Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb18 Jenụwarị p. 8
  • Olee Otú Ị Ga-esi Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ị Ga-eme Mgbe I Mejọrọ Ndị Ọzọ
    Teta!—1996
  • Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Emekwala Ka “Ndị A Dị Nta” Sụọ Ngọngọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
mwb18 Jenụwarị p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú Ị Ga-esi Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo?

Ebe otu nwoke hapụrụ atụrụ o ji achụ àjà gawa ka ya na nwanna ya mee udo

Were ya na i bi na Galili n’oge ahụ Jizọs nọ n’ụwa, nakwa na ị nọzi na Jeruselem maka Ememme Ụlọ Ndò. Ebe niile na-ekwo ekwo n’ihi ndị si ebe dị iche iche bịa maka ememme ahụ. Ị chọrọ iji ewu ịkpụ bịa chụọrọ Jehova àjà. Gị akpụrụ ya si n’etiti ìgwè mmadụ juru n’ụzọ obodo ahụ gawa n’ụlọ nsọ. Mgbe i ruru, gị ahụ na ebe niile juru na ndị bịakwara ịchụ àjà nke ha. Mgbe oge ruru ka i nye onye nchụàjà ewu ahụ i ji bịa, gị echetazie na o nwere nwanne gị obi na-adịghị mma n’ebe ị nọ, nke o nwekwara ike ịbụ na ọ nọ n’etiti igwe mmadụ ahụ ma ọ bụkwanụ n’obodo ahụ. Jizọs kwuru ihe i kwesịrị ime. (Gụọ Matiu 5:24.) Olee otú ihe a Jizọs kwuru nwere ike isi nyere gị na nwanna gị aka ime udo? Katụ ihe n’aro nke i chere dị mma n’igbe ndị a dị n’okpuru.

I KWESỊRỊ . . .

  • ịga ka gị na nwanna gị mezie ma ọ bụrụ na i chere na i mejọrọ ya

  • ime ka ọ ghọta na ọ bụghị obere ihe ọ bụla ka o kwesịrị iwere iwe, meekwa ka ọ ghọta na yanwa mejọkwara

  • ige nwanna gị ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu okwu. Ọ bụrụgodị na ị ghọtachaghị otú i si mejọọ ya, si n’ala ala obi gị rịọ ya mgbaghara maka otú ihe i mere si wute ya

NWANNA GỊ KWESỊRỊ . . .

  • ịkọrọ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ unu ihe merenụ iji mee ka ha dunyere ya úkwù

  • ịbara gị mba, chetaghachiri gị ihe ndị i mere ya ma chọọ ka i kweta na i mejọrọ ya

  • ịghọta na otú i si kata obi bịa rịọ ya gosiri na ị dị umeala n’obi, ya esizie n’ala ala obi ya gbaghara gị

Ọ bụ eziokwu na anyị anaghịzi eji ụmụ anụmanụ achụrụ Chineke àjà taa, ma, olee ihe Jizọs na-akụzi banyere otú adịm ná mma anyị na ụmụnna anyị si gbasa ofufe anyị na-efe Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya