Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Odeakwụkwọ
1 Odeakwụkwọ ọgbakọ na-arụ ọrụ dị mkpa iji hụ na ‘e mere ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.’ (1 Kọr. 14:40) Dị ka onye òtù nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ, ọ na-ahụ maka nzirịta ozi ndị ọgbakọ na-enwe nakwa ihe ndekọ ndị dị mkpa. Ọ bụ ezie na o nwere ike ọrụ ya agaghị apụta ìhè nye mmadụ nile dị ka nke ndị okenye ndị ọzọ, ozi ndị ọ na-eje dị mkpa nke ukwuu, a na-enwekwa ekele maka ha.
2 Mgbe a natara akwụkwọ ozi site n’aka Society ma ọ bụ site n’aka ndị ọzọ, odeakwụkwọ na-elebara ya anya ma hụ na a zaghachiri ya mgbe ọ dị mkpa. Ọ na-ejide n’aka na akwụkwọ ozi ndị a natara gazuru ndị okenye nile, ọ na-etinyekwa ha na faịlụ maka izo aka na ha. Ọ na-enyocha fọm ọda magazin na akwụkwọ ma zigara ha Society. Ọ bụ ya kpọmkwem na-elekọta ndị na-ahụ maka ihe ndekọ ego na ụtụ nakwa ihe nile metụtara mgbakọ.
3 Ebe odeakwụkwọ na-aghaghị izigara Society akụkọ ozi ubi nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ọ na-erule ụbọchị nke isii n’ọnwa, ọ dị mkpa ka anyị nile nye akụkọ ozi ubi anyị ngwa ngwa ná ngwụsị ọnwa ọ bụla. Mgbe ahụ ọ na-edeba akụkọ ozi ahụ na kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa. Onye nkwusa ọ bụla pụrụ ikwu ka e nye ya ihe ndekọ akụkọ ozi nke ya ka ọ hụ.
4 Mgbe onye nkwusa batara ma ọ bụ pụọ n’ọgbakọ, odeakwụkwọ na-ekwu ka e zite ma ọ bụ na-ezipụrụ ndị okenye nke ọgbakọ nke ọzọ akwụkwọ ozi nkọwa tinyere kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa maka onye ahụ.—Ozi Anyị, peji nke 105.
5 Odeakwụkwọ na-atụleghachi ọrụ nke ndị ọsụ ụzọ, na-eme ka ndị okenye, karịsịa onye nlekọta ije ozi, mara nsogbu ọ bụla nke ndị ọsụ pụrụ ịdị na-enwe. Ọ na-eme ka ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ mara ndị nkwusa na-adịghị ejechi ozi ubi anya. Ma odeakwụkwọ ma onye nlekọta ije ozi na-ebute ụzọ n’ịhazi mgbalị ndị a na-eme iji lekọta ndị na-adịghị ejekwa ozi ubi.—Ozi Alaeze Anyị, February 1989, peji nke 1.
6 Ebe anyị ghọtaworo ọrụ odeakwụkwọ nke ọma karị, ka anyị mee ike anyị nile iji nye aka ime ka ibu ọrụ ya kara ya mfe ịrụzu.—1 Kọr. 4:2.