Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere Chineke Ji Ekwe Ka Ihe Ọjọọ Na-eme?
LIDIJA bụ nanị onye nọ n’afọ iri na ụma mgbe agha tiwapụrụ n’ala a mụrụ ya—mba a ma na mbụ dị ka Yugoslavia. “Anọrọ m ọtụtụ ehihie na abalị n’ụlọ gbara ọchịchịrị,” ka ọ na-echeta. “Ọtụtụ mgbe ọ dị m ka m gbapụ n’èzí, ọbụna ọ bụrụ na ọ ga-apụta igbu m! Tupu agha amalite, i nwere ihe nile ị chọrọ, ma ugbu a obi dị gị ụtọ nanị na ị dị ndụ.”
N’oge na-adịghị anya, nchekasị na ndọlị nke agha nwere mmetụta ọjọọ n’ọnọdụ ime mmụọ Lidija. Ọ na-asị: “Anyị apụghị ịga ọrụ nkwusa ma ọ bụ ịga nzukọ ruo ọtụtụ izu. Echere m n’ezie na Jehova na-eleghara anyị anya. M na-ajụ onwe m sị, ‘Gịnị mere na ọ dịghị enyere anyị aka ugbu a?’”
Agha, mpụ, ime ihe ike, ọrịa, ọdachi, ihe mberede—ihe ọjọọ dị ka ndị a pụrụ ime ọbụna ndị na-eto eto. Mgbe ọdachi darutekwara nso ụlọ, ị pụrụ ịjụ dị ka o kwesịrị sị, ‘Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ihe ọjọọ ndị a na-eme?’
Ndị ikom Chineke n’oge ndị gara aga jụrụ ajụjụ ndị dị ka nke ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe onye amụma bụ́ Habakuk hụrụ ọnọdụ rụrụ arụ nke dịrịị n’etiti ndị Chineke, ọ kwara arịrị, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ? m na-etiku Gị mkpu, sị, Ihe ike! ma Ị dịghị azọpụta. N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? n’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu?” (Habakuk 1:2, 3) Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-ata ahụhụ mmetụta uche yiri nke ahụ taa.
Tụlee otú ọ dị otu onye Kraịst na-eto eto mgbe ọnwụ mberede nke nna ya gasịrị. Ọ na-asị: “Isi gbagharịrị m, m sikwa na window na-eti mkpu, na-etikwasị Jehova Chineke mkpu. . . . M tara ya ụta maka ihe nile. Olee otú nke a pụrụ isi mee? Papa m bụ ezigbo nna na di na-ahụ n’anya, ugbu a kwa nke a emee—Jehova ọ́ dịghị enwe nchegbu?” N’ọnọdụ dị ka nke a, ọ bụ nanị ihe dị ka o kwesịrị ịnọtụ ná mgbagwoju anya, mwute, ma ọ bụ ọbụna iwe. Cheta, onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Habakuk nwekwara nchegbu na e kwere ka ihe ọjọọ dịrị. Ka o sina dị, ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-enwe mmetụta dị ilu, ihe ize ndụ dị. Ọ pụrụ inwe ‘obi dị ọkụ megide Jehova.’—Ilu 19:3.
Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi zere ịdaba n’echiche nke obi dị ọkụ na ọnụma? Mbụ, ị ghaghị ịghọta ebe ihe ọjọọ si abịa.
Ihe Ọjọọ Esighị n’Ebe Chineke Nọ Abịa
Bible na-eme ka o doo anya na ọ dịghị mgbe Chineke bu n’obi ka anyị na-ata ahụhụ otú a. O debere di na nwunye mbụ n’ebe obibi paradaịs nke ihe mgbu na ahụhụ na-adịghị na ya. (Jenesis 1:28) Obi abụọ adịghị ya na ị maara nke ọma otú ihe siri gahie: Otu mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya, onye e mesịrị mara dị ka Ekwensu na Setan, dubara Adam na Iv n’inupụrụ Chineke isi. (Jenesis, isi nke 3; Mkpughe 12:9) Site n’ime nke a, Adam mara ụmụ ya nile ikpe gaa ná mmehie na mmetụta ọjọọ ya nile.—Ndị Rom 5:12.
N’ụzọ doro anya, ọ bụghị Chineke tụkwasịrị ihe a kpọrọ mmadụ ihe ọjọọ, kama ọ bụ mmadụ n’onwe ya. (Deuterọnọmi 32:5; Eklisiastis 7:29) N’ezie, ajọ ihe nile ndị mmadụ na-ata ahụhụ ha taa—ọrịa, ọnwụ, agha, ikpe na-ezighị ezi—sitere n’omume nnupụisi Adam kpachara anya mee. Ọzọkwa, anyị nile nọ n’okpuru ihe Bible na-akpọ “mgbe na ihe ndapụta.” (Eklisiastis 9:11) Ma ndị ajọ omume ma ndị ezi omume na-adaba n’ajọ ihe ọghọm na ọdachi dị iche iche.
Nkwere Chineke Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịrị
Ọ bụ ezie na ọ na-akasi obi ịmara na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ, ị ka pụrụ ịjụ sị, ‘Gịnị mere o ji kwere ka ihe ọjọọ dịgide?’ Ọzọ, nke a na-alaghachi azụ n’ihe iseokwu ndị e welitere n’Iden. Chineke gwara Adam na ọ bụrụ na o nupụ isi, ọ ga-anwụ. (Jenesis 2:17) Otú ọ dị, Ekwensu gwara Iv na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ a machibidoro iwu, ọ gaghị anwụ! (Jenesis 3:1-5) Ya bụ, Setan kpọrọ Chineke onye ụgha. Ọzọkwa, Setan na-atụ aro na mmadụ ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ma ọ na-eme mkpebi nke aka ya, n’enweghị Chineke ịgwa ya ihe ọ ga-eme!
Chineke apụghị ileghara ebubo ndị a anya. Ị̀ hụtụwo ka nwa klas ibe gị mara ikike onye nkụzi aka? Ọ bụrụ na onye nkụzi ahụ na-agbachi ya nkịtị, ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ na-amalite ịkpa àgwà nnupụisi n’otu aka ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọgba aghara eluigwe na ala gaara etiwapụwo ma a sị na Jehova emeghị ihe banyere ihe ịma aka Setan. Jehova mere nke ahụ site n’inye mmadụ ohere ịgbaso ụzọ Setan si eme ihe. Mmadụ ọ̀ nọwo na-anụ ụtọ nnwere onwe nke onye bụ chi nke Setan kwere ná nkwa? Ee e. Ịchịisi Setan ewetawo mbibi na nhụjuanya, na-anwapụta na ọ bụ onye ụgha arụrụala!
Chineke ọ̀ ga-ekwe ka ihe ọjọọ gaa n’ihu ruo mgbe ebighị ebi? Ee e. Iji dozie ihe iseokwu ndị Setan welitere, Chineke ga-eweta ihe ọjọọ nile ná njedebe n’isi nso. (Abụ Ọma 37:10) Ma ka ọ dị ugbu a, olee otú anyị ga-esi nagide?
Otu Ihe Iseokwu nke Na-emetụta Gị
Buru ụzọ ghọta na ihe iseokwu a dị n’etiti Chineke na Setan na-emetụta gị! Ò si aṅaa dị otú ahụ? Tụlee akwụkwọ Bible ahụ a kpọkwasịrị aha onye ezi omume ahụ bụ́ Job. Mgbe Chineke zoro aka n’ebe Job nọ dị ka ihe atụ nke onye ofufe kwesịrị ntụkwasị obi, Setan zaghachiri, sị: “Job ọ̀ ga-efe gị ofufe ma ọ bụrụ na o nwetaghị ihe ọ bụla na ya?” (Job 1:9, Today’s English Version) N’ezie, Setan rụrụ ụka na ọ bụrụ na e nye ya ohere iji nrụgide mee ihe, na ya pụrụ ichigharị mmadụ ọ bụla pụọ n’ijere Chineke ozi!—Job 2:4, 5.
N’ihi ya Setan ekwutọwo ndị nile na-atụ egwu Chineke. O kwutọwo gị. Ma, Ilu 27:11 na-asị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Ee, mgbe ị na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-egbu mgbu, ị na-enye aka n’ezie n’igosipụta na Setan bụ onye ụgha!
N’ikwu eziokwu, mgbe ihe ọjọọ na-eche mmadụ ihu, ọ dịghị mfe iche banyere ihe iseokwu ndị ọ na-agụnye. Diane, bụ́ onye dị nanị afọ iri mgbe nne ya nwụrụ, na-asị: “Atụrụ m egwu na obi ga-akpọ m nkụ ma ọ bụ m jupụta n’iwe n’ihi ule ndị dị ná ndụ m.” Ma, ịmata ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị enyeworo ya aka inweta echiche ziri ezi banyere nsogbu ya. Ọ na-ekwu ugbu a, sị: “Ọ bụ ezie na e nwere ihe ndị siri ike ịnagide ná ndụ m, aka Jehova na-adịkwasị m mgbe nile.”
Diane na-echetara anyị otu eziokwu dị oké mkpa: Jehova adịghị atụ anya na anyị ga-anagide nrụgide ndị a n’ike anyị nanị. Abụ Ọma 55:22 na-emesi anyị obi ike, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” Kotoyo na-eto eto chọpụtara na nke a bụ eziokwu. O chere ọdachi ihu mgbe nne na nna ya nwụrụ n’ala ọma jijiji 1995 ahụ dakwasịrị Kobe, Japan. N’ikwuchite ọnụ ya na nke ụmụnne ya ndị ọ tọrọ, ọ na-asị: “Ebe ọ bụ na nne m kụziiri anyị ịdabere na Jehova, anyị pụrụ ịtachi obi.”
Gịnị banyere Lidija, nwa agbọghọ na-eto eto a kpọtụrụ aha ya ná mmalite? Ka oge na-aga, ọ ghọtara na Jehova agbahapụbeghị ya ma ọlị. Ọ na-ekwu ugbu a, sị: “Jehova nọ ya mgbe nile maka anyị. O buteere anyị ụzọ ma duzie nzọụkwụ anyị.”
Jehova—Chineke Ịhụnanya nke Na-enye Nlekọta
Gị onwe gị pụkwara inweta enyemaka site n’aka Chineke mgbe ihe ọjọọ mere gị. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova na-eche banyere gị! Ọ bụkwa ezie na ọ na-ekwe ka ihe ọjọọ mee ezi ndị mmadụ, ọ na-enyekwa nkasi obi ịhụnanya. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Otu ụzọ o si eme nke ahụ bụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ebe ahụ ị pụrụ ịhụ ‘ndị enyi na-arapara n’ahụ karịa nwanne,’ bụ́ ndị pụrụ ime ka i nwee ume mgbe ọgba aghara tiwapụrụ. (Ilu 18:24) Kotoyo na-echeta, sị: “Malite n’ụbọchị mbụ mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, anyị gara n’ebe ụmụnna zukọrọ, anyị natakwara agbamume na ihe ndị dị mkpa. Nke ahụ mere ka m nwee echiche ịnọ ná nchebe. Ebe ọ bụ na anyị nwere Jehova na ụmụnna, m chere na anyị pụrụ idi ihe nile.”
N’ihi na Jehova matara gị dị ka otu onye, ọ pụkwara igbo mkpa gị mgbe ihe ọjọọ mere. Daniel na-atụgharị uche n’ụzọ o siworo nagide ọnwụ nna ya, na-asị: “Jehova na-aghọrọ gị nna, nzukọ ya na-enyekwa ndị ikom ime mmụọ dị ka ndị a ga na-eṅomi. Jehova na-aza ajụjụ ndị m nwere, bụ́ ndị m gaara esoro papa m kwurịta dị ka o kwesịrị.” Diane enwetawo nlekọta ịhụnanya Jehova n’otu aka ahụ eri ọnwụ nne ya. Ọ na-ekwu, sị: “Site n’aka ndị meworo okenye karị na ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị nyeworo agbamume, nduzi, na ndụmọdụ, o duziwo m ma nyere m aka ịnagide nkụda aka ọ bụla.”
N’ezie, ọ dịghị mgbe inwe ahụmahụ ihe ọjọọ dị ụtọ. Ma nwee nkasi obi n’ịmara ihe mere Chineke jiri kwere ka ihe ndị dị otú ahụ dịrị. Na-echetara onwe gị mgbe nile na Chineke ga-edozi nsogbu ahụ n’isi nso. Leenụ, a ga-emesịa hichapụ ihe àmà nile nke ihe ọjọọ ndị meworo anyị! (Aịsaịa 65:17; 1 Jọn 3:8) Site n’iji ndokwa nile Chineke na-eme iji nyere anyị aka ịnagide eme ihe bara uru, ị pụrụ ime òkè gị n’igosi na Setan bụ onye ụgha. Mgbe oge na-aga, ‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya gị.’—Mkpughe 21:3, 4.
[Foto ndị dị na peeji nke 11]
N’isi nso Jehova ga-eweta ihe ọjọọ nile ná njedebe