Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 62
  • Olee Otú Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-adị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-adị?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee ihe ndị a na-eme n’agbamakwụkwọ ha?
  • Ebee ka Ndịàmà Jehova na-anọ agba akwụkwọ?
  • Ònye nwere ike ịbịa?
  • È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?
  • À na-enye onyinye?
  • Hà na-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọ ọfọ ndụ na ahụ́ ike?
  • Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́?
  • À ga-enye ndị mmadụ nri na mmanya?
  • À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?
  • Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ha?
  • Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Agbamakwụkwọ Ndị Dị Ùgwù n’Anya Chineke Na Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-asọpụrụ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 62
Ebe nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, nke nwoke na-agbanye nke nwaanyị mgbaaka.

Olee Otú Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-adị?

Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova na-abụkarị ememme dị mfe, a haziri nke ọma. A na-ekwukarịkwa okwu dị nkenke si na Baịbụl. E nwekwara ike inwe oriri na ọṅụṅụ.a Jizọs gara ụdị oriri agbamakwụkwọ ahụ n’obodo Kena ná mmalite ozi ya n’ụwa.​—Jọn 2:​1-11.

  • Olee ihe ndị a na-eme n’agbamakwụkwọ ha?

  • Ebee ka Ndịàmà Jehova na-anọ agba akwụkwọ?

  • Ònye nwere ike ịbịa?

  • È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?

  • À na-enye onyinye?

  • Hà na-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọ ọfọ ndụ na ahụ́ ike?

  • Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́?

  • À ga-enye ndị mmadụ nri na mmanya?

  • À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?

  • Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ha?

Olee ihe ndị a na-eme n’agbamakwụkwọ ha?

Ihe bụ́ isi a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ okwu agbamakwụkwọ nke onye ozi Chineke, bụ́ Onyeàmà Jehova, na-ekwu. Okwu ahụ na-ewe ihe dị ka nkeji iri atọ. A ga-ekwu okwu ga-agba ume nke ga-enyere ndị ahụ chọrọ ịlụ aka ịhụ otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka ịna-ahụ ibe ha n’anya, ịna-enwe obi ụtọ, nakwa inyere ha aka ka alụmdi na nwunye dịtee aka.​—Ndị Efesọs 5:33.

N’ọtụtụ mba, gọọmenti na-ekwe ka ọ bụrụ onye ozi Chineke, bụ́ Onyeàmà Jehova, ga-ejikọ mmadụ abụọ chọrọ ịlụ. Ya bụrụ otú ahụ, e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ ahụ si na Baịbụl, mmadụ abụọ ahụ chọrọ ịlụ ekwezie ibe ha nkwa. Ha nwedịrị ike inye ibe ha mgbaaka. Onye ahụ kwuru okwu agbamakwụkwọ ga-ekwuzi na ha abụrụla di na nwunye.

Ná mba ụfọdụ, iwu ha bụ na nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ ga-abịa n’ụlọ ọrụ gọọmenti ka a nọrọ ebe ahụ jikọọ ha. Ndị ahụ chọrọ ịlụ ga-eme ya obere oge tupu e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ ekweghị ibe ha nkwa mgbe ahụ ha gara n’ụlọ ọrụ gọọmenti, ha nwere ike ime ya ma e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha mere ya, ha nwere ike kwughachi ya ọzọ, ma ha ga-ekwu ya otú ga-egosi na ha ekwubuola ya. A ga-eji ekpere mechie agbamakwụkwọ ahụ ma rịọ Chineke ka ọ gọzie di na nwunye ahụ.

Ebee ka Ndịàmà Jehova na-anọ agba akwụkwọ?

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.b Ọ bụrụ na ndị ahụ gbara akwụkwọ ga-achọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ha ga-achọrọ ebe ọzọ a ga-anọ mee ya.

Ebe nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu Onyeàmà Jehova bụ́ onyeozi Chineke na-ekwuru ha okwu agbamakwụkwọ si na Baịbụl.

Ònye nwere ike ịbịa?

Ọ bụrụ na agbamakwụkwọ ahụ ga-abụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma Ndịàmà Jehova ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịbịa. Ya bụrụkwa na di na nwunye ahụ chọrọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ọ bụ ha ga-ekpebi ndị ha ga-akpọ.

È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?

A gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, e nweghị otu ụdị uwe a chọrọ ka mmadụ niile yiri. Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ime ihe Baịbụl kwuru ma na-eyi uwe dị mma n’anya nakwa nke gosiri na ha na-akwanyere ihe a bịara ime ùgwù. Ọ na-atọkwa ha ụtọ ma ndị ọzọ bịara agbamakwụkwọ mee otú ahụ. (1 Timoti 2:9) Otu ihe ahụ ka a chọkwara ma ọ bụrụ na a ga-enwe oriri na ọṅụṅụ.

À na-enye onyinye?

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-emesapụ aka. (Abụ Ọma 37:21) Ọ na-atọkwa Ndịàmà Jehova ụtọ inye ndị mmadụ ihe nakwa ma e nye ha onyinye n’agbamakwụkwọ ha. (Luk 6:38) Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa ndị mmadụ nye ha onyinye, ma ọ bụkwanụ kpọọ aha ndị nyere onyinye. (Matiu 6:​3, 4; 2 Ndị Kọrịnt 9:7; 1 Pita 3:8) Baịbụl kwuru na ụdị ihe ahụ adịghị mma. O nwekwara ike ime ka ihere mewe ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ.

Hà na-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọ ọfọ ndụ na ahụ́ ike?

Mba. Ndịàmà Jehova anaghị agọ ọfọ, n’ihi na ịgọ ọfọ sitere n’okpukpe ụgha.c Ndịàmà Jehova na-esi n’ụzọ ndị ọzọ agwa ndị gbara akwụkwọ na ha chọrọ ka ihe dịrị ha ná mma, ọ bụghị ịkụkọta iko mmanya na-agọrọ ha ọfọ.

Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́?

Mba. N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́. Ha kweere na ọ ga-ewetara di na nwunye ahụ ihu ọma, obi ụtọ, na ogologo ndụ. Ma Ndịàmà Jehova anaghị eme ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na ikwere ihe na-abụghị eziokwu. Nke a pụtara na ha anaghị agọ ọfọ ka ihu ọma kpọ mmadụ n’ihi na Baịbụl akwadoghị ime ya.​—Aịzaya 65:11.

À ga-enye ndị mmadụ nri na mmanya?

A naghị anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eri ihe oriri ma ọ bụ ṅụọ mmanya ma a gbawa akwụkwọ ebe ahụ. Ụfọdụ ndị na-eme, ha gbachaa akwụkwọ, ha enwee nnọkọ, nye ndị mmadụ nri ma ọ bụ ihe e ji emegharị ọnụ. (Ekliziastis 9:7) Ọ bụrụ na ha ekpebie iweta mmanya na-aba n’anya, ha ga-eweta ya obere, hụkwa na ọ bụ naanị ndị toruru ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka a ga-enye ya.​—Luk 21:34; Ndị Rom 13:​1, 13.

À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?

Ọ bụrụ na ndị ahụ gbara akwụkwọ kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ, ha nwere ike ịkụ egwú ma gbaakwa egwú. (Ekliziastis 3:4) Ụdị egwú a ga-akụ ga-abụ ụdị egwú na-amasị ha nakwa egwú na-atọ ndị ebe ha ụtọ, ma o kwesịrị ịbụ egwú dị mma, nke na-agaghị akpasukwa ndị bịaranụ iwe. A gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-akpọkarị egwú ndị isiokwu ha si n’Akwụkwọ Nsọ.

Ebe ndị gbara akwụkwọ na-agba egwú mgbe ha na-eme oriri agbamakwụkwọ. Ụfọdụ ndị ha kpọrọ oriri sokwa na-agba egwú.

Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ha?

Baịbụl ekwughị na ọ dị mma ka a na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ, o kwughịkwanụ na ọ dị njọ ime ya. Ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ma hà ga-eme ya ma ọ bụ na ha agaghị eme ya. Ọ bụrụ na ha ekpebie ime ya, ha nwere ike ime ya naanị ha ma ọ bụkwanụ ha akpọọ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha.

a Omenala obodo, otú ndị mmadụ si eme ihe, na ihe iwu obodo kwuru nwere ike ime ka otú e si eme agbamakwụkwọ n’otu ebe dị iche n’otú e si eme ya n’ebe ọzọ.

b A naghị akwụ onye ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ ụgwọ ọ bụla, a naghị akwụkwa ụgwọ maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.

c Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara otú o si bụrụ na iweli iko mmanya, kụkọta ya ọnụ iji gọọrọ mmadụ ọfọ ndụ na ahụ́ ike si n’omenala ndị na-ekpere arụsị, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2007.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya