Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/15 p. 2
  • Ṅomie Okwukwe Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • “O Gbooro M Mkpa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Otú Ịgụ Baịbụl Si Enyere Anyị Aka Idi Nsogbu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2015
km 9/15 p. 2

Ṅomie Okwukwe Ha

1. Olee akwụkwọ anyị ga-ebido ịmụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’izu na-amalite n’Ọktoba 19?

1 N’izu na-amalite n’Ọktoba 19, 2015, anyị ga-ebido ịmụ akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. N’akwụkwọ a, a kọrọ akụkọ mmadụ iri na anọ nwere okwukwe na Chineke. A kọrọ akụkọ ha otú anyị ga-echebara ha echiche, hụkwa otú ha si fee Jehova n’agbanyeghị ụdị nsogbu ndị ha nwere. Akwụkwọ a ga-enyekwara anyị aka ịmụta ihe bara uru n’aka ha.—Hib. 6:12.

2. Gịnị na gịnị dị n’akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha?

2 Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A: N’akwụkwọ a, e sere ihe ga-enyere anyị aka ịmata mgbe onye a na-akọ akụkọ ya biri ndụ nakwa ebe o bi n’oge ahụ. E nwere ajụjụ ndị dị ná ngwụcha isiokwu nke ọ bụla. A na-akpọ ha “Ajụjụ Ndị Ị Ga-echebara Echiche.” Ha ga-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’ihe anyị mụrụ n’isiokwu nke ọ bụla, nyekwara anyị aka ime ihe anyị mụtara. Ihe ọzọ dị́ n’akwụkwọ a bụ ihe osise ndị mara mma. Ha ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe a na-akọ n’isiokwu nke ọ bụla.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịmụta ihe n’akwụkwọ a?

3 Otú Anyị Ga-esi Mụta Ihe na Ya: Òtù Na-achị Isi gwara anyị n’isimbido akwụkwọ ahụ, sị: “Were ya na ị nọ mgbe ihe ị na-agụ na-eme. Mee ka obi gị dịrị n’ihe ị na-agụ. Gbalịa ka ihe metụrụ ndị ị na-agụ akụkọ ha n’obi metụkwa gị n’obi. Gbalịakwa ka ị hụ ihe ha hụrụ. Jiri ihe ha mere mgbe ihe ụfọdụ mere ha tụnyere ihe ị gaara eme ma ọ bụrụ gịnwa ka ihe ndị ahụ mere.” Ihe a na-ekwu ebe a bụ na anyị kwesịrị ịghọta ihe a na-akọ gbasara onye nke ọ bụla, ghọtakwa otú ihe si dịrị ya. Ka anyị nwee ike ime ya, anyị ga-ewepụta oge tụgharịa uche n’ihe anyị na-amụ. (Nehe. 8:8) N’izu ọ bụla a na-agaghị amalite na paragraf nke mbụ n’isiokwu, onye ga-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ ga-eji otu nkeji ma ọ bụ ihe na-erughị ya chetara ụmụnna ihe a mụrụ n’izu gara aga. Ọ bụrụkwa na ebe a ga-amụ enweghị “Ajụjụ Ndị Ị Ga-echebara Echiche,” onye ga-eduzi ya ga-ajụ ụmụnna otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ iji tụleghachi ihe a mụrụ ụbọchị ahụ.

4. Olee uru dị́ n’ịmụ akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha?

4 Ọtụtụ ihe ndị dị n’ụwa a nwere ike ime ka okwukwe anyị nwere na Chineke ghara isi ike. Ma, Jehova enyela anyị ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Abụọ n’ime ha bụ akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha na isiokwu a na-akpọ “Ṅomie Okwukwe Ha” nke na-agba n’Ụlọ Nche. (Jems 1:17) Anyị kwesịrị ịgba mbọ na-agachi ọmụmụ ihe anya n’oge a ga na-amụ akwụkwọ a ma na-aza ajụjụ ka anyị nwee ike ịmụta ihe na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya