Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb18 Jenụwarị p. 6
  • Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
mwb18 Jenụwarị p. 6
Ebe Jizọs na-agwọ onye ekpenta

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 8-9

Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

Matiu isi nke asatọ na nke itoolu kọrọ ihe ụfọdụ gbasara ozi Jizọs jere na Galili. Jizọs gosiri na o nwere ikike ịgwọ ọrịa mgbe ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa ha. Ma, ihe kachanụ mere o ji gwọọ ndị mmadụ ọrịa bụ ịhụnanya na ọmịiko dị ukwuu o nwere n’ebe ha nọ.

  1. Obodo ebe ndị Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa

    Jizọs gwọrọ onye ekpenta.—Mat. 8:1-3

  2. Jizọs gwọrọ onye na-ejere otu onyeisi agha ozi ọrịa.—Mat. 8:5-13

    Ọ gwọrọ nne nwunye Pita.—Mat. 8:14, 15

    Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị niile ahụ́ na-adịghị mma.—Mat. 8:16, 17

  3. Jizọs chụpụkwara ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ezigbo ike, chụba ha n’ime ìgwè ézì.—Mat. 8:28-32

  4. Jizọs gwọrọ otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.—Mat. 9:1-8

    Ọ gwọrọ otu nwaanyị metụrụ uwe ya aka, kpọlitekwa ada Jeirọs n’ọnwụ.—Mat. 9:18-26

    Ọ gwọkwara ndị ìsì abụọ na otu onye ogbi.—Mat. 9:27-34

  5. Jizọs jegharịrị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla nakwa ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.—Mat. 9:35, 36

Olee otú m ga-esi na-egosikwu ndị mụ na ha nọ ịhụnanya na ọmịiko?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya