OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya
Ná 2 Ndị Kọrịnt 9:7, a gwara anyị, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Taa, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị dị mfe anyị nwere ike isi jiri Ịntanet nye onyinye iji kwadoo ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ, ma n’obodo anyị ma n’ụwa niile.
LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ E SI ESI NA KỌMPUTA MA Ọ BỤ N’EKWENTỊ ENYE ONYINYE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee otú anyị nwere ike isi chọta ebe e dere ụzọ ndị anyị nwere ike isi nye onyinye n’obodo anyị?
Olee otú isi n’Ịntanet enye onyinye sirila baara ụfọdụ ndị uru?
Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi nye onyinye?
Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị amaghị ụzọ anyị nwere ike isi jiri ekwentị ma ọ bụ kọmputa nye onyinye?