Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w20 Febụwarị p. 1-32
  • Na-eme Udo, Kama Ime Anyaụfụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eme Udo, Kama Ime Anyaụfụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE IHE NWERE IKE ỊKPATA ANYAỤFỤ?
  • MỤTA ỊDỊ UMEALA N’OBI, KA IHE I NWERE NA-EJUKWA GỊ AFỌ
  • “NA-ACHỤSO IHE NA-EWETA UDO”
  • Anyaụfụ Nwere Ike Imebi Uche Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ihe Na-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ
    Teta!—2015
  • Ị̀ Na-eji Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Onye Na-eme Anya Ụfụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
w20 Febụwarị p. 1-32

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

Na-eme Udo, Kama Ime Anyaụfụ

“Ka anyị na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.”—ROM 14:19.

ABỤ NKE 113 Udo Anyị Nwere

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ka anyaụfụ mere n’ezinụlọ Josef hà?

JEKỌB hụrụ ụmụ ya niile n’anya. Ma, nwa ya ọ kacha hụ n’anya bụ Josef dị afọ iri na asaa. Gịnịzi ka ụmụnne ya mere? Ha meweere ya anyaụfụ, nke mere ka ha kpọ ya asị. O nweghị ihe Josef mere ụmụnne ya mere ha ga-eji kpọ ya ụdị asị ahụ. N’agbanyeghị ya, ha rere Josef ka ọ gaa gbawa ohu, ghaara nna ha ụgha, sị ya na anụ ọhịa adọgbuola nwa ya ahụ ọ kacha hụ n’anya. Anyaụfụ mere ka ha mee ka udo gharazie ịdị n’ezinụlọ ha, mewaakwa nna ha obi.—Jen. 37:3, 4, 27-34.

2. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 5:19-21, gịnị mere anyaụfụ ji jọgbuo onwe ya?

2 Na Baịbụl, anyaụfụb so ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́’ jọgburu onwe ya, nke nwere ike ime ka mmadụ ghara iketa Alaeze Chineke. (Gụọ Ndị Galeshia 5:19-21.) Ọ na-abụkarị anyaụfụ na-akpata àgwà ọjọọ ndị dị ka ibu iro, esemokwu, na iwe ọkụ.

3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ihe ụmụnne Josef mere gosiri otú anyaụfụ nwere ike isi mee ka anyị na ndị ọzọ ghara ịdị ná mma, meekwa ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị eme ihe ụmụnne Josef mere, obi anyị niile dị aghụghọ, o zughịkwa okè. (Jere. 17:9) Ka a sịkwa ihe mere anyị nwere ike iji na-emere ndị ọzọ anyaụfụ mgbe ụfọdụ. Ka anyị leba anya n’akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịchọpụta ihe mere anyaụfụ nwere ike iji gbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji na-eme udo kama ime anyaụfụ.

OLEE IHE NWERE IKE ỊKPATA ANYAỤFỤ?

4. Gịnị mere ndị Filistia ji na-emere Aịzik anyaụfụ?

4 Akụnụba. Aịzik bụ aka ji akụ̀. Ndị Filistia meweere ya anyaụfụ n’ihi akụ̀ ya. (Jen. 26:12-14) Ha sụchidịrị olulu mmiri Aịzik si enweta mmiri ọ na-enye ìgwè ewu na atụrụ ya. (Jen. 26:15, 16, 27) Ụfọdụ ndị taa na-eme ka ndị Filistia ahụ. Ha na-emere onye ọ bụla ka ha nwee akụnụba anyaụfụ. Ọ bụghị naanị na ha na-achọ ka ọ bụrụ ha nwe ihe onye ahụ nwere, kama ha na-achọ ka a napụ onye ahụ ihe o nwere.

5. Gịnị mere ndị isi okpukpe ndị Juu ji na-emere Jizọs anyaụfụ?

5 Onye ihe ya na-amasị ọtụtụ ndị. Ndị isi okpukpe ndị Juu meere Jizọs anyaụfụ n’ihi na ihe ya na-amasị ọtụtụ ndị. (Mat. 7:28, 29) Ọ bụ Chineke zitere Jizọs, ya abịa na-akụzi eziokwu. Ma, ndị isi okpukpe ndị Juu nọ na-agbasa ụgha ọjọọ ma na-ekwutọ Jizọs iji mebie aha ya. (Mak 15:10; Jọn 11:47, 48; 12:12, 13, 19) Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a Baịbụl kọrọ? E nwee ndị ụmụnna hụrụ n’anya n’ihi àgwà ọma ha, anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị ghara ịna-emere ha anyaụfụ. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị mụta àgwà ọma ha.—1 Kọr. 11:1; 3 Jọn 11.

6. Olee otú Dayọtrefis si meere ndị ọzọ anyaụfụ?

6 Ọrụ e nyere mmadụ n’ọgbakọ. N’oge ndịozi Jizọs, Dayọtrefis meweere ndị Chineke ji na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst anyaụfụ. Ọ na-achọ ịbụ onye mbụ ma ya na ụmụnna nọrọ. Ọ bụ ihe mere o ji na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ gbasara Jọn onyeozi na ụmụnna ndị ọzọ ka ndị nọ n’ọgbakọ gharazie ịna-akwanyere ha ùgwù. (3 Jọn 9, 10) Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị eme ihe Dayọtrefis mere, anyị nwere ike imewere nwanna anyaụfụ ma e nye ya ọrụ anyị na-achọ ka e nye anyị, karịchaa ma anyị chee na anyị ga-arụli ọrụ ahụ ka nwanna ahụ ma ọ bụdị karịa ya.

Foto dị iche iche: 1. Ebe otu okooko osisi mara mma gbanyere mgbọrọgwụ n’ala dị mma. 2. Ebe ahịhịa na-egbu okooko osisi ahụ. 3. Ebe ụmụnna nwaanyị atọ ji obi ụtọ na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwanna nwaanyị ọzọ anọrọ naanị ya, yie onye iwe na-ewe.

Obi mmadụ dị ka ala, àgwà ọma anyị adị ka ọmarịcha okooko osisi. Ma, anyaụfụ dị ka ahịhịa ọjọọ. Anyaụfụ nwere ike ime ka anyị ghara inwe àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko, na obiọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Gịnị ka anyaụfụ nwere ike ime anyị?

7 Anyaụfụ dị ka ahịhịa ọjọọ. Ọ gbanyehaala mgbọrọgwọ n’obi anyị, ifopụ ya na-esi ike. Àgwà ọjọọ ndị na-eme ka anyaụfụ ka njọ bụ ekworo, nganga, na mmadụ iche naanị gbasara onwe ya. Anyaụfụ nwere ike ime ka mmadụ ghara inwe àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko, na obiọma. Ozugbo anyị chọpụtara na anyaụfụ achọwala ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị, anyị kwesịrị ifopụ ya. Olee otú anyị nwere ike isi fopụ ya?

MỤTA ỊDỊ UMEALA N’OBI, KA IHE I NWERE NA-EJUKWA GỊ AFỌ

Foto dị iche iche: 1. Ebe otu okooko osisi mara mma gbanyere mgbọrọgwụ n’ala dị mma. 2. Ebe mmadụ na-efopụ ahịhịa ndị ahụ dị n’akụkụ okooko osisi ahụ. 3. Ebe ụmụnna nwaanyị anọ ji obi ụtọ na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Olee otú anyị nwere ike isi fopụ anyaụfụ ka ahịhịa? Mmụọ nsọ Chineke ga-enyere anyị aka iwepụ anyaụfụ n’obi anyị, ịdị umeala n’obi, nakwa ka ihe anyị nwere ju anyị afọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8. Olee àgwà ndị nwere ike inyere anyị aka iwepụ anyaụfụ?

8 Ihe ga-enyere anyị aka iwepụ anyaụfụ n’obi anyị bụ ịdị umeala n’obi na ihe anyị nwere iju anyị afọ. Anyị nwee àgwà ọma ndị a, anyị agaghị na-emere ndị ọzọ anyaụfụ. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara ịna-eche na anyị ka ndị ọzọ. Onye dị umeala n’obi anaghị eche na ya kwesịrị inweta ihe karịa onye ọ bụla ọzọ. (Gal. 6:3, 4) Onye ihe o nwere juru afọ na-enwe obi ụtọ n’ihe o nwere. Ọ naghịkwa eji onwe ya atụnyere ndị ọzọ. (1 Tim. 6:7, 8) Ọ bụrụ na mmadụ adị umeala n’obi, ihe o nwere ejukwa ya afọ, obi ga-adị ya ụtọ ma ọ hụ onye ihe ọma meere.

9. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 5:16 na Ndị Filipaị 2:3, 4, gịnị ka mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ime?

9 Ọ bụ mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-emere ndị ọzọ anyaụfụ, nyekwara anyị aka ịna-adị umeala n’obi, ihe anyị nwere ana-ejukwa anyị afọ. (Gụọ Ndị Galeshia 5:16; Ndị Filipaị 2:3, 4.) Mmụọ nsọ Jehova nwere ike inyere anyị aka ka anyị nyochaa ihe dị anyị n’obi. Chineke ga-enyere anyị aka ka anyị wepụ ihe ọjọọ anyị na-eche n’obi anyị ma jiri nke ọma dochie ya. (Ọma 26:2; 51:10) Ka anyị kwuo gbasara mmadụ abụọ na-emereghị ndị ọzọ anyaụfụ. Ha bụ Mozis na Pọl.

Ebe Mozis, Jọshụa, na ndị Izrel ndị ọzọ kwụ n’akụkụ ụlọikwuu nzute, Jọshụa ana-agwa Mozis ka ọ kwụsị ụmụ nwoke abụọ ime ka ndị amụma.

Ebe otu nwa okorobịa Izrel gbakwutere Mozis na Jọshụa, na-akọrọ ha na e nwere ụmụ nwoke abụọ nọ n’ụlọikwuu na-eme ka ndị amụma. Jọshụa gwara Mozis ka ọ kwụsị ha ime otú ahụ, Mozis ajụ. Kama, ọ gwara Jọshụa na obi dị ya ụtọ na Jehova nyere mmadụ abụọ ahụ mmụọ nsọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Gịnị gaara eme ka Mozis mewere ndị ọzọ anyaụfụ? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

10 Mozis nwere ikike iduzi ndị Chineke, ma o gbochighị ndị ọzọ inweta ikike ahụ. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Jehova webiiri mmụọ nsọ o nyere Mozis nye ụfọdụ ndị okenye Izrel guzo n’akụkụ ụlọikwuu nzute. O teghị aka Mozis anụ na ndị okenye abụọ na-abịaghị n’ụlọikwuu nzute nwetakwara mmụọ nsọ, na-emekwa ka ndị amụma. Gịnị ka Mozis mere mgbe Jọshụa gwara ya ka ọ kwụsị ndị okenye abụọ ahụ ime ka ndị amụma? Mozis emereghị ha anyaụfụ maka ihe ahụ Jehova meere ha. Kama, obi dị ya ụtọ na ha bụzi ndị amụma. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi. (Ọnụ Ọgụ. 11:24-29) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Mozis?

Foto dị iche iche: 1. Ebe ndị okenye na-enwe nnọkọ, a gwa otu nwanna katarala ahụ́ ka ọ zụọ nwanna nke ọzọ na-akatabeghị ahụ́ ka o nwee ike iduziwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. 2. Ebe nwanna nke ahụ na-akatabeghị ahụ́ na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, nwanna nke ahụ katarala ahụ́ anọrọ ala, na-ege ntị. 3. Ebe nwanna nke katarala ahụ́ na-ekwe nwanna nke ọzọ n’aka, na-aja ya mma.

Olee otú ndị okenye nwere ike isi dị umeala n’obi ka Mozis? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)c

11. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Mozis?

11 Ọ bụrụ na ị bụ okenye, è nweela mgbe a gwara gị ka ị zụọ nwanna ọzọ ka ọ rụwa ọrụ ọgbakọ na-atọgbu gị atọgbu? Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na iduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwa izu na-atọ gị ezigbo ụtọ. Ma, ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi ka Mozis, iwe agaghị ewe gị ma a sị gị zụọ nwanna ọzọ ka ọ ga-abụ, e mechaa, ya eduziwe ya. Kama iwewe iwe, obi ga-adị gị ụtọ inyere nwanna ahụ aka.

12. Olee otú ọtụtụ Ndị Kraịst taa si egosi na ihe ha nwere juru ha afọ nakwa na ha dị umeala n’obi?

12 Ka anyị leba anya n’ihe ọzọ, nke gbasara ọtụtụ ụmụnna ndị katarala ahụ́. Ha abụrụla ndị na-ahaziri ndị okenye ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Ma ozugbo ha ruru afọ iri asatọ, ha na-eji obi ha niile nyefee ndị ọzọ ọrụ ahụ. Ndị nlekọta sekit ndị ruru afọ iri asaa na-ejikwa obi ha niile nyefee ndị ọzọ ọrụ ahụ ma kweta ije ụdị ozi ọzọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a gwara ọtụtụ ndị na-eje ozi na Betel n’ụwa niile ka ha gaa jewe ozi n’ebe ọzọ. Ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi anaghị emere ndị na-arụzi ọrụ ha na-arụbu anyaụfụ.

13. Olee ihe gaara eme ka Pọl mewere ndịozi iri na abụọ ahụ anyaụfụ?

13 Pọl onyeozi bụ onye ọzọ dị umeala n’obi ihe o nwere jukwara afọ. Pọl emereghị ndị ọzọ anyaụfụ. Ọ gbalịsiri ike n’ozi ọma. Ma, o kwuru ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ọ sịrị: “Abụ m onye kasị nta n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi.” (1 Kọr. 15:9, 10) Ndịozi iri na abụọ so Jizọs jee ozi mgbe ọ nọ n’ụwa. Ma, Pọl abụghị Onye Kraịst ruo mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na e mechara họpụta ya ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ,” o soghị ná ndịozi iri na abụọ ahụ. (Rom 11:13; Ọrụ 1:21-26) Kama imewere ndịozi iri na abụọ ahụ anyaụfụ n’ihi na ha na Jizọs jekọrọ ozi, ihe o nwere juru ya afọ.

14. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe anyị nwere juru anyị afọ, anyị adịkwa umeala n’obi?

14 Ọ bụrụ na ihe anyị nwere juru anyị afọ, anyị adịkwa umeala n’obi, anyị ga na-eme ka Pọl ma na-akwanyere ndị Jehova nyere ikike ùgwù. (Ọrụ 21:20-26) Jehova haziri ka a na-ahọpụta ụmụnna nwoke ga na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’agbanyeghị na ha ezughị okè, Jehova weere ha ka “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Efe. 4:8, 11) Ọ bụrụ na anyị ana-akwanyere ha ùgwù, na-emekwa ihe ha gwara anyị, anyị na Jehova ga-adị ná mma, anyị na ụmụnna anyị adịrịkwa n’udo.

“NA-ACHỤSO IHE NA-EWETA UDO”

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime?

15 Udo agaghị adị n’ebe anyaụfụ gbanyere mgbọrọgwụ. Anyị kwesịrị iwepụ anyaụfụ n’obi anyị ma ghara ịna-eme ihe ga-eme ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ. Anyị kwesịrị ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịna-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu’ otú ahụ Jehova gwara anyị mee. (Rom 14:19) Olee ihe anyị nwere ike ime ka ndị ọzọ ghara ịna-emere anyị anyaụfụ? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka udo dị?

16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka ha ghara ịna-eme anyaụfụ?

16 Àgwà anyị na otú anyị si ele ihe anya nwere ike ime ka ndị ọzọ mewe ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ụwa chọrọ ka anyị ‘na-egosi’ ihe ndị anyị nwere. (1 Jọn 2:16) Ma, ime otú ahụ na-akpata anyaụfụ. Ọ bụrụ na anyị anaghị ekwukarị gbasara ihe anyị nwere ma ọ bụ ihe anyị chọrọ ịzụ, o nwere ike ime ka ndị ọzọ ghara ịna-emere anyị anyaụfụ. Ọ bụrụkwa na anyị ejighị ọrụ e nyere anyị n’ọgbakọ na-etu ọnụ, ọ ga-eme ka a ghara ịna-emere anyị anyaụfụ. Iji ọrụ e nyere anyị n’ọgbakọ na-agụ egwú nwere ike ime ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ. Ma, ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi, na-ajakwa ha mma maka ihe ọma ha mere, anyị na-eme ka obi na-adị ha ụtọ, na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, udo adịkwa na ya.

17. Gịnị ka ụmụnne Josef mere? N’ihi gịnịkwa?

17 Anyị ga-akwụsịli ime anyaụfụ. Cheta ihe gbasara ụmụnne Josef. Ọtụtụ afọ ha megbuchara Josef, ha na ya hụrụ n’Ijipt. Tupu Josef emee ka ụmụnne ya mata onye ọ bụ, ọ nwalere ha ka ọ mata ma hà agbanweela. O meere ha oriri. N’oriri ahụ, nri o nyere Benjamin nwanne ya nke ọdụdụ ka nke ndị ọzọ. (Jen. 43:33, 34) Ma o nweghị ihe gosiri na ụmụnne ya meere Benjamin anyaụfụ. Kama nke ahụ, ha kwuru ihe gosiri na ihe gbasara Benjamin na Jekọb nna ha na-emetụ ha n’obi. (Jen. 44:30-34) Ụmụnne Josef mere ka udo dịghachi n’ezinụlọ ha n’ihi na ha kwụsịrị ime anyaụfụ. (Jen. 45:4, 15) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụrụ na anyị ewepụ anyaụfụ n’obi anyị, anyị ga-eme ka udo dị n’ezinụlọ anyị nakwa n’ọgbakọ.

18. Dị ka e kwuru na Jems 3:17, 18, olee ihe ga-eme ma anyị mee ka udo dị?

18 Jehova chọrọ ka anyị gbaara anyaụfụ ọsọ ma na-eme udo. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị nwee ike mee ihe abụọ a. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu a, anyaụfụ nwere ike ịbata anyị n’obi mgbe ụfọdụ. (Jems 4:5) Anyị bikwa n’ụwa ọtụtụ ndị na-eme anyaụfụ. Ma, ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, ihe anyị nwere ana-eju anyị afọ, anyị ana-ekelekwa ndị meere anyị ihe, anyị agaghị na-emere ndị ọzọ anyaụfụ. Kama, anyị ga-eme ka udo dị, nke ga-eme ka anyị na-akpa àgwà ọma.—Gụọ Jems 3:17, 18.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú mmụọ nsọ ga-esi nyere anyị aka ịgbara anyaụfụ ọsọ?

  • Anyị dịrị umeala n’obi, ihe anyị nwere ejukwa anyị afọ, olee otú ọ ga-esi mee ka anyị gbaara anyaụfụ ọsọ?

  • Olee otú àgwà ọma anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka ịgbara anyaụfụ ọsọ?

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

a Udo dị ná nzukọ Jehova. Ma, anyị nwere ike ime ka udo gharazie ịdị ma anyị mewere ibe anyị anyaụfụ. N’isiokwu a, anyị ga-achọpụta ihe na-akpata anyaụfụ. Anyị ga-amatakwa otú anyị nwere ike isi lụso ya ọgụ na otú anyị ga-esi mee ka udo na-adị.

b NKỌWAKWU: Ihe Baịbụl kwuru gosiri na anyaụfụ nwere ike ime ka mmadụ chọwa ka ọ bụrụ ya nwe ihe onye ọzọ nwere ma ọ bụkwanụ chọọ ka a napụ onye ahụ ihe ahụ.

c NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye na-enwe nnọkọ, a gwa otu nwanna katarala ahụ́, nke na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ọgbakọ ha, ka ọ zụọ nwanna nke ọzọ na-akatabeghị ahụ́ ka ọ rụwa ọrụ ahụ. N’agbanyeghị na ọrụ ahụ na-atọ nwanna ahụ katarala ahụ́ ụtọ, o ji obi ya niile kwado ihe ahụ ndị okenye kpebiri ma na-agwa nwanna ahụ ihe ndị ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ ahụ, jirikwa obi ya niile na-aja ya mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya