Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Ọgọst p. 3
  • Gị na Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Na-anọrị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gị na Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Na-anọrị
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ike Na-efe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Jehoyada Katara Obi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Ọgọst p. 3

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Gị na Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Na-anọrị

Gịnị mere anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya kwesịrị iji na-anọrị? Ọ bụ n’ihi na ụdị ndị anyị na ha na-akpa nwere ike ime ka anyị na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. (Ilu 13:20) Dị ka ihe atụ, Eze Jehoash mere “ihe ziri ezi n’anya Jehova” n’oge niile ya na Jehoyada, Nnukwu Onye Nchụàjà, nọ. (2 Ihe 24:2) Ma mgbe Jehoyada nwụrụ, Jehoash na ndị ọjọọ bidoro na-akpa. Ihe a mere ka ọ hapụ Jehova.​—2 Ihe 24:​17-19.

N’oge ndịozi Jizọs, Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere “ụlọ buru ibu,” jirikwa ndị nọ n’ime ya tụnyere “arịa dị iche iche” na-adị n’ụlọ. Anyị ga na-abụ “arịa bụ́ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ” ma anyị zere onye ọ bụla na-eme ihe Jehova kpọrọ asị, ma onye ahụ ọ̀ bụ onye ezinụlọ anyị ma ọ̀ bụ onye nọ n’ọgbakọ. (2 Tim. 2:​20, 21) N’ihi ya, ka ndị anyị ga na-emeta enyi bụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya na ndị ga na-agba anyị ume ịna-efe Jehova.

LEENỤ VIDIO BỤ́ MỤTA ỊJỤ MKPAKỌRỊTA ỌJỌỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú anyị nwere ike isi bido iso ndị ọjọọ na-akpa n’amaghị ama?

  • Na vidio ahụ, olee ihe nyeere ụmụnna atọ ahụ aka ịkwụsị mkpakọrịta ọjọọ?

  • Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka imeta ezigbo ndị enyi?

Ebe John na-agbanyere ndị ọrụ ha mmanya n’ebe a na-ere nri; Ebe Kristin ji ekwentị ya gaa n’ebe ya na ndị enyi ya na-ekwurịta okwu n’Ịntanet; Ebe Jayden na ndị ọzọ na-eme egwuruegwu n’Ịntanet; Ebe John na ezinụlọ ya, Kristin, na Jayden nọ n’ọmụmụ ihe

Àbụ m “arịa bụ́ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ”?​—2 Tim. 2:21

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya