịrị ime ndokwa ndị ikpeazụ iji nyere ndị a na-amụrụ Bible na ndị nwere mmasị aka ije.

15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ okwu onye okenye ga-ekwu n’isiokwu bụ́ “Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ezie Ịrịọ Mgbaghara?” site n’Ụlọ Nche September 15, 1996, peji nke 22-24.

15 min: “Wulite Ụlọ Gị.” Ajụjụ na azịza. Gụnye ahụmahụ ndị sitere na 1995 Yearbook, peji nke 228.

Abụ 75 (28) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 24

Abụ 67 (38)

9 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwaa na oge agafebeghị itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka n’April. Kọwapụta ndokwa ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ maka nzukọ ije ozi n’ọnwa ahụ.

24 min: “Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi.” (Paragraf nke 1-20) Ajụjụ na azịza. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke paragraf nke 16.

12 min: Inyere Onye Nkwusa Ọhụrụ Aka Ịmalite. Tụleghachi paragraf nke 19 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996. Mee ihe ngosi otú onye nkwusa ruru eru si akwadebe onye a na-amụrụ Bible, bụ́ onye ndị okenye ka nwapụtasịrị ka ọ bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptism. Ha abụọ atụleghachi akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 111, paragraf nke 2. Onye nkwusa ahụ nwere ahụmahụ akọwapụta ihe a ga-ezute ma eleghị anya mgbe a na-ekere òkè n’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na ọ dịghịkwa mkpa inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ enweghị mmasị. Onye nkwusa akọọ ahụmahụ na-agba ume na-egosi ọṅụ na-abịa mgbe anyị hụrụ onye nwere obi eziokwu nke ga-ege ntị. Ha abụọ akwadoo ụzọ iche magazin n’ihu dị mkpirikpi, dị mfe, mgbe ahụ mụgharịa ya. E nye ịja mma na-agba ume ma mee ndokwa ndị doro anya ikerekọta òkè n’ozi ubi n’izu a.

Abụ 89 (49) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 31

Abụ 70 (39)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kpọọ ndị nile nwere mmasị òkù ịga okwu ihu ọha pụrụ iche n’April 6. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka March. Maa ọkwa aha mmadụ nile na-asụ ụzọ inyeaka n’April. Tụlee Igbe Ajụjụ.

20 min: “Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi.” (Paragraf nke 21-35) Ajụjụ na azịza. Tụlee igbe dị na peji nke 3. Gbaa mmadụ nile ume idenye nletaghachi nile ha merela n’ọnwa ahụ mgbe ha na-ede akụkọ ozi ubi ha.

10 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe n’April. Nyefee ụtụ Ụlọ Nche. Ọ bụrụ na a naraghị ụtụ, nyefee Ụlọ Nche na Teta! Kọọ ná mkpirikpi aro ndị a tụrụ n’ụzọ isi kwadebe ụzọ iche magazin n’ihu ndị pụtara na paragraf nke 3, 4, na 8 na peji nke 8 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996. Mee ka ndị nkwusa abụọ mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu dị mkpirikpi. Ndị nkwusa kwesịrị inwe ihe ndekọ nke ndị na-anara magazin ma gụnyekọta ha n’ụzọ magazin ha.

Abụ 92 (51) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya