Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 5/8 p. 3
  • Ogbugbu n’Aha Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ogbugbu n’Aha Chineke
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Anaghị Alụ Agha n’Agbanyeghị na Ndị Izrel Oge Ochie Lụrụ Agha?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Otú Chineke Si Lee Ịlụ Agha Anya n’Oge Ochie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Olee Okpukpe Chineke Kwadoro?
    Teta!—1997
  • Gịnị Ka Ị Ga-agwa Onye Alakụba?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 5/8 p. 3

Ogbugbu n’Aha Chineke

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA FRANCE

“N’aha Chineke, Anyị Na-egbu, Ga-anọgidekwa Na-egbu”

N’OKPURU isi akụkọ ahụ e hotara n’elu, akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune kwuru, sị: “Narị afọ a, nke ndị na-enwe nchekwube mgbe ụfọdụ nwere mmasị iwere dị ka nke maara ihe, abụrụwo nke omume na-atụ ụjọ nke ndị mmadụ igburịta onwe ha n’aha Chineke kara akara dịkwa ka nke ọ bụla bu ya ụzọ.”

Onye edemede ahụ zoro aka ná mgbukpọ okpukpe n’ime narị afọ ndị mbụ. Mgbe ahụ, n’ikwu banyere mgbukpọ nke weere ọnọdụ na narị afọ nke 20, o kwubiri, sị: “Ihe anyị na-ahụ bụ ndịgide na-atụ ụjọ nke ekweghị ibe nọrọ obi ịta mmiri nke ọgbọ ndị gara aga. Ihe omume okpukpe nọgidere na-abụ ihe ngọpụ maka ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ibu agha ókèala.”

Ụfọdụ na-agbalị ịgọpụ agha okpukpe nke taa site n’ikwu na Chineke kwadoro ogbugbu nke ndị Israel oge ochie gburu ndị Kenean. Ma, nke ahụ abụghị ihe ọ ga-eji zie ezi ka ndị sị na ha bụ ndị Kraịst na-ebu agha taa. N’ihi gịnị? N’ihi na Chineke gwara ndị Israel kpọmkwem ime ihe dị ka ndị na-emezu ikpe ezi omume ya megide ndị na-efe ndị mmụọ ọjọọ, ndị ofufe ha gụnyere ajọ mmekọahụ rụrụ arụ na iji ụmụaka achụ àjà.—Deuterọnọmi 7:1-5; 2 Ihe Emere 28:3.

Ihe àmà nke gosiri na agha ndị Israel oge ochie lụrụ abụghị ọgụ nkịtị bụ ọdịdị ọrụ ebube nke mmeri ndị Chineke nyere mba ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ dị mgbe a gwara ndị Israel oge ochie iji opi, ite, na ọwa mee ihe—o doro anya na ha abụghị ihe ndị e jikarị ebu agha! N’oge ọzọ e doro ndị na-abụ abụ n’ihu usuu ndị agha Israel bụ́ ndị na-eche oké ìgwè bara ụba nke usuu ndị agha mwakpo si ọtụtụ mba ihu.—Ndị Ikpe 7:17-22; 2 Ihe Emere 20:10-26.

Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ, mgbe ndị Israel lụrụ agha ndị Chineke na-akwadoghị, ọ gọzighị ha, e merikwara ha. (Deuterọnọmi 28:15, 25; Ndị Ikpe 2:11-14; 1 Samuel 4:1-3, 10, 11) Ya mere, a pụghị izo aka n’agha ndị Israel lụrụ iji gọpụ agha ndị a na-alụ na Krisendọm.

N’aha okpukpe, ndị Hindu alụsowo ndị Alakụba na ndị Sikh agha; ndị Alakụba Shiite alụsowo ndị Alakụba Sunni agha; na Sri Lanka kwa, ndị Buddha na ndị Hindu egburịtawo onwe ha.

Ihe atụ pụtara ìhè nke ogbugbu n’aha Chineke bụ́ agha ndị weere ọnọdụ na France n’ime narị afọ nke 16. Akụkọ agha ndị a mejupụtara ihe omume ndị a kasị wụfuo ọbara na ha n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe Roman Katọlik na ndị Protestant na Europe. Ka anyị nyochaa agha ndị a ma lee ihe anyị pụrụ ịmụta site na ha.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

U.S. Army photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya