Ebe ụmụnna na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na Swizaland
Ihe I Nwere Ike Ikwu
ỤLỌ NCHE
Ihe i ga-ekwu: Otu ihe e dere n’Akwụkwọ Mkpughe ọtụtụ ndị ma bụ banyere ndị ịnyịnya anọ na-awụ ọsọ. Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ ma ha nụ banyere ya. Ma, ndị ọzọ na-achọ ịmatakwu banyere ya.
Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 1:3
Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kọwara ihe mere ndị ịnyịnya anọ ahụ na-agbanụ ji bụụrụ anyị ozi ọma.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Ì chere na ọ ga-ekwe omume ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu?
Amaokwu Baịbụl: Aịza. 46:10
Eziokwu: Chineke na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl eme ka anyị mata ihe ga-eme n’ọdịnihu.
UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU
Ihe i ga-ekwu: Anyị na-egosi ndị mmadụ obere vidio a na-ekwu gbasara ezinụlọ. [Kpọnyere ya vidio kwuru gbasara broshọ bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.]
Otú a ga-esi enye ya: Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ broshọ ahụ e kwuru gbasara ya na vidio a, enwere m ike inye gị ya n’efu ma ọ bụ gosi gị otú ị ga-esi danloduo ya na jw.org/ig.
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.