Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Julaị p. 26-29
  • M Ji Obi Ụtọ Jeere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M Ji Obi Ụtọ Jeere Jehova Ozi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • M GARA SAỤT AFRỊKA
  • ỊLỤ NWAANYỊ NA IJE OZI ỌZỌ
  • ANYỊ LAGHACHIRI BETEL
  • M LAGHACHIKWARA N’EBE A NA-EBI AKWỤKWỌ
  • E NYERE ANYỊ ỌRỤ ỌHỤRỤ ỌZỌ
  • Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Akwụkwọ Ozi Sitere n’Alaka
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Julaị p. 26-29
Nwanna John Kikot na Laura nwunye ya.

AKỤKỌ NDỤ

M Ji Obi Ụtọ Jeere Jehova Ozi

AKỤKỌ JOHN KIKOT KỌRỌ

ỌRỤ mbụ m rụrụ na Betel dị na Kanada bụ ịza ụlọ ebe a na-ebi akwụkwọ. Ọ bụ n’afọ 1958 ka m bịara Betel mgbe m dị afọ iri na asatọ. Ndụ na-atọ m ụtọ mgbe ahụ. O teghị aka mụ amalite ịrụ n’ebe m na-eji ígwè na-achabisi ọnụ ọnụ akwụkwọ e biri ebi ka ọ dị mma n’anya. Obi dị m ezigbo ụtọ na m nọ na Betel n’oge ahụ.

N’afọ na-esonụ, a gwara ezinụlọ Betel na a chọrọ ndị ga-ewepụta onwe ha ịga rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Saụt Afrịka, ebe e tinyere ígwè na-ebi akwụkwọ ọhụrụ. M debanyere aha m ná ndị chọrọ ịga. Obi dị m ezigbo ụtọ na e mechara họrọ m ka m soro gaa. A họpụtakwara mmadụ atọ ọzọ na-arụ na Betel dị na Kanada. Aha ha bụ Dennis Leech, Bill McLellan, na Ken Nordin. A gwara anyị na anyị ga-anọte aka ebe ahụ.

M kpọrọ mama m na fon, sị ya: “Mama, e nwere ihe m chọrọ ịgwa gị. M na-aga Saụt Afrịka.” Mama m abụghị onye oké okwu. Ma, o nwere okwukwe, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe. O nweghị oké ihe o kwuru. Ma, m ma na ọ kwadoro mkpebi m mere. Ma yanwa ma papa m enweghị onye sịrị m agala, ọ bụ eziokwu na o wutetụrụ ha na m na-aga ebe dị anya.

M GARA SAỤT AFRỊKA

Ebe mụ na Dennis Leech, Ken Nordin, na Bill McLellan nọ n’ụgbọ okporo ígwè si Kep Taụn na-aga Johanesbọg n’afọ 1959

Mgbe anyị anọ hụrụ onwe anyị mgbe afọ iri isii gachara n’alaka ụlọ ọrụ dị na Saụt Afrịka n’afọ 2019

Na Betel dị na Bruklin, e nyere anyị anọ ọzụzụ were ọnwa atọ ka anyị nwee ike ịma otú anyị ga-esi jiri ígwè ahụ na-ebi akwụkwọ na-arụ ọrụ. Anyị banyere ụgbọ mmiri na-aga Kep Taụn, bụ́ isi obodo Saụt Afrịka. M dị afọ iri abụọ mgbe ahụ. Ọ bụ ná mgbede ka ụgbọ okporo ígwè anyị nọ na ya kwọpụrụ gawa Johanesbọg. Ebe mbụ anyị kwụsịrị n’isi isi ụtụtụ bụ n’otu obere obodo a na-akpọ Karuu. Obodo ahụ dị uzuzu uzuzu, na-ekpokwa ọkụ. Anyị anọ lepụrụ anya na windo na-ajụ, sị, ‘Olee ụdị obodo dị ihe a?’ Anyị nọkwa na-echegbu onwe anyị gbasara otú ịnọ ebe a ga-adị. Mgbe anyị mechara gaghachi ebe ahụ, anyị chọpụtara na obere obodo ndị dị ebe ahụ bụ ebe dị mma mmadụ ga-anọ ahụ́ eruo ya ala.

Ruo afọ ụfọdụ, ọrụ m bụ iji ígwè a kpọrọ Linotype na-ahazisi mkpụrụ akwụkwọ a ga-ebi n’Ụlọ Nche na Teta! Alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ebiri ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’ebe ugwu Afrịka akwụkwọ, ọ bụghị naanị Saụt Afrịka. Obi dị anyị ụtọ na anyị ji ígwè ahụ anyị ji maka ya si Kanada bịa na-arụ ọtụtụ ọrụ.

Ka oge na-aga, arụrụ m ọrụ n’ọfis na-elekọta ibi akwụkwọ, ibupụ ya, na ime nsụgharị. Ọrụ zuru m nnọọ ahụ́. Ma, m na-enwe obi ụtọ.

ỊLỤ NWAANYỊ NA IJE OZI ỌZỌ

Mgbe mụ na Laura nwunye m bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’afọ 1968

N’afọ 1968, m lụrụ otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Laura Bowen. O bi nso na Betel. Yanwa na-arụkwa ọrụ ná Ngalaba Nsụgharị. N’oge ahụ, ndị lụrụ nwaanyị ọhụrụ anaghị anọ na Betel. N’ihi ya, a gwara anyị ka anyị bụrụzie ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ihe a chetụrụ m uche. Kemgbe afọ iri, m bi na Betel, a na-enyekwa m nri. Olee otú obere ego a na-enye ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ga-esi zuoro anyị? A ga na-enye onye ọ bụla n’ime anyị rand iri abụọ na ise (nke bụ ihe dị ka dọla iri atọ na ise n’oge ahụ) kwa ọnwa ma ọ bụrụ na awa anyị, nletaghachi anyị, na akwụkwọ ole anyị nyefere ezuo ole a chọrọ. Ego ahụ ka anyị ga-eji kwụọ ụgwọ ụlọ, rie ihe, gbaa ụgbọ, zụọ ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa.

E zigara anyị ka anyị jewe ozi n’otu obodo a na-akpọ Dọban nke dị n’Oké Osimiri India. E nwere ọtụtụ ndị India n’ebe ahụ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ ndị bịara rụọ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta shuga n’ihe dị ka n’afọ 1875. Ugbu a, ha na-arụzi ọrụ ndị ọzọ. Ma, ha ka na-eme omenala ha, na-eri nri ha. Ha na-asụkwa Bekee nke mere ka ọ dịrị anyị mfe izi ha ozi ọma.

A tụrụ anya ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche rụta otu narị awa na iri ise kwa ọnwa. N’ihi ya, mụ na nwunye m kpebiri ịrụta awa isii n’ụbọchị mbụ anyị gara ozi ọma. Obodo ahụ na-ekpo ọkụ. Anyị enweghị nletaghachi ma ọ bụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Anyị ji awa isii gaa naanị ozi ụlọ n’ụlọ. Mgbe anyị gagidere, m lere anya n’elekere hụ na ọ bụ naanị nkeji iri anọ ka gafere, mụ ajụọ onwe m, sị, ‘Ije a, à ga-agakwa ya aga?’

Obere oge, anyị haziri onwe anyị nke ọma. Kwa ụbọchị, anyị sichaa ihe anyị ga-eri, anyị etinye ya n’ihe ga-eme ka ọ ghara ịjụ oyi. Mgbe ọ bụla anyị chọrọ izu ike, anyị adọwa obere ụgbọala anyị n’okpuru osisi ndò dị, nọtuo ala rie ihe. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka ndị India mara mma na-agba anyị okirikiri na-ele anyị. N’ime ụbọchị ole na ole, anyị chọpụtara na anyị zihaala ozi ọma awa abụọ ma ọ bụ atọ, ọ naghịzi ara ahụ́ chi ejie.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ izi ndị ebe ahụ na-anabata mmadụ ozi ọma. Anyị chọpụtara na ndị India bi ebe ahụ na-anabata ndị mmadụ, dị obiọma, na-atụkwa egwu Chineke. Ọtụtụ ndị Hindu gekwara ozi ọma anyị ziri ha. Ha chọrọ ịmụta gbasara Jehova, Jizọs, Baịbụl, ụwa ọhụrụ, nakwa ihe bụ́ olileanya ndị nwụrụ anwụ. Mgbe otu afọ gachara, anyị nwetara mmadụ iri abụọ anyị na-amụrụ Baịbụl. Kwa ụbọchị, anyị na-anọ n’ụlọ ndị anyị na-amụrụ ihe rie nri ehihie ha nyere anyị. Obi na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ.

O teghị aka, e nye anyị ọrụ ọzọ. E zigara anyị ka anyị bụrụ ndị nlekọta sekit n’ụsọ Oké Osimiri India. Kwa izu, anyị na-aga biri n’ụlọ otu ezinụlọ ma soro ụmụnna ndị nọ n’otu ọgbakọ na-eje ozi ma na-agba ha ume. Anyị na ha na-aghọ otu ezinụlọ. Anyị na ụmụaka ha na anụ ụlọ ha na-anọkwa na-enwe obi ụtọ. Anyị rụrụ ọrụ a afọ abụọ. Afọ abụọ ahụ tọgbukwara anyị atọgbu. A nọkatara alaka ụlọ ọrụ anyị akpọọ anyị. Gịnị ka ha kwuru? Ha sịrị na ha na-achọ ịkpọghachi anyị Betel. M zara ha, sị: “Unu manụ na ebe a anyị nọ dịkwanụ anyị mma n’ahụ́.” Ma, anyị dị njikere ịga ebe ọ bụla e zigara anyị.

ANYỊ LAGHACHIRI BETEL

Na Betel, m rụrụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi. Obi dị m ụtọ na mụ na ọtụtụ ụmụnna ndị maara nke a na-akọ rụkọrọ ọrụ ná ngalaba ahụ. N’oge ahụ, onye nlekọta sekit letachaa ọgbakọ, ọ na-ezigara alaka ụlọ ọrụ ihe ọ chọpụtara n’ọgbakọ ahụ. Ndị na-arụ ná Ngalaba Ije Ozi na-esizi n’ihe ahụ onye nlekọta sekit kwuru zigaziere ọgbakọ ahụ akwụkwọ ozi. A na-eji akwụkwọ ozi ahụ agba ụmụnna ume ma ọ bụ gwa ha ihe a chọrọ ka ha mee. Nke a na-eme ka ndị odeakwụkwọ na-arụ ná ngalaba a nwee ọtụtụ ọrụ ha na-arụ n’ihi na ha na-asụgharị akwụkwọ ozi ndị ahụ ndị nlekọta sekit detara n’asụsụ Kosa, Zulu, na asụsụ ndị ọzọ gaa na Bekee. Ha na-asụgharịkwa ndị nke alaka ụlọ ọrụ ji asụsụ Bekee deere ha n’asụsụ ndị a. Obi dị m ụtọ maka otú ndị na-asụgharị akwụkwọ ozi ndị ahụ si arụsi ọrụ ike. O mere ka m ghọta nsogbu dị iche iche ha na ụmụnna anyị ndị Afrịka na-alụ.

N’oge ahụ, ọchịchị e nwere na Saụt Afrịka na-akwado ịkpa ókè agbụrụ. Agbụrụ nke ọ bụla na-ebi otu ebe. N’ihi ya, ndị si n’otu agbụrụ na ndị si n’agbụrụ ọzọ anaghị emekọta ihe ọnụ. Ụmụnna anyị ndị isi ojii bụ́ ndị Afrịka na-eji asụsụ ha na-ezi ozi ọma, nọrọkwa n’ọgbakọ a na-asụ asụsụ ha.

Amaghị m ọtụtụ ụmụnna anyị ndị isi ojii n’ihi na ebe ọgbakọ anyị na-ezi ozi ọma bụ ebe a na-asụ asụsụ Bekee. Ma ugbu a, amatala m ọtụtụ ụmụnna anyị ndị isi ojii, matakwa omenala ha na otú ha si eme ihe. M matara nsogbu ndị na-abịara ụmụnna anyị n’ihi omenala na nkwenkwe ụgha dị iche iche. O mere ka m mata ụdị obi ike ha nwere iji nwee ike ịnọgide na-efe Jehova n’agbanyeghị nkwenkwe dị iche iche na mkpagbu ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị obodo ha na-akpagbu ha ma ha jụ itinye aka n’ikpere arụsị. N’ime ime obodo, ọtụtụ ndị dara ogbenye. Ọtụtụ agụghị akwụkwọ, ma ha na-akwanyere Baịbụl ùgwù.

Obi dị m ụtọ na m so rụọ ọrụ ụfọdụ gbasara okwu ikpe ụmụnna anyị gbasara ha inwere onwe ha ife Chineke nakwa ịnọpụ iche n’ụwa. Otú ụmụnna anyị ndị na-eto eto si kata obi jụ iso n’ekpere na ịbụ abụ chọọchị nke mere ka a chụọ ha n’ụlọ akwụkwọ mere ka okwukwe m sie ezigbo ike.

O nwekwara nsogbu ndị ọzọ bịaara ụmụnna anyị n’otu obodo dị n’Afrịka aha ya bụ Swaziland. Mgbe Eze Sobhuza nke Abụọ nwụrụ, a gwara mmadụ niile nọ n’obodo ahụ ka ha mee ihe ụfọdụ iji ruo uju. A gwara ndị nwoke ka ha kpụchaa isi ha, gwakwa ndị nwaanyị ka ha kpụtuo isi ha. A kpagburu ọtụtụ ụmụnna anyị n’ihi na ha jụrụ ime ihe ndị a ebe ọ bụ na o nwere ihe jikọrọ ya na ife ndị nna nna ha nwụrụ anwụ. Otú ha si kata obi rube isi n’ihe Jehova kwuru tọrọ anyị ụtọ, meekwa ka okwukwe anyị sie ike. Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’okwukwe ụmụnna anyị ndị Afrịka nwere. O mekwara ka okwukwe anyị sie ike.

M LAGHACHIKWARA N’EBE A NA-EBI AKWỤKWỌ

N’afọ 1981, a họpụtara m ka m soro ná ndị ga-achọpụta otú a ga-esi eji kọmputa na-ebi akwụkwọ. N’ihi ya, m laghachiri ná ngalaba na-ebi akwụkwọ. Oge ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ n’ihi na otú e si ebi akwụkwọ na-agbanwe n’ike n’ike. Otu onye na-ere ihe ndị e ji ebi akwụkwọ nyere alaka ụlọ ọrụ anyị otu ígwè e ji ahazi mkpụrụ akwụkwọ ọgbara ọhụrụ, gwa ha ka ha jiri ya rụtụ ọrụ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Ihe a mere ka anyị jiri ụdị ígwè ọhụrụ ise ndị a dochie ígwè Linotype itoolu anyị nweburu. E tinyekwara ígwè ọhụrụ e ji ebi akwụkwọ. O mekwara ka ọrụ gbapụkwuo ọsọ.

Kọmputa anyị jizi na-arụ ọrụ ugbu a mere ka e wepụta ihe na-eme ka e nwee ike ide asụsụ dị iche iche na kọmputa a kpọrọ MEPS. Nkà na ụzụ emeela ka ọrụ anyị kakwuo mma kemgbe ahụ anyị anọ si alaka ụlọ ọrụ Kanada bịara Saụt Afrịka ịrụ ọrụ. (Aịza. 60:17) Tupu mgbe ahụ, anyị anọ alụọla ụmụ nwaanyị na-asụ ụzọ ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Mụ na Bill ka na-eje ozi na Betel. Ken na Dennis na ndị nwunye ha amụọla ụmụ ugbu a, ha bikwa nso na Betel.

Ọrụ a na-arụ na Betel bịara na-ebukwu ibu. A na-asụgharị akwụkwọ anyị, na-ebipụta ya n’ọtụtụ asụsụ, na-ebugakwa ya n’alaka ụlọ ọrụ anyị ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ bịara dị mkpa ka a rụọ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. A rụrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’ebe mara mma n’ebe ọdịda anyanwụ Johanesbọg, nyefee ya Jehova n’afọ 1987. Obi dị m ụtọ na m so n’ọrụ a, sorokwa na Kọmitii Alaka Saụt Afrịka ruo ọtụtụ afọ.

E NYERE ANYỊ ỌRỤ ỌHỤRỤ ỌZỌ

N’afọ 2001, ọ tụrụ m n’anya nke ukwuu mgbe a gwara m na m ga-esozi na Kọmitii Alaka ọhụrụ e hiwere n’Amerịka. Ọ bụ eziokwu na o wutere anyị na anyị na-aga ịhapụ ọrụ anyị na ndị enyi anyị na Saụt Afrịka, ma obi dịkwa m ụtọ na anyị na-agazi iso n’ezinụlọ Betel dị n’Amerịka.

Ma otu ihe wutere anyị bụ na anyị na-aga ịhapụ nne nwunye m merela agadi. O nweghị oké ihe anyị ga-esili na Niu Yọk meere ya. Ma ụmụnne nwunye m ndị nwaanyị atọ kwetara na ha ga-enye aka na-egboro mama ha mkpa ya. Ha sịrị, “Ebe ọ bụ na anyị agaghị enweli ike ije ozi oge niile, ọ bụrụ na anyị enye aka lekọta mama anyị, ọ ga-eme ka unu nwee ike ịnọgide na-eje ozi unu.” Ihe a ha kwuru tọrọ anyị ezigbo ụtọ.

Otu ihe ahụ ka nwanne m nwoke na nwunye ya bi na Toronto dị na Kanada mere. Ha na-elekọta mama m. N’oge ahụ, mama m ebiela n’ụlọ ha ihe karịrị afọ iri abụọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka otú ha si jiri ịhụnanya na-elekọta ya ruo mgbe ọ nwụrụ obere oge anyị rutere Niu Yọk. N’eziokwu, ọ bụ ngọzi Jehova na anyị nwere ezinụlọ dị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ ka ha nwee ike nye aka lekọta nne na nna anyị merela agadi n’agbanyeghị na o nwere ike isiri ha ike mgbe ụfọdụ.

Ebe mbụ m rụrụ n’Amerịka bụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ. Nkà na ụzụ emeekwala ka ọrụ a dị ezigbo mfe. Ugbu a, m na-arụ ná Ngalaba Na-azụ Ihe na Betel. Obi dị m ezigbo ụtọ na arụọla m ọrụ ihe karịrị afọ iri abụọ n’alaka ụlọ ọrụ a buru ezigbo ibu nke nweziri ihe karịrị puku ndị Betel ise na puku mmadụ abụọ na-esi esi abịa ọrụ na Betel.

Onye gwa m afọ iri isii gara aga na m ga-anọ ebe a, agaghị m ekwe. Nwunye m na-akwado m kemgbe afọ ndị a. Ndụ a atọọla anyị ezigbo ụtọ. Obi dịkwa anyị ụtọ maka ọrụ dị iche iche anyị rụrụ, ụmụnna ndị anyị na ha rụkọrọ ọrụ, nakwa alaka ụlọ ọrụ ndị e zigara anyị ka anyị gaa rụọ ọrụ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ugbu a m gaferela afọ iri asatọ, ọrụ ndị m na-arụ ebelatala n’ihi na e nwere ọtụtụ ụmụnna na-eto eto ahụ́ gbasiri ike na-arụ ọrụ ndị ahụ.

Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Mba nke Jehova bụ Chi ya na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 33:12) Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Obi dị m ezigbo ụtọ na m so ndị Chineke na-enwe obi ụtọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya