Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Dec. 1
“Ị̀ chọpụtala na otú ndị mmadụ si edebe ihe ọcha n’otu ebe na-adị iche n’otú ndị nọ ebe ọzọ si edebe? [Chere ka ọ zaa.] Gee ntị ka m gụọrọ gị otu ihe mere ịdị ọcha ji dị mkpa. [Gụọ 1 Pita 1:16.] Isiokwu a tụrụ aro ndị ga-enyere mmadụ aka ịhụ na ọ na-adị ọcha mgbe niile.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 9.
Ụlọ Nche Jan. 1
“Gburugburu ụwa, otú ndị mmadụ si ele Meri nne Jizọs anya dịgasị nnọọ iche. Oleekwanụ maka gị? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl na-egosi na Meri nwere ọrụ pụrụ iche ọ rụrụ. [Gụọ Luk 1:30-32.] Magazin a kwuru ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.”
Teta!® Jan.–Mar.
“Ọ dịla anya ajụjụ a dị n’ihu magazin a nyewere ndị mmadụ nsogbu n’obi. [Gosi ya ajụjụ e dere n’ihu magazin ahụ.] Ị̀ maara otú e si enwe ya? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị ihe mere o ji bụrụ na ọ bụghị naanị na mmadụ nwere ego bụ na o nweela ezi ihe ịga nke ọma. [Gụọ Jọn 17:3.] Magazin a gosiri ihe Baịbụl kwuru n’okwu a.”
“Ndị mmadụ na-echekarị na onye ihe na-agara nke ọma bụ onye a ma ama, onye nwere akụnụba, na onye ikike dị n’aka. Olee onye ị na-ewere ka onye ihe na-agara nke ọma? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị ihe Baịbụl kwuru na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma. [Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.] Isiokwu a kwuru ihe isii ga-enyere mmadụ aka inwe ihe ịga nke ọma.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 6.”