Ọnwụ Ojii Abụghị Ọgwụgwụ Ụwa
N’OCTOBER nke 1347, ụgbọ mmiri ndị ahịa sitere n’Ọwụwa Anyanwụ banyere n’ọdụ ụgbọ mmiri nke Messina, dị na Sicily. N’ụmara ụgbọ, e nwere ndị ikom bu ọrịa, na-anwụkwa anwụ. N’ahụ ha e nwere etuto ndị dị ojii, ha ka àkwá, na-agbapụta ọbara na abụ. Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ nwere oké ahụ mgbu ma nwụọ n’ime ụbọchị ụfọdụ mgbe ihe mgbaàmà ndị mbụ pụtasịrị.
Òké ndị sitere n’ụgbọ ahụ ji ọsọ sonyere òké ndị nọ n’ógbè ahụ. Òké ndị ahụ bu akpịrị bu nje bacillus nke na-egbu mmadụ. Otú a ka ntiwapụ ọrịa ahụ a maara dị ka ihe otiti, bụ́ Ọnwụ Ojii si gbasaa, ọrịa na-efe efe kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke Europe rute oge ahụ.
Ihe otiti ahụ bịara n’ụdị abụọ. Otu ụdị, nke a na-ebufe site n’ọtịta nke akpịrị bu nje, na-agbasa n’ime ọbara, na-akpatakwa etuto na ọbara ịgba n’ime ahụ. Nke ọzọ, nke a na-ebufe ndị ọzọ site n’ụkwara ma ọ bụ uzere, na-emetụta akpa ume. N’ihi na e nwere ụdị abụọ a, ọrịa ahụ gbasara ngwa ngwa na n’ụzọ dị oké egwu. Nanị n’afọ atọ, o gburu otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị Europe; ikekwe nde mmadụ 25 nwụrụ.
Mgbe ahụ ọ dịghị onye maara otú ọrịa ahụ si esi n’otu onye agafe n’onye ọzọ. Ụfọdụ kwetara na nsí dị n’ikuku, eleghị anya n’ihi ala ọma jijiji ma ọ bụ ịkwụ n’usoro nke mbara ụwa nke na-adịghị emekarị. Ndị ọzọ chere na ndị mmadụ na-ada ọrịa nanị site n’ile onye bu ọrịa anya. Ọ bụ ezie na echiche dịgasị iche iche, o doro anya na ọrịa ahụ na-efe efe nke ukwuu. Otu dibịa bụ́ onye France kwuru na o yiri ka otu onye ọrịa “pụrụ ibufe ụwa dum ọrịa.”
Ndị mmadụ amaghị mgbochi na ọgwụgwọ ọ bụla. Ọtụtụ tụgharịrị uche n’amụma Bible ndị dị ka nke ahụ e dekọrọ na Luk 21:11, nke buru amụma ọrịa na-efe efe n’oge ọgwụgwụ. Ọ bụ ezie na ego nọ na-abata na chọọchị, ihe otiti ahụ gara n’ihu. Otu onye Itali dere n’oge ahụ, sị: “Mgbịrịgba akụghị, ọ dịghịkwa onye bere ákwá n’agbanyeghị ihe funahụrụ ya n’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile tụrụ anya ọnwụ . . . ndị mmadụ kwuru ma kwere, ‘Nke a bụ ọgwụgwụ ụwa.’”
Otú ọ dị, ọ bụghị ọgwụgwụ ya. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 14, ihe otiti ahụ akwụsịla. Ụwa dịgidere.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 17]
Archive Photos